Ọ Lụrụ Ọgụ Maka Okwukwe Ya
AFỌ atọ gara aga, Caridad Bazán Listán, otu n’ime Ndịàmà Jehova na Cádiz, Spain, chọrọ ịwa ahụ ngwa ngwa. Nkume siri ike nke dị n’akụkụ akpa mamịrị ya na-akpata ahụ ọkụ ma na-emetọ oruru ọbara ya. Mgbe e nyere ya àkwà n’ụlọ ọgwụ dị n’ógbè ahụ, ọ kọwara ọnọdụ ya dabeere na Bible nke ịjụ ịnara mminye ọbara. Ndị dọkịta ahụ kwenyere ịwa ahụ ahụ n’ejighị ọbara. Otú ọ dị, kpọmkwem tupu e buba ya n’ime ọnụ ụlọ a na-awa ahụ, ndị dọkịta gwara ya ka ọ bịanye aka n’otu akwụkwọ. O gosiri na ha dị njikere ịsọpụrụ mkpebi ya banyere ọbara, ma ọ bụrụ na ihe ndụ na ọnwụ eme, ha chọrọ ka o kwere ka ha nye ya ọgwụ ọ bụla ha chere dị mkpa.
Onye okenye ọgbakọ nke nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ na nwa nwoke Caridad, bụkwa Onyeàmà, nyere Caridad ndụmọdụ banyere ihe ga-esi n’ịbịanye aka na fọm ahụ pụta. Mbịanye aka ya gaara enyeworị ndị dọkịta ahụ ike iminye ya ọbara ma e nwee ọnọdụ ọnwụ na ndụ. Mgbe ndị ụlọ ọgwụ bịara ibuga ya n’ọnụ ụlọ a na-awa ahụ, ọ kọwara na ya agaghị abịanye aka n’akwụkwọ ahụ. N’ikpeazụ e bughachiri ya n’ọnụ ụlọ ya ma tinye ya n’okpuru nrụgide siri ike ịgbanwe obi ya.
Mgbe ọtụtụ mkwurịta okwu gasịrị ha kpebiri ịkpọ onye ọkà ikpe ka o wee mee ka o kwenye, ma ihe nile kụrụ afọ n’ala. Caridad kọwara na ya chere na ya ga-abụ onye ikpe mara n’ihu Chineke ma ọ bụrụ na o kwere ka ha mịnyere ya ọbara. Ọ rụtụrụ aka na n’okpuru Iwu Mosis, ọ bụrụ na e dinara nwanyị n’ike, e lere ya anya dị ka onye ikpe na-amaghị ma ọ bụru na o guzogidere ya site n’iti mkpu maka enyemaka. (Deuterọnọmi 22:23-27) “Ndị dọkịta na-eleghara ọchịchọ m anya ma na-agba mbọ imerụ akọ na uche m,” ka o kwuru, “ya mere m ga-eguzogide ya dị ka a ga-asị na ha na-edina m n’ike.”
Ọtụtụ hour gafere, n’ikpeazụ ndị dọkịta ahụ kwenyere ịwa ya ahụ n’ejighị ọbara. N’ọnụ ụlọ ahụ a na-awa ahụ, Caridad rịọrọ ka e nye ya ohere ikpeku Jehova ekpere. Nke ahụ ka o mere, ịwa ahụ ahụ gakwara nke ọma.
N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe nke ahụ gasịrị ọnọdụ Caridad dịwanyere njọ, ndị dọkịta ahụ kpebikwara ileghara ọchịchọ ya anya ma mịnye ya ọbara n’ike. Otú a, otu onye dọkịta na onye nọọsụ kwadebere ịmịnye ya ọbara. N’agbanyeghị ọnọdụ adịghị ike ya, Caridad ji ike ya nile guzogide ha. Ọbụna na o jisịrị ike tabie tub ebe ọbara ahụ si agafe. N’ikpeazụ, ihere ihe ha na-eme mere dọkịta ahụ nke ukwuu nke na ha kwụsịrị. “Agaghị m emeli ihe a. M na-achịli aka elu!” ka o kwuru.
Caridad lanarịrị ọgba aghara ahụ ma nwetaghachi ahụ ike ya n’enweghị nsogbu ọzọ. Ma ndị dọkịta ma ndị nọọsụ apụghị izere ịbụ ndị okwukwe na obi ike ya metụtara n’ụzọ dị omimi. Ihe ndị a nile mere mgbe Caridad dị 94 afọ.