Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 1/1 p. 3-4
  • Mgbe Ọwụwa Anyanwụ Zutere Ọdịda Anyanwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ọwụwa Anyanwụ Zutere Ọdịda Anyanwụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Site n’Ọwụwa Anyanwụ na Site n’Ọdịda Anyanwụ’
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Na-efe Ezi Ofufe—Olee Ebe Ha Si Bịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ikewa Ndị Mmadụ n’Ihe Iseokwu Alaeze ahụ
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 1/1 p. 3-4

Mgbe Ọwụwa Anyanwụ Zutere Ọdịda Anyanwụ

“OO, ỌWỤWA Anyanwụ bụ Ọwụwa Anyanwụ, Ọdịda Anyanwụ bụ Ọdịda Anyanwụ, ọ dịghịkwa mgbe ha abụọ ga-ezute.” Okwu ndị a nke onye Britain na-ede abụ uri bụ́ Rudyard Kipling na-echetara anyị ọdịiche ọdịnala miri emi ndị kewara ihe a kpọrọ mmadụ, nke so na-akpata mkpọrọmasị ebo, agbụrụ, na mba, nke na-etiwapụ n’akụkụ anyị nile taa. Ọtụtụ na-ajụ sị, Ọ̀ bụ na Chineke apụghị ime ihe banyere ọnọdụ a? Ee, ọ pụrụ! Ọ na-emekwa ihe ọbụna ugbu a! Ahịrị na-esonụ n’abụ uri Kipling zoro aka na nke a. Ruo ole mgbe ka a ga-ekewa Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ? Onye abụ uri ahụ sịrị: “Ruo mgbe Ala na Igwe guzoro n’ihu oké Ocheikpe Chineke n’isi nso.”

Chineke enyefewo ibu ọrụ nke ikpe ikpe n’aka Ọkpara ya, Jisọs Kraịst. (Jọn 5:​22-24, 30) Ma olee mgbe oge ikpe ahụ na-amalite? Òle ndị ka a ga-ekpe ikpe, gịnị ga-esikwa n’ime ya pụta? Ọ bụ Jisọs kọwara n’amụma agha ụwa ndị ahụ na ihe isi ike ha na ha so bụ́ ndị malitere iti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti n’afọ 1914. O kwuru na ndị a na-aka “ihe ịrịba ama” nke “ọnụnọ ya” a na-adịghị ahụ anya na “ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a” akara.​—⁠Matiu 24:​3-⁠8, NW.

Ná ngwụsị nke oké amụma nke a, Jisọs kọwara oge anyị bi n’ime ya ugbu a dị ka nke ikpe, na-ekwu banyere onwe ya, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: Ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri Ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.” N’ụzọ ihe atụ, a chịkọtawo ndị nile nke ụwa ugbu a n’ihu Onyeikpe ahụ, ha ga-azakwa ajụjụ maka ụzọ ha si zaghachi n’ozi nke nzọpụta ahụ. N’isi nso mgbe e mezuru ihe e kpere n’ikpe n’oké mkpagbu ahụ, ndị ahụ na-enupụ isi yiri ewu “ga-apụ jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi: ma ndị ezi omume [ndị na-erube isi yiri atụrụ] ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”​—⁠Matiu 25:​31-33, 46; Mkpughe 16:​14-⁠16.

‘Site n’Ọwụwa Anyanwụ na Site n’Ọdịda Anyanwụ’

Ikpe ụwa nke a malitere n’ezie n’afọ oké ihe isi ike ndị ahụ nke Agha Ụwa Mbụ. N’oge ahụ, ndị ụkọchukwu Krisendọm ji obi ha dum nye òtù dị iche iche na-eburịta agha nkwado. Nke a gosipụtara ha ịbụ akụkụ nke ụwa rụrụ arụ nke kwesịrị inweta “iwe Chineke.” (Jọn 3:36) Ma gịnị banyere ndị Kraịst na-ahụ udo n’anya bụ́ ndị tinyere okwukwe na Chineke? Na-amalite n’afọ 1919, a malitere ịchịkọta ndị a n’akụkụ Eze ahụ bụ́ Kraịst Jisọs.

Ha esiwo n’akụkụ nile nke ụwa bịa, na mbụ ndị fọdụrụ n’ime 144,000 ndị e tere mmanụ, ndị a họpụtara na narị afọ ndị na-agafenụ n’ime oge ndị Kraịst. Ndị a gaje ịbụ “ndị ha na Kraịst na-ekekọ” n’Alaeze eluigwe ya. (Ndị Rom 8:17) Onye amụma Chineke na-agwa ndị a, sị: “Atụla egwu; n’ihi na gị ka M nọnyeere: M ga-eme ka mkpụrụ gị si n’Ọwụwa anyanwụ bịa, M ga-esikwa n’Ọdịda anyanwụ chịkọta gị; M ga-asị Ugwu, Nye; sịkwa Ndịda, Egbochila: mee ka ụmụ m ndị ikom si n’ebe dị anya bịa, gị meekwa ka ụmụ m ndị inyom si ná nsọtụ ụwa bịa; onye ọ bụla nke a na-akpọ n’aha m, nke M kewokwara nye nsọpụrụ m; akpụwo m ya; ee, emewo m ya.”​—⁠Aịsaịa 43:​5-⁠7.

Ma ọ gwụbeghị ebe ahụ! Karịsịa malite n’afọ ndị 1930, a malitere ịchịkọta oké ìgwè mmadụ, ndị na-eru ugbu a ọtụtụ nde. Ndị a bụ “atụrụ” ahụ Jisọs zoro aka na ha na Matiu 25:​31-⁠46. Dị ka ihe fọdụrụ ahụ ná ndị e tere mmanụ tupu ha, ndị a malitere ‘ikwere’ n’Onye ahụ nke kwupụtara, sị: ‘Unu bụ ndị àmà m, mụ onwe m bụkwa Chineke.’ (Aịsaịa 43:​10-⁠12) Nchịkọta nke oké ìgwè mmadụ ndị a na-agakwa n’ihu ‘site n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site n’ugwu na ndịda, na site ná nsọtụ nile nke ụwa.’

A na-ejikọta atụrụ ndị a na-ahụ udo n’anya n’otu òtù ndị bụ ụmụnna nke zuru ụwa ọnụ. Ha na-asụ ọtụtụ asụsụ dị iche iche nke 231 mba ha bi n’ime ha. N’agbanyeghị nke ahụ ha dị n’otu n’ime mmụọ n’ịmụta ‘asụsụ ahụ dị ọcha’ nke ozi Alaeze nke Bible, “ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ùbú.” (Zefanaịa 3:9, NW) Ịdị n’otu ha ná nkwenkwe, nzube, na omume na-agba akaebe dị ebube nke na Ọwụwa Anyanwụ n’ezie ezutewo Ọdịda Anyanwụ, na ndị sitere n’akụkụ ndị ọzọ nile nke elu ala, maka ije ozi na otuto nke Eze Onyenwe anyị Jehova.

N’ala ụfọdụ nchịkọta nke a na-ewere ọnọdụ n’okpuru ọnọdụ ndị kasị dị ịrịba ama, dị ka akụkọ ndị na-esonụ ga-egosi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya