Ịchịkọta “Ihe A Na-achọsi Ike” na Poland
POLAND ka a na-ekwu na ọ bụ mba nke chọọchị Katọlik. Dị ka ngụkọ nke ndị ọchịchị mere si dị, 93 pasenti nke ndị bi na ya bụ ndị nọ na Chọọchị Katọlik. Otú ọ dị, mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ọha mmadụ na-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ n’oge na-adịbeghị anya, enwewo mmetụta dị ukwuu n’ebe ndị mmadụ ná ndụ okpukpe ha dị. Nnyocha e mere na-egosi na nanị 50 pasenti nke ndị ahụ a jụrụ ajụjụ ọnụ na-ele onwe ha anya dị ka ndị na-ekpe Katọlik.
Na May 1989, e nyere Ndịàmà Jehova nkwado iwu dị ka otu òtù okpukpe na Poland. Kemgbe ahụ, ihe dị ka 11,000 ndị ọhụrụ esonyeworo ndị òtù ha dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ugbu a, ihe karịrị 106,000 ndị nkwusa Alaeze na-esonyere ihe karịrị 1,300 ọgbakọ dị iche iche, 200,422 ndị mmadụ bịakwara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst na 1991. Otú a, nchịkọta ahụ e buru n’amụma nke a ga-achịkọta “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” na-ewere ọnọdụ na Poland. (Hagaị 2:7) N’oge na-adịghị anya, e mere mgbakọ ukwu mba nile nke Ndịàmà Jehova na Poland, bụ́ nke e jiri mere isi akụkọ. Ma ileba anya n’ụfọdụ n’ime obere obodo ndị dị ná mba ahụ ga-egosi karịsịa ụzọ ọrụ nchịkọta ahụ si na-aga n’ihu n’ala ahụ.
Ndị Ọsụ Ụzọ Emepee Ụzọ
Sztum bụ obodo nke ndị bi na ya dị 10,000 n’ọnụ ọgụgụ, nke dị n’ebe ahụ Osimiri Vistula na-asọbanye n’oké Osimiri Baltic. Ruo ogologo oge e lewo obodo nke a anya dị ka ókèala siri ike n’ihe metụtara ọrụ nkwusa ahụ. Ná 1987, e nwere nanị ndị nkwusa asatọ n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ihe malitere ịgbanwe mgbe ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile nke Alaeze bịarutere. Na nzukọ nke ise bụ́ nke e mere n’ebe a na-eme ihe nkiri sinima, 100 ndị nwere mmasị bịara! E hibere otu ọgbakọ mgbe afọ abụọ nke ịrụsi ọrụ ike gasịrị. Ugbu a, 90 ndị nkwusa ahụ nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze nke aka ha, 150 ndị mmadụ na-agakwa nzukọ ha mgbe nile.
Dị ka a tụrụ anya ya, mgbe na-adịghị anya, mmegide bịara site n’aka Chọọchị Katọlik. Onye nọn “ọkachamara” kwuru okwu ụfọdụ na-emebi aha ihe banyere Ndịàmà ahụ, na-ebo ha ebubo izi ozizi ụgha. Ma dị ka ọ na-emekarị, nke a lọghachikwutere ha. Nanị ihe okwu ya mere bụ ime ka ndị mmadụ chọọ imata nke bụ eziokwu. Ọtụtụ n’ime ha amụtawo eziokwu, ha bụkwa ugbu a ndị ọsụ ụzọ oge nile! Ha na-asị: ‘Mgbe anyị na-amụ eziokwu ahụ, anyị chere na onye ọ bụla chọrọ ịbụ Onyeàmà aghaghị ịdị ka onye nkuzi ya, nke pụtara ịghọ onye ọsụ ụzọ.’ Ya mere mmụọ ọsụ ụzọ gbasazuru n’ọgbakọ ahụ dum.
Dị ka ihe si na ya pụta, a na-eduzi ihe dị ka 180 ọmụmụ Bible ebe obibi n’ebe ahụ. Site n’iji akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe, a kụziworo ụfọdụ otú e si agụ. N’otu oge ahụ, ha amụtawo eziokwu ahụ. A na-eduziri otu ìgwè ndị mkpọrọ nọ n’ebe ahụ ọmụmụ Bible oge nile nke na-ewe minit iri mgbe ha pụtara idobe okporo ámá ọcha. Otu n’ime ha kwuchitere ọnụ otu Onyeàmà mgbe otu nwanyị na-agafe agafe malitere ịkpọ ya iyi. Ọ gbakwuuru nwanna nwanyị ahụ, nara ya akwụkwọ Ndụ Ebighị Ebi ahụ n’aka ya, welite ya elu, wee jụọ nwanyị ahụ na-akpọ iyi, sị: “Ị̀ pụghị ịgụ akwụkwọ? Gịnị ka e dere n’ebe a? Ị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala! Ị̀ nụtụwo ihe dị otú ahụ mbụ? N’ihi gịnị ka iji nnọọ na-akparị Chineke na ndị na-efe ya ofufe?”
Okwu A Kpụ n’Ọnụ
Kruszwica bụ́bu isi obodo a ma ama nke Poland, bụ ebe Chọọchị Katọlik gbara mkpọrọgwụ. Ọbụna n’etiti afọ 1990, e nwere nanị Ndịàmà ole na ole n’etiti 9,300 ndị bi na ya. Ma ngọzi bara ụba nke Jehova dịkwasịrị ná mgbalị nke ndị nkwusa Alaeze ahụ.
N’ịmata ihu abụọ nke ndị ndú ime mmụọ ha, ọtụtụ ndị mmadụ—karịsịa ndị na-eto eto—chigharịkwuuru Ndịàmà maka aziza. N’oge na-adịghị anya, a malitere 20 ọmụmụ Bible ebe obibi. Onye ụkọchukwu parish kwuru okwuchukwu na-egosi ịkpọasị banyere Ndịàmà Jehova, ma nke a akụdaghị ndị mmadụ nwere obi eziokwu aka ije nzukọ ha dị iche iche. Ndịàmà ahụ ghọrọ isiokwu bụ isi nke nkwurita okwu n’ụlọ ahịa dị iche iche na ogige ntụrụndụ dị iche iche na ọbụna n’ime ụlọ chọọchị. Ọkara afọ mgbe nke a gasịrị, e guzobere ị̀gwè ọmụmụ akwụkwọ abụọ buru ibu. Ugbu a, Kruszwica nwere ọgbakọ na-arụsi ọrụ ike nke nwere ihe dị ka 35 ndị na-efe Jehova ofufe. Ha na-eduzi 75 ọmụmụ Bible ebe obibi ma jiri ọrụ n’aka n’iwebata ‘ihe ndị a na-achọsi ike’ bụ́ ndị nọbu n’agbụ nke okpukpe ụgha.
N’etiti ndị a e nwere Bogdan gbara 23 afọ, onye òtù nke otu ezinụlọ na-ekpesi Katọlik ike. Ọ na-echeta, sị: “M na-aṅụbu mmanya, na-ese ụtaba, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. A maara m dị ka onye punk na onye na-akpasu ọgba aghara, o yiri ka ọ dịghịkwa onye chọrọ ịma. Otú ọ dị, mgbe m malitere ịmụ Bible nne m yiri egwu iri nsí. N’ihi enweghị ike iguzogide ihe nrụgide ahụ, egbubiri m mmekọrịta nile nke mụ na Ndịàmà. Mgbe e mesịrị, site n’enyemaka ịhụnanya nke ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, enwere m ike inwere onwe m pụọ n’omume ọjọọ nile. N’ịbụ onye e mere baptism ná Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya’ nke 1991, ahọrọwo m ozi oge nile dị ka ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ, anọwokwa m na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inye aka kemgbe ahụ.”
Sławomir gbara 21 afọ bụ onye e jiri mgbaasị na ofufe Setan kegide, bụ́ nke ọ jụrụ ozugbo ọ hụrụ na Bible na-ama omume ndị dị otú ahụ ikpe. “Ma Setan nọgidesiri ike,” ka ọ na-ekwu. “N’otu abalị ígwè na-akpọ egwụ malitere ịkpọ egwu n’enweghị onye gbanyere ya, m wee nụ egwu Setan, ọ bụ ezie na ewepụsịwo m ihe ọ bụla metụtara ofufe Ekwensu n’ụlọ. M kpere ekpere nye Jehova, o nyekwaara m aka iguzosikwa ike n’ime mmụọ ọzọ. Onye na-agwọ isi mgbaka nke m na-ejekwuru n’ihi nrụgide nke ndị mụrụ m chọpụtara ọganihu dị ukwuu n’ọnọdụ m ma kwubie na ahụ dị m mma. O dere n’akwụkwọ ihe ndekọ m sị: ‘Ndịàmà Jehova gwọrọ ya.’”
Iguzogide Mmụọ nke Ụwa
N’ebe ọdịda anyanwụ nke ndịda Kruszwica ka e nwere Środa Śląska. “Ihe a na-achọsi ike” ahụ na-apụtakwa n’obere obodo nke a nke ndị bi na ya dị 9,000 ndị mmadụ. Afọ anọ gara aga, ọ dị nanị otu n’ime ụmụnna ime mmụọ anyị bi n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ugbu a, ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze arịwo elu ruo 47. Ọtụtụ n’ime Ndịàmà ahụ nọbu n’ọnya nke mgbaasị, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na omume rụrụ arụ. Ha na-eche na n’ụzọ bụ isi nke a bụ n’ihi oghere ihe na-adịghị na ya n’ụzọ ime mmụọ nke dị na chọọchị nke nanị ihe ọ pụrụ ime bụ ịma ndị mmadụ ikpe n’ụzọ ime mmụọ, ọ bụghị inyere ha aka. Ndịàmà ahụ na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha n’ezie.
Ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ ahụ emewo ka ụlọ akwụkwọ bụrụ ókèala nke onwe ha maka ọrụ nkwusa ahụ. “Ụmụ akwụkwọ ibe m na-asịkarị m: ‘Ị na-emefusi oge ntorobịa gị,’” ka Kasia gbara 18 afọ na-akọ. “Ma ezerewo m ọtụtụ nsogbu, ndụ m abụrụwokwa nke bara uru. M na-eduzikwa ọtụtụ ọmụmụ Bible n’ụlọ akwụkwọ, m naghị eleghara ma ọrụ ụlọ akwụkwọ m na-arụ n’ụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye m anya. Ụmụaka ndị inyom na-asị na m ‘na-emefusị oge ntorobịa m’ aghọwo ndị nne ugbu a, ha na ibu dị iche iche nke nsogbu na-agbakwa mgba.”
Mbipụta dị iche iche nke Watch Tower abụrụwo ihe a ma ama nke ukwuu n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ebe ahụ. Dị ka ihe atụ, onye nkụzi nke asụsụ ndị Poland gwara ụmụ akwụkwọ ya ka ha gbasoo asụsụ dị mfe nke akwụkwọ anyị bụ́ Teta! dị ka ihe nlereanya ha maka ihe odide ha. Ewa bụ́ onye ọsụ ụzọ inye aka achọpụtawo na akwụkwọ nta ahụ bụ́ School and Jehovah’s Witnesses bara uru nke ukwuu. “Akwụkwọ nke a masịrị m nke ukwuu. Ndị nkụzi m maara ya nke ọma. Ọ dịbeghị mgbe m nwetara nsogbu ọ bụla ịnata ikike ịhapụ ịbịa klasị iji jee mgbakọ ukwu dị iche iche.” Àgwà ọma dị otú ahụ n’akụkụ nke ndị na-eto eto na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.
Ndị Mkpọrọ Obi Tara Mmiri Echegharịa
N’ebe ọwụwa anyanwụ nke Środa Śląska ka Strzelce Opolskie dị, ebe e nwere ụlọ mkpọrọ abụọ. Otu bụ ụlọ mkpọrọ ebe a na-echesi nche ike na ya maka ndị ome ihe ọjọọ na-adịghị agbanwe agbanwe. Ndịàmà na-eleta ebe ịta ahụhụ abụọ ndị a mgbe nile iji wetara ndị mkpọrọ eziokwu ahụ, ndị ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị mkpọrọ nke Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.—Mkpughe 18:1-5.
Ndịàmà ahụ na-esoro ndị mkpọrọ ahụ n’otu n’otu na n’ìgwè nta dị iche iche nke ndị mkpọrọ ahụ na-amụ Bible, ndị e meworo ụfọdụ n’ime ha baptism. Ọ bụ ezie na ha aghaghị ịnọ n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe oge a tụrụ ha mkpọrọ ga-agwụ, ha na-arụsi ọrụ ike n’ikwusara ndị ọzọ bụ ndị mkpọrọ ibe ha ozi ọma. Otu onye mkpọrọ na-akwadebe ịbụ onye e mere baptism mere ụdị mgbanwe pụtara nnọọ ìhè nke na ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ nyere ya ohere ịgaru ụlọ otu ugbo n’ime otu izu. Ndị ọzọ edeworo ezinụlọ ha dị iche iche akwụkwọ na-ekwuputa mkpebi ha ịhapụ ụlọ mkpọrọ ọ bụghị dị ka ndị ome mpụ, kama dị ka Ndịàmà Jehova.
Onye isi ọrụ nke otu n’ime ụlọ mkpọrọ ndị ahụ mere mkpesa na ndị ụkọchukwu nke Katọlik na-abịabu ma ọ dịghị ihe ha rụzuru. Ọ jụrụ Ndịàmà ahụ, sị: “Gịnị na-eme ka unu gbanwee ndị a ma mee ka ọnọdụ ha dịghachi mma?” Otu akwụkwọ ozi onye mkpọrọ degaara ezinụlọ ya na-aza, sị: “N’ụlọ mkpọrọ ebe a, Ndịàmà Jehova agwawo m banyere nkwa dị ebube nke Chineke banyere ọchịchị ọhụrụ ahụ bụ́ Alaeze Jehova, nke ga-achị elu ala n’oge na-adịghị anya. N’ebe a, e nwewo m ohere nke iji Bible tụlee ụzọ ndụ m ná mbụ. Ebe m ruworo ná nkwubi okwu ndị dị ilu, ihe jupụtara m bụ ọchịchọ siri ike ịbụ nwoke nweere onwe ya na ịhụta onwe m dị ka onye Alaeze Chineke ga-achị. Taa, abụ m Onyeàmà nke Jehova e meworo baptism.”
N’ụlọ mkpọrọ nke ọzọ, ọtụtụ ka a tụrụ mkpọrọ 25 afọ n’ihi igbu mmadụ. A na-eduziri 12 ndị ikom ọmụmụ Bible oge nile. Otu n’ime ha raara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptism, ndị ọzọkwa na-eme atụmatụ ịgbaso otu nzọụkwụ ndị a. N’igosi ekele maka ezi ihe nke ụdị izi ihe nke Ndịàmà Jehova ji mee ihe rụpụtara, onye isi ọrụ ụlọ mkpọrọ ahụ kwuru, sị: “Enweghị m ndị mkpọrọ 12. Enwere m 600. Biko nyerenụ m aka ịzụta ha. M ga-enye unu ihe nile dị unu mkpa, ma biko kwadebenụ usoro ihe omume ahụ. Lezienụ ha anya!”
Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ụmụnna ndị ikom ahụ mere. Ha chere n’ihu ha usoro ihe omume Bible nke na-ekwu banyere nzube nke ndụ, olileanya dịrị ọdịnihu, na mkpa ọ dị ịhapụ omume ọjọọ. Ha kọkwara ahụmahụ nke otu onye mkpọrọ mesịrị ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, mgbe oge na-aga bụrụkwa okenye ọgbakọ a họpụtara ahọpụta. Ndịàmà ahụ kọkwara isi ihe dị n’akụkọ ndụ nke otu onye ohi diamond na onye na-eji ọgwụ eme ihe n’ụzọ n’ezighị ezi, bụ́ ndị mụtaworo eziokwu ahụ.a Usoro ihe omume ahụ masịrị 20 ndị mkpọrọ nọ n’ebe ahụ nke ukwuu, ha jụkwara ọtụtụ ajụjụ, ọbụna ụfọdụ rịọrọ ka e duziere ha ọmụmụ Bible.
E Lee Okwukwe na Ntachi Obi Ule
Lubaczów bụ obodo nta nwere 12,000 ndị mmadụ bi na ya, nke dị nso n’ebe ókèala mba Ukraine jedebere. Ọrụ nkwusa ahụ nwere nkwalite ka ukwuu na 1988 mgbe ndị ọsụ ụzọ banyere n’ebe ahụ inyere 12 ndị nkwusa dị n’ebe ahụ aka. Ugbu a, e nwere 72 ndị nkwusa Alaeze na-arụsi ọrụ ike, 150 mmadụ bịakwara Ememe Ncheta nke 1991 n’Ụlọ Nzụkọ Alaeze e wuru ọhụrụ.
Na June 1991, Pope John Paul nke Abụọ letara Lubaczów. Ma nke ahụ emeghị ihe ọ bụla ịkwalite ezi okwukwe n’etiti ndị mmadụ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị obi abụọ na ajụjụ banyere nzube nke ndụ na olileanya maka ọdịnihu na-enye nsogbu. Mgbe ha na-enweghị ike inweta azịza na-eju afọ site n’aka ndị ụkọchukwu, ha na-echigharịkwuru Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na ná mbụ ndị mmadụ pụrụ inwe ihe mgbu nke akọ na uche n’ihi ịhapụ okpukpe ha, eziokwu Bible ha na-amụta na-enyere ha aka ịhụ na ha emewo mkpebi ziri ezi.
Otu ihe atụ bụ ahụmahụ nke Honorata, onye bụ onye ọsụ ụzọ oge nile ugbu a. N’ihe dị ka otu afọ gara aga, ọ jụrụ onye ụkọchukwu n’oge nkwupụta njọ ihe aha Chineke bụ. “Chineke bụ ịhụnanya—nke ahụ bụ aha ya kasị maa mma,” ka onye ụkọchukwu ahụ zara. Mgbe obere oge gasịrị, o kwukwara, sị: “Ị dị ka otu efere mmiri dị ezigbo ọcha nke otu onye tanyere ink n’ime. A pụghị imekwata ihe si n’ime ya pụta emekwata.” Otú a ka o si nweta azịza ya. “M kpebiri mgbe ahụ na m ga-abụ otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka Honorata kwuru. “Nke ahụkwa bụ ihe a na-apụghị imekwata emekwata.”
Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na onye ọ bụla nke matara eziokwu na Lubaczów aghaghị inwe ntachi obi n’ihi mmegide dị ike, ọbụna nke ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. Ma nke ahụ egbochighị ha inweta eziokwu nke Bible na iguzo n’akụkụ nke Jehova.
Elżbieta na-akọ, sị: “Ná mbụ ha tiri m ihe n’ụlọ. Mgbe ahụ, ezinụlọ m mabatara n’ime Ụlọ Nzụkọ Alaeze. . . . Ha kpọọrọ m laa ụlọ wee malite iji osisi nwegasịrị akpụ ‘na-emezu ikpe ziri ezi.’ E tiri m ihe ma gbaa m ụkwụ n’ahụ m nile nanị n’ihi isonyere Ndịàmà. E tisiri m ihe ike nke na ọ dịrị m mkpa inweta nlekọta ahụ ike ozugbo, e wee kpọgaa m n’ụlọ ọgwụ. Jehova nyeere m aka, ahụ wee dị m mma. Ezinụlọ m jụrụ m. Mgbe m gwara onye ụkọchukwu banyere nke a, o wedara m ala, na-asị: ‘Ị̀ bịara ime mkpesa nanị n’ihi ụra ole na ole a mara gị?’”
Otu nwanna nwanyị ọzọ na-echeta, sị: “Kwa afọ m na-agabu Częstochowa iji jiri ikpere jee ije n’Ụzọ nke Obe, bụ́ nke m lere anya dị ka ọrụ dịịrị ezi onye Katọlik ọ bụla. M ka nwere àpà ọnya ndị kpọrọ akpọ n’ikpere m.” Mgbe ọ gbara 18 afọ ọ mụtara eziokwu ahụ wee gwa onye ụkọchukwu na ezinụlọ ya na ya agaghị alọghachite na chọọchị. E tiri ya ihe nke ukwuu—“nke ọjọọ na ụbụrụ isi m gbagharịrị,” ka ọ kọrọ. “Ma n’ụlọ ọgwụ, ahụ dịrị m nnọọ mma n’ụzọ zuru ezu ije Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya.’ Akwara m ákwá ọṅụ mgbe m hụrụ ezi ịdị n’otu na ịhụnanya n’etiti ndị mmadụ n’enweghị ịnụbigara okwukwe ọkụ n’obi—ihe ndị m na-ahụbeghị na Częstochowa. Lee oké obi ụtọ m nwere inwe ahụmahụ nke ịdị mma Jehova na ịmụta ịtụkwasị ya obi.” Jehova na-ewusi ike ma na-akwado ndị ahụ na-atụkwasị ya ibu ha.—Abụ Ọma 55:22.
Ọtụtụ ndị nọ ná mkpọrọ na Babilọn Ukwu ahụ na-aṅa ntị ugbu a n’òkù ahụ nke ‘isi n’etiti ya pụta’ ná mba Katọlik nke a, ọbụna dị ka e si eme n’ebe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bụ uche Jehova, ndị ya na-adịghị atụ egwu ga-anọgide na-achịkọta ọtụtụ ndị ọzọ nke “ihe a na-achọsi ike” ahụ bụ́ ndị nọ n’ebe dị iche iche gburugburu Poland. N’ezie, ọtụtụ ndị ka ga-aza òkù ahụ, bụ́: “Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 18:4; 22:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta! nke October 8, 1983, peji 16-19, na November 22, 1987, peji 21-23 (Bekee).
[Map dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Sztum
Poznan
Kruszwica
POLAND
Warsaw
Środa Śląska
Częstochowa
Strzelce Opolskie
Lubaczów
[Foto dị na peeji nke 26]
Ikwusa ozi Alaeze ahụ na Kruszwica, Poland