Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ha Gbanwere Ụzọ Ndụ Ha
IHE ịrụ ụka adịghị ya na ị hụwo ka ha na-agwa ndị ọzọ okwu n’okporo ámá, na-akpọtụrụ ndị mmadụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma ọ bụ ka ha na-eje nzụkọ dị iche iche nke ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Anyị na-ekwu banyere ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà Jehova jiri ejiji dị mma. Ị pụrụ iruworị ná nkwubi okwu nke bụ na ha bụ́ Ndịàmà n’ihi na ndị mụrụ ha kụziiri ha ịbụ ndị dị otú ahụ, otú ahụ kwa ka ọ dị n’ebe ọtụtụ n’ime ha. N’aka nke ọzọ, e nwere ụfọdụ n’ime ndị a na-eto eto nwere nzụlite pụrụ nnọọ iche, ndị ụzọ ndụ ha ná mbụ dị nnọọ iche n’ụdị ndụ ha na-adị ugbu a. N’ezie, ndị ahụ e gosiri na peji na-esonu na-esobu òtù ndị na-eme mpụ na ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ kwa ụbọchị. Gịnị kpaliri ha ịgbanwe ndụ ha kpam kpam? Ka anyị leta otu obodo na Norway ma zute ụfọdụ ndị na-eto eto meworo ụdị mgbanwe ndị dị otú ahụ.
Ntọala Maka Mgbanwe Ahụ
Mgbe Ndịàmà abụọ zutere Annette n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ọ dị 19 afọ. “A gwawo m ọtụtụ mgbe ka m ghara ịgwa Ndịàmà Jehova okwu mgbe ọ bụla, ma m nwere ọchịchọ ịmata ihe, m wee kpọbata ha,” ka ọ na-echeta. Ọ bụwo onye na-aṅụ ọgwụ ọjọọ kemgbe ọ gbara 11 afọ, o tinyewokwa aka n’itika ụlọ na izu ohi ụgbọ ala.
Ozi ọma nke Alaeze ahụ masịrị ya nke ukwuu. Olileanya nke mbilite n’ọnwụ gbara ya ume karịsịa, ebe nne ya nwụnahụworo ya mgbe ọ dị afọ ise. Ya mere ọ nakweere ọmụmụ Bible a na-eduzi n’efu, malitekwa ịbịa nzụkọ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ gwara enyi ya nwoke na ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. Gịnị bụ mmeghachi omume ha? Ha achọghị inwe ihe ọ bụla jikọtara ha na ya, bokwa Annette ebubo ịbụ onye a rụgideworo ịtụfu ihe o kwenyere na ya. Otú o sina dị, ụfọdụ n’ime ndị ahụ megidere ya karịsịa mesịrị malite ịmụ Bible.
Were, dị ka ihe atụ, Espen, nwa okoro gbara 20 afọ. Ọ nụrụ banyere ozi Alaeze ahụ site n’ọnụ enyi nwoke Annette, ozugbo ahụ kwa, ọ chọrọ ịmụ Bible. Otú ọ dị, ọ na-echere ịgachagodi mkpọrọ ọnwa anọ a mara ya ikpe ya, n’ihi na o tinyewo aka n’izubata ọgwụ ọjọọ dị iche iche na itika ụlọ dị iche iche nke ndị mmadụ, dịkwa ka Annette. Ọ na-esekwa ụtaba, wii wii, na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ. Ugbu a, gịnị ga-eme ka onye tinyeworo aka n’ụdị ihe ndị dị otú ahụ ịchọ ịmalite ịmụ Bible? Espen malitere ịghọta ịtọgbọrọ chakoo na ụkọ nke nzube n’ụzọ ndụ ya. Ọ na-akọ, sị: “Ihe dọtara m bụ nkwa Bible dị iche iche nke nyere m nzube ná ndụ. Ya mere m malitere ịmụ ihe iji chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu ka a gwara m.”
Ndị Ọzọkwa Chọrọ Ịmụ Bible
N’ihe dị ka n’oge a, otu nwa okoro sokwa n’òtù ahụ nke ndị na-eto eto nụkwara ozi ọma ahụ, ọ malitekwara ịmụ ihe na ije nzukọ dị iche iche. Ọzọkwa, a maliteere onye ọzọ n’etiti ndị ntorobịa ndị a ọmụmụ ihe, o wee malitekwa ije nzụkọ dị iche iche. Mgbe na-adịghị anya ka nke a gasịrị, otu nwa okoro ọzọ na-eto eto sonyekwaara ndị enyị ya n’ịmụ Bible na n’inwe ọganihu ime mmụọ. Mgbe ahụ onye ntorobịa ọzọ so n’òtù ahụ nwere mmasị ná mgbanwe ndị dị mma ndị enyi ya na-eme, n’ime oge na-adịghị anya, ọ chọkwara ịmụ Bible.
Gilbert, onye na-eto eto nke na-eti egwú nke si n’otu òtù ahụ, malitekwara ugbu a ịmụ Bible. Ma nne ya ma nna ya anwụwo n’ihi ọrịa cancer, n’ihi ya ọ bụ onye olileanya Bible nke mbilite n’ọnwụ kasiri obi. (Jọn 5:28, 29) Ọ na-esekwa wii wii ma na-ebikwa ndụ rụrụ arụ, o nwekwara ọchịchọ dị elu nke ịbụ onye na-eti egwú rock a ma ama. Otú ọ dị, ka oge na-aga, o nwere ọganihu ime mmụọ dị mma, n’oge na-adịghịkwa anya o kpebiri ịbụ Onyeàmà nye Jehova. N’ikpeazụ, nwanne nwoke Espen nke obere malitere inyocha Bible na isonyere Ndịàmà.
Eziokwu Bible Na-agbanwe Ndụ
Mgbanwe dị ukwuu weere ọnọdụ n’ime ndị na-eto eto ndị a, bụ́ ndị na-ejibu ejiji na-adịghị mma n’anya, na-adịghị edebe agịrị isi ha ọcha, na-etinye aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, n’izu ohi, na ná mpụ dị iche iche ndị ọzọ. Annette bụ ezi onye nkwusa nke Alaeze ahụ, o jeekwa ozi dị ka onye ọsụ ụzọ ruo ihe dị ka otu afọ. Espen na Gilbert ejewo ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inye aka, ha bụkwa ndị ohu na-eje ozi. Ha abụọ alụwo nwunye n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Anọ ndị ọzọ nke òtù mbụ ahụ bụkwa ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi!
Gịnị banyere mkpọrọ ọnwa anọ nke a mara Espen ikpe ije? N’ihi mgbanwe ndị o mere ná ndụ ya, a gbanwere ikpe a mara ya ịbụ 80 hour nke ịrụ ọrụ ime obodo. Ná nkweta nke ndị uwe ojii na ndị ọzọ, o jiri hour ndị a mee ihe n’ịrụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ebe ahụ. Obi tọrọ ndị uwe ojii ụtọ n’ihi ndokwa nke a.
Ee, ọtụtụ ndị na-eto eto ndị ọzọ gburugburu ụwa nwere ahụmahụ nke ime mpụ gbara nzụlite ha gburugburu. Ma eziokwu nke Okwu Chineke enyewo ha azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa na olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. N’ihi ya, ha abụghịkwa ndị na-eme mpụ ma ọ bụ ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ha adịghịkwa ejegharị n’ejiji ndị na-adịghị mma n’anya. Ebe ha gbanweworo ụzọ ndụ ha, ha dị nnọọ ka ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’elu—Ndịàmà nke Jehova na-eto eto, na-eji ejiji dị mma, na-arụsikwa ọrụ ike nye. Ha chọrọ ime ka ndị ọzọ mara maka ngwọta na-adịgide adịgide nke Bible nye nsogbu dị iche iche nke ọtụtụ ndị na-eto eto nwere taa.—Lee 1 Ndị Kọrint 6:9-11.
[Foto dị na peeji nke 8]
Espen, Annette, na Gilbert