Agwaetiti Nile Dị n’Oké Osimiri India Anụ Ozi Ọma
DỊ KA ndị e doro n’ụzọ gbara ngọ n’ebe dị nso na Madagascar, na ndị gbasapụrụ na 3.9 nde square kilomita n’ebe ọdịda anyanwụ Oké Osimiri India, e nwere agwaetiti nke Rodrigues, Mauritius, Réunion, Seychelles, Mayotte, na Comoros. Ọ bụ ezie na ha kpuchiri elu mmiri dị ukwuu, agwaetiti ndị a nwere ngụkọta nke 7,300 square kilomita n’obosara ala. N’inwe ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ dị 2.3 nde, ha so n’agwaetiti ndị nwekarịsịrị ọnụ ọgụgụ ndị bi na ha n’ụwa.
Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ndị a gụnyere ihe ruru 2,900 Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke nye ndị bi n’agwaetiti ahụ. Ebe ọ bụ na ha nọpụrụ iche, Ndịàmà ndị a na-enwe obi ekele karịsịa ná nleta nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na mgbakọ a na-enwe kwa afọ nke alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Vacoas, Mauritius, na-ahazi. Ndị a bụ oge mgbe ha pụrụ n’ezie inwe obi ụtọ n’ihe okwu Aịsaịa 42:10 pụtara: “Bukuonụ Jehova abụ ọhụrụ, kwusaanụ otuto ya site ná nsọtụ ụwa; unu ndị na-arịda n’oké osimiri, na ùjú ya, agwaetiti nile, na ndị bi ha.”
Na nso nso a, ndị nnọchianya si n’alaka ụlọ ọrụ ahụ jere agwaetiti ndị ahụ ije leta ọgbakọ dị iche iche na inwe usoro nke mgbakọ otu ụbọchị pụrụ iche a na-eme kwa afọ, bụ́ nke nwere isiokwu bụ́ “Ghọọkwanụ Ndị Dị Nsọ n’Ibi Obi Unu Nile,” nke dabeere na 1 Pita 1:15. Iji gazuo mbara nke oké osimiri ahụ, njem na-abụkarị site n’ụgbọ elu—mgbe ụfọdụ n’ụgbọ elu jet ọgbara ọhụrụ ma mgbe mgbe ná ntakịrị ụgbọ elu nwere ihe na-akwali ya. E jikwa ụgbọ mmiri dị iche iche na ntakịrị ụgbọ epeepe mee ihe. Bịa soro anyị, ma hụ otú agwaetiti ndị ahụ dịpụrụ n’Oké Osimiri India si na-anụ ozi ọma!
Nkwụsị Mbụ—Rodrigues
Mgbe anyị mesịrị njem ụgbọ elu ruru otu hour na ọkara site na Mauritius, anyị hụrụ nkwakọba nke ájá mmiri. Ọ dị n’akụkụ nke nnukwu ọdọ mmiri nke gbara otu obosara ala dị n’Oké Osimiri India gburugburu. Nke a bụ ebe mbụ anyị kwụsịrị, agwaetiti nke Rodrigues.
E wuru ọdụ ụgbọ elu ahụ n’elu ala gbapụtara na mmiri, nke a kpọrọ Point Coraille. N’akụkụ ebe a ájá mmiri ahụ rọrọ arọ nke na a pụrụ ịkpọwa ya n’ụdị blọkụ iji ya eme ihe n’ịrụ ụlọ. Otu obere bọs bufere anyị n’ụzọ dị warara, nke ikuku na-efekarị, site n’ọdụ ụgbọ elu ahụ gaa n’obodo bụ isi nke Port Mathurin. N’otu ebe, anyị pụrụ ilepụ anya n’ofe nke agwaetiti ahụ gaa ná nkwakọba nke ájá mmiri ndị dipụrụ adịpụ, ọdọ mmiri na-acha anụnụ anụnụ, nakwa akụkụ mmiri jupụtara n’oké nkume. Ebe oge mmiri ozuzo ka gwụsịrị, ebe ugwu ya dị iche iche jupụtara n’ahịhịa ndị kpọrọ nkụ na-amịrị mmiri, a na-ahụkwa ehi, atụrụ, na ewu ole na ole na-ata ahịhịa.
Otu obere Ụlọ Nzụkọ Alaeze dị ọcha nke dị n’etiti Port Mathurin bụ ebe anyị ga-enwe mgbakọ otu ụbọchị pụrụ iche. Ọrụ ahụ a na-arụ na Rodrigues mepere na mbụ na 1964. Ugbu a, n’etiti ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ dị 37,000, e nwere 36 ndị nkwusa nke ozi ọma nke a. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ 53 mmadụ ndị bịaranụ na ka otu nwa okorobịa dị afọ 18 mere baptism. Nne ya, ọ bụ ezie na ọ maghị agụ ma ọ bụ ede, naara eziokwu ahụ na 1969, ọ nọgidewokwa na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị mmegide ezinụlọ. Ugbu a abụọ n’ime ụmụ ya ararawo onwe ha nye Jehova.
Mgbe e nwesịrị mgbakọ ahụ, anyị ji otu izu mee nkwusa n’agwaetiti ahụ. Anyị na-asụ asụsụ Mauritian Creole anyị, ebe ọ bụ asụsụ a na-asụkwa na Rodrigues. Ịgba bọs na ije ije wegara anyị n’ókèala anyị—ndagwurugwu jupụtara n’ahịhịa ndụ site n’ụzọ dị n’ugwu gaa n’osimiri. Lee ka nke a si bụrụ ihe dị mma ile anya—ọdọ mmiri nwere ngwakọta ọcha nke akwụkwọ ndụ na anụnụ anụnụ, ájá mmiri na-acha ụcha, nakwa oké osimiri miri emi nke na-acha anụnụ anụnụ dị n’ebe azụ! N’ịbụ ndị a kpaliri site n’ikuku ndụ nke a na-emetọbeghị, anyị dị njikere ịla.
Anyị sooro obere ụzọ ọwara gabigara n’ubi ahịhịa ma gafe otu iyi na-emighị emi ugboro ole na ole iji ruo ọtụtụ ụlọ obibi nta dị n’ime ndagwurugwu ahụ. A nabatara anyị nke ọma n’ụlọ ọ bụla, anyị nwekwara ike ịgwa ndị nwe ụlọ okwu banyere ngọzi nile nke Alaeze ga-abịa n’isi nso. N’oge na-adịghị anya, anyị agbadala ebe dị anya na ndagwurugwu ahụ, oge eruwokwa mgbe anyị ga-eji alaghachi ebe obibi anyị. Nke a pụtara ịrị elu ọzọ na ọtụtụ hour nke ije ije, ma ile ọbịa nke ndị obodo ahụ nyeere anyị aka—a kwọpụrụ anyị n’azụ ụgbọ ala jeep.
Mgbe anyị mesịrị mkpapụ ahụ na-agwụ ike, anyị nwere ọṅụ ịlọghachi n’ebe na-emezi ahụ nke Ebe Obibi Betel mara mma dị na Vacoas. A haziri inwe mgbakọ ụbọchi abụọ n’Ụlọ Nzụkọ Obodo. N’ụbọchi mbụ, 760 mmadụ bịara. Ha si n’ime ọkara nke 12 ọgbakọ dị n’agwaetiti ahụ. N’ụbọchị na-esonụ, anyị sooro 786 mmadụ ndị sitere n’ọgbakọ isii ndị ọzọ nwee otu ụdị usoro ihe omume ahụ. Ná ngwụsị izu, e mere ndị ọhụrụ anọ baptism. E nwere 30 ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na 50 ndị ọsụ ụzọ oge nile bụ́ ndị na-ekere òkè n’iwetara ndị bi n’agwaetiti ahụ ozi ọma.
Seychelles Dị Anya
Oge eruwokwa mgbe anyị ga-abanye ụgbọ elu ọzọ, ịga kpọmkwem n’ebe ugwu nke ihe karịrị 1,600 kilomita bụ́ osimiri gaa n’agwaetiti nke Mahé dị na Seychelles, a kpọrọ Zil Elwannyen Sesel dị na Creole, nke pụtara “Agwaetiti Seychelle Dị Anya.” N’ihi ịdị anya ya, alaka ụlọ ọrụ pụrụ ịhazi nanị nleta abụọ kwa afọ. A na-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na mgbakọ circuit n’ime ụbọchị atọ sochiri ibe ha n’oge opupu ihe ubi. A na-enwe mgbakọ distrikti n’oge ọzọ n’afọ ahụ. Ugbu a n’etiti ọnwa October, anyị abịawo ebe a maka mgbakọ distrikti, bụ́ nke nleta otu izu a ga-eleta ọgbakọ ga-esochi. Ebe a kwa anyị pụrụ iji asụsụ Mauritian Creole mee ihe.
Ụmụnna ndị si n’agwaetiti dị nso nke Praslin na La Digue abịaworị. Lee ka o si bụrụ ihe ọṅụ inwe 12 mba a nọchiri anya ha! Ebe a na-enwe mgbakọ ahụ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke obodo ahụ, bụ́ otu ebe sara mbara a na-adọsa ụgbọ ala dị n’azụ ebe obibi nke otu Onyeàmà. Ebe ọ bụ na ọ bụ nanị mmadụ isii, tinyere ndị ọbịa, tozuru okè ikere òkè n’usoro ihe omume ahụ, ụfọdụ nwere ihe ùgwù nke ikwu ọtụtụ okwu n’ụbọchị anọ ahụ. Ndị nkwusa ahụ dị 81 nwere mkpali ịhụ ka 216 ndị mmadụ bịara n’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ.
Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, anyị ji obere ụgbọ mmiri gaa Praslin, nke dị 40 kilomita n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Mahé. E mere ụgbọ ahụ dị 18 mita site n’osisi nke tacamahac. Ụgbọ ahụ dị mma pụrụ ibu 50 ndị mmadụ na ihe dị ka 40 tọn nke ibu. Ka anyị na-ahapụ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dị na Mahé ma chee ihu n’ụzọ gawara Praslin n’ebe osimiri na mbara igwe zutere, anyị pụrụ inwe mmetụta nke ụda injin ụgbọ ahụ nke àkwà ọcha abụọ na-eme ka ụgbọ na-aga n’ihu dị n’elu ala ụgbọ ahụ na-enyere aka.
Hour abụọ na ọkara ka nke a gasịrị, anyị gbafere ebe ahụ dị elu jupụtara na nkume ịbanye ná mmiri dara jụụ nke Bay St. Anne mara mma. Mgbe anyị zọrọ ụkwụ n’elu ọdụ ụgbọ mmiri dị ogologo, anyị hụrụ ụmụnna anyị ka ha na-eche. E nwere 13 ndị nkwusa n’obere agwaetiti nke a, 8 ndị bịara abịa sitekwara n’akụkụ ndị ọzọ. Ya mere ọ bụ ihe oké ọṅụ na anyị hụrụ obere ụlọ nzukọ ahụ ka o jupụtara na 39 ndị mmadụ maka okwu pụrụ iche. Lee ohere maka inwe mmụba nke a bụ!
Ka anyị nọ ebe a na Praslin, anyị kwesịrị ije leta Vallée de Mai mara mma. Nke a bụ ebe e nwere nkwụ Coco-de-mer, bụ́ nke na-amị mkpụrụ kasị ukwuu n’elu ụwa, otu na-adị arọ ruru 20 kilogram. N’ime ndo jụrụ oyi na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nke ọhịa ahụ, anyị hụrụ osisi nkwụ a n’akụkụ nile nke uto ya. Akwụkwọ nkọwa a na-enye ndị bịara abịa na-akọwa na nke kasị ogologo dị 31 mita n’elu mgbe ikpeazụ a tụrụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na 1968. A na-agbakọ na ụfọdụ n’ime osisi ndị a toro ogologo anọwo 800 afọ. Ọ na-ewe 25 afọ tupu otu osisi amalite ịmị mkpụrụ na 7 afọ tupu mkpụrụ ya akaa. Ọ bụghị ihe ijuanya na akwụkwọ nta ahụ dọrọ aka ná nti, sị: “Sere nanị foto, hapụ nanị nzọụkwụ”!
N’elekere asaa n’ụtụtụ echi ya, anyị ji ụgbọ mmiri gaa n’obere agwaetiti nke La Digue. Ọtụtụ obere ụgbọ mmiri kpụkọtara gburugburu ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Ha bụ ụzọ mmekọrịta ihe dị n’etiti 2,000 ndị bi na ya na ndị mba ọzọ. Di na nwunye meworo agadi si Switzerland bụ́ ndị nọworo n’agwaetiti a kemgbe 1975 zutere anyị. Kama ịgba “tagzi” ụgbọ ịnyịnya, anyị gara n’akụkụ mmiri nwere oké nkume ndị na-acha pinki pinki mara mma nke osimiri na mmiri ozuzo meworo ka ha na-akwọ mụrụ mụrụ. Mgbe anyị risịrị nri ụtụtụ anyị bu jee mkpagharị, anyị tinyere isi n’ụzọ gara n’ọhịa ụmụ anụ bi, bụ́ ebe nnụnụ oji ahụ na-eri ụmụ ahụhụ a na-adịghị ahụkarị na-amụ ụmụ, gaa n’ebe obibi nke ndị nwere mmasị. Mmadụ 13 zukọrọ ige okwu e kwuru n’asụsụ Creole. Anyị zutere di na nwunye ndị meworo ndokwa nile ime ka alụmdi na nwunye ha bụrụ nke kwekọrọ n’iwu ka ha wee nwee ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. N’ezie, Jehova na-akpọbata ihe a na-achọsi ike nke mba nile ọbụna n’agwaetiti ndị a dịpụrụ adịpụ.
Ịlaghachi Réunion
Réunion bụ agwaetiti kasị mepee emepe anyị letara na njem anyị a. Ka anyị na-abịaru ala, anyị hụrụ okporo ụzọ moto dị akụkụ anọ, nke jupụtara na moto ndị si isi obodo bụ Saint-Denis na-abịa. Ụlọ ndị dị ogologo jupụtara n’oghere dị n’etiti osimiri na ugwu. Agwaetiti a bụ ebe obibi nke ihe dị ka 580,000 mmadụ, ọ ghọwokwa ubi na-amị mkpụrụ maka ịgba àmà Alaeze. (Matiu 9:37, 38) Ugbu a e nwere ihe dị ka 2,000 ndị nkwusa ozi ọma ahụ na-anụ ọkụ n’obi n’ime 21 ọgbakọ dị iche iche.
E mere ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’ebe sara mbara e meworo ka ọ ghọọ ama egwuregwu. Anyị nwere obi ụtọ ịhụ 3,332 mmadụ ndị bịaranụ, leekwa ihe mkpali ọ bụ inwe 67 ndị ọhụrụ wepụtara onwe ha maka baptism! Mgbe anyị na ndị ozi ala ọzọ nọ n’agwaetiti ahụ nwesịrị mmekọrịta dị mma, anyị zọpụrụ njem ịga n’ebe ọzọ anyị nwere ịga.
Mayotte—Agwaetiti Nwere Ísì Ụtọ
Ka anyị mesịrị njem ụgbọ elu were hour abụọ, ụgbọ elu jet anyị ahụ na-ebu 40 mmadụ malitere mfedata ya gaa n’ọdụ ụgbọ elu Pamanzi, nke dị n’agwaetiti nta nke e jikọtara site na 1.9 kilomita, ụzọ gara Dzaoudzi, bụ́ isi obodo nke Mayotte. Mbara igwe na-acha anụnụ anụnụ, igwe ojii na-acha ọcha, ugwu jupụtara n’ahịhịa nakwa oké osimiri na-acha anụnụ anụnụ jikọtara ọnụ na-egosipụta ọdịdị nke paradaịs ebe okpomọkụ dị n’udo. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, e nyere Mayotte aha otutu bụ́ Agwaetiti Nwere Ísì Ụtọ n’ihi ísì ụtọ nke osisi ilang-ilang. A na-eziga okooko osisi sitere na ya na France dị ka ebe a na-esi enweta ihe ísì ụtọ a ma ama n’ụwa.
Ọ bụ nanị njem 15 minit n’ụgbọ mmiri gaa n’agwaetiti bụ isi. Mgbe e nwesịrị ihe ntụrụndụ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, a kpọrọ anyị òkù ịbịa ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ n’ebe dị 19 kilomita n’akụkụ ọzọ nke agwaetiti ahụ. Nke ahụ wetara olileanya anyị nwere ime njem ntụsara ahụ ná ngwụsị. Anyị banyere n’ime moto jeep ghere oghe iji mee mgbagharị na-awụ akpata oyi n’ụzọ dị warara. O yiri ka ọ fọrọ nke nta ka anyị na ndị mmadụ, ehi, nakwa ụgbọ ala ndị ozọ sụkọọ isi. Ma onye France bu anyi n’ụgbọ ala maara ụzọ ahụ. N’oge na-adịghị anya, anyị ruru Chiconi, bụ́ ebe anyị zutere ezinụlọ a na-anọ n’ụlọ ha enwe ọmụmụ ihe ahụ.
Onye ahụ bụ nna, onye bụbu onye Alakụba, kọwasịrị ụmụ ya asatọ. Nwa ya nwoke kasị nta, onye dị afọ anọ, kelere anyị n’ụzọ anyị mesịrị ghọta dị ka ekele omenala. O weere azụ aka nke otu aka ya tụkwasị n’ọbọ aka nke aka ọzọ ma hulata n’ihu anyị. Anyị gbalịrị na mbụ ikwe ya n’aka, mgbe ahụ nwunye m nwara ibikwasị aka ya n’isi ya. Nwa ahụ nke nwere ọkpụrụkpụ anya ji ndidi na-echere, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ na-eche ihe anyị na-eme. N’ikpeazụ anyị meziri ya—anyị tụkwasịrị aka ya n’isi ya. Ọmụmụ ihe ahụ ji mmadụ 14 nọ ebe ahụ malite. Ka anyị gara ọkara n’ọmụmụ ihe ahụ, otu onye nwere mmasị batara ma kwee mmadụ nile n’aka. O doro anya na nke ahụ bụkwa otu n’ime omenala ha.
Na njem nlaghachị anyị site n’ebe ime obodo gbara ọchịchịrị ugbu a, anyị hụrụ ụsụ buru ibu na-aga n’osisi maka iri nri abalị ha. Anyị nụkwara ísì ụtọ nke mkpụrụ osisi jackfruit nke dasaworo n’ụzọ ikuku na-eku nakwa ísì ụtọ nke mango, pọpọ, na gova. Ebe a bụ ebe e nwere lemur, anụmanụ ntakịrị yiri enwe, nke nwere ihu nkịta ọhịa na ọdụ dị ogologo nke rịgọrọ arịgọ, nke pụkwara ijide ihe. Ka anyị gasịrị n’elu ugwu, anyị hụrụ ihe na-akpali akpali. Ọnwa gbajuru agbaju nke na-acha ka oroma wapụtara n’elu mmiri, na-egbukepụ n’elu mmiri dara jụụ. Ọbụna onye na-akwọ ụgbọ ala anyị kwụsịlatara iji lere ya. Na njem nke fọrọ afọ, anyị lere anya ịhụ ya ná ntụgharị ọ bụla nke ụzọ ahụ.
N’ụtụtụ echi ya anyị na ndị ozi ala ọzọ gara ime nkwusa. Na mbụ, anyị jere leta otu nwa okorobịa bụ́ onye nkụzi ma na-asụ asụsụ French nke ọma. Ọ nọdụrụ n’ala ụlọ, anyị ewee nọdụ n’àkwà ndina ya. Ọmụmụ ihe ọzọ bụkwa nke anyị na nwa okorobịa nwere, ọ kpọkwara anyị òkù ịnọdụ na matrasi ya tọgbọ n’ala ụlọ nke ọnụ ụlọ ya dị ntakịrị. Mgbe oge gasịrị anyị malitere ịhịgharị onwe anyị, n’agbanyeghị mgbali anyị gbalịrị ileghara ntagide dị n’ụkwụ anyị na ọsụsọ na-agba anyị n’azụ. Ebe ọ bụ na ígwè redio dị n’ụlọ dị nso na-akụpụta egwu ka pụtara ọhụrụ, ọ dịghị mfe ịtụkwasị uche anyị n’ọmụmụ ihe ahụ, nke a na-eduzi n’otu akụkụ n’asụsụ French na n’akụkụ ọzọ n’asụsụ Mahorian.
Ebe ikpeazụ anyị gara bụ n’ebe otu nwa okorobịa sitere n’agwaetiti Comoros nke dị nso. Ọ rịọrọ mgbaghara maka adịghị asụta asụsụ French nke ọma, wepụta akwụkwọ nta ya, ma dịkwa njikere ịmalite. Mgbe onye ozi ala ọzọ ahụ nọgidere na-akọwara m ihe ụfọdụ, ọ na-amanye ọnụ wee kwuo na ya na-aga ịgụpụta paragraf. Ọ na-agwa anyị n’ụzọ nsọpụrụ ka anyị kwụsị ime ụzụ. Ndị a nile bụ ndị Alakụba, ma ha nwere obi ekele n’ihe nile ha na-amụta site na Bible.
Ọ na-eju anyị anya ihe mere ọtụtụ ụmụ okorobịa na-eji amụ ihe, ma nanị ndị inyom ole na ole ma ọ bụ ụmụ agbọghọ na-eme nke a. Nke a, dị ka a gwara anyị, bụ ihe omenala ezinụlọ na nke ọha mmadụ kpatara. Ebe a nabatara ịlụ karịa otu nwunye n’okpukpe na n’ọha mmadụ, ebe nwunye nke ọ bụla na-ebikwa n’ebe obibi nke aka ya, mmetụta onye bụ nna na-adị nta; onye bụ nne bụ onye ihe nile dị n’aka. Anyị mụtakwara na ụmụ ada, dị ka omenala si dị, na-anọgide n’ebe obibi nne ha ruo oge ha ga-alụ di. Ụmụ ha ndị nwoke, n’aka nke ọzọ, na-ahapụ ụlọ ná mmalite oge uto ha wee wuo banga ma ọ bụ ụlọ nta nke ha, ma ọ bụ soro ụmụ okorobịa ndị ọzọ biri na banga. N’okpuru ọnọdụ dị otú ahụ ụmụ okorobịa nwere ohere ịmụ ihe ma ọ bụrụ na ha achọọ, ma ụmụ agbọghọ ole na ole nwere ụdị ohere ahụ.
Sunday ga-abụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Ihu eluigwe malitere n’ụzọ dị mma, ma n’ehihie igwe ojii malitere ịkpụkọ, ma n’atụfughị oge mmiri malitere izo. O nweghị onye ọ na-ewute, ebe o mere ka ihe nile jụọ oyi. N’ebe a kwa anyị hụtara ọtụtụ ihe ime mmụọ ka 36 ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ ṅụrịrị ọṅụ ịhụ 83 ndị bịaranụ na 3 ndị ọhụrụ ka e mere ha baptism.
Mwepụta nke akwụkwọ nta bụ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! n’asụsụ ha bụ ihe omume bụ isi. Ọ bụghị nanị na ọ bụ akwụkwọ Watch Tower dị n’asụsụ Mahorian kamakwa nanị akwụkwọ dịrịla otú ahụ n’asụsụ ahụ. O nwere ihe ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ Arabic n’okpuru nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ Roman. Ndị mmadụ na-amụ mkpụrụ akwụkwọ Arabic n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụghị asụsụ Arabic. Ha pụrụ ịgụ ekpere n’asụsụ Arabic ma gụọkwa Koran n’asụsụ Arabic; otú ọ dị, ha adịghị aghọta ihe ha na-akpọpụta. Ka ha na-agụ mkpụrụ akwụkwọ Arabic n’akwụkwọ nta ahụ, o juru ha anya na ha pụrụ ịghọta ya. Ihe ha na-agụ bụ nnọọ asụsụ Mahorian e ji ụda olu nke asụsụ ahụ dee ná mkpụrụ akwụkwọ Arabic. Ọ bụ ihe ọṅụ ịhụ ihu ha ka ọ na-egbukepụ ka ha na-aghọta ihe ha na-agụ.
A na-etinyekarị akwụkwọ nta n’aka ndị mmadụ. N’otu n’ime obodo nta ndị dịpụrụ adịpụ, otu nwoke bịakwutere anyị mgbe anyị na-ezi otu nwanyị ozi ọma. Ọ malitere ịgwa nwanna anyị okwu n’olu siri ike n’asụsụ Mahorian. O yiri anyị ka ọ na-eguzogide ihe anyị na-eme. Nwoke ahụ gara n’ihu na nwa mgbe, na-emegharị ahụ n’iwe. Nwanna ahụ mechara kọwaa na nwoke ahụ na-eme mkpesa: “Olee otú unu ga-esi tụọ anya anyị icheta ihe ndị unu gwara anyị mgbe unu na-abịa eleta anyị nanị otu ugbo kwa afọ? Olee otú unu ga-esi chee otú ahụ? Unu kwesịrị ịbịa mgbe mgbe iji gwa anyị okwu banyere ihe ndị a.”
Okwu ikpeazụ ndị ahụ na-ekwupụtakwa ihe bụ mmetụta anyị. Jehova n’ezie na-achịkọta ihe nile a na-achọsi ike nke mba nile site n’ozi ọma nke Alaeze. Ọ bụ ezie na oké osimiri sara mbara kewapụrụ ha, ndị bi n’agwaetiti ndị ahụ na-etinyekọ olu ha n’oké iti mkpu nke otuto a na-enye Onye Mere ha na Nna ha nke eluigwe, Jehova Chineke.—Hagaị 2:7.
[Map dị na peeji 21]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
SEYCHELLES
OSIMIRI INDIA
COMOROS
MAYOTTE
MADAGASCAR
MAURITIUS
RÉUNION
RODRIGUES
[Foto dị na peeji nke 23]
Ugwu jupụtara ná nkume na Praslin, Bay St. Anne
[Foto dị na peeji nke 24]
“Tagzi” ụgbọ ịnyịnya dị na La Digue, Seychelles
[Foto dị na peeji nke 25]
Iji akwụkwọ nta ọhụrụ ahụ na-ezi ozi ọma na Mayotte