Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 1/1 p. 27
  • Iguzosi Ike Na-eweta Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iguzosi Ike Na-eweta Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ịzụlite Ụmụ Asatọ n’Ụzọ Jehova Na-eweta Ma Ihe Ịma Aka ma Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Nhọrọ M n’Etiti Nna Abụọ
    Teta!—1998
  • Ị̀ Na-enyere Nwa Gị Aka Ịhọrọ Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 1/1 p. 27

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Iguzosi Ike Na-eweta Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba

JISỌS buru amụma na a ga-esogbu ndị na-eso ụzọ ya, otú a kwa ka Pọl onyeozi kwuru, dị ka e depụtara ya na 2 Timoti 3:12: “Ee a ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” Ma iguzosi ike n’ife Jehova Chineke na-eweta ụgwọ ọrụ bara ụba.

◻ Nke a bụ eziokwu n’otu obodo nke dị n’ebe ugwu akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụsọ osimiri Malaysia. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye kwụsiri ike n’okpukpe Buddha nke ji aka ike na-ezi ụmụ ya ihe, otu onye bụ nna enweghị ike igbochi ụmụ ya ndị nwanyị atọ na ụmụ ya ndị nwoke atọ isoro Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ọbụna nwunye ya gosiri mmasị n’eziokwu ahụ. Mgbe ahụ n’otu ụbọchị otu onye agbata obi ya kwara ya emo, sị: “Olee otú ị na-apụghị ịchịkwata ụmụ gị wee hapụ ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova? Ụmụ m nile rapagidesiri ike n’ahụ m nakwa n’okpukpe Buddha nke nna anyị ha. I kwesịrị imere ebere!”

Nna ahụ ji ọsọ laa ụlọ na-aba mba na ya ga-eti nwanna nwanyị ahụ na-amụrụ ụmụ ya ihe ihe. Otú ọ dị, ụmụ ya mere ka iwe ya dajụọ ma gaakwa n’ihu n’isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible na-ejekwa nzukọ dị iche iche site ná nkwado nke nne ha.

Otú ọ dị, n’ikpeazụ, nna ahụ kpọkọtara ezinụlọ ahụ dum n’ihu ya. “Họrọnụ,” ka o kwuru, “n’etiti mụ na ịnọ n’ụlọ a na-abụ ndị Kraịst na ịhapụ ụlọ.” Nwa nwoke nke kasị mee okenye, bụ́ nwa okoro na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ, malitere ozugbo ịchịkọta ihe iji hapụ ụlọ. “Ee e!” ka nna ya tiri ná mkpu. “Ebe unu nile bụ ụmụ nnupụisi, ọ ga-aka mma ka m nwụọ.” O wee gbapụ n’ụlọ, ezinụlọ ahụ, bụ́ ndị na-arịọ ya ka ọ ghara igbu onwe ya, wee chụso ya. N’ihi mmetụta arịrịọ ha nwere n’ahụ ya, ọ laghachiri n’ụlọ.

Oge ụfọdụ gafere. Nna ha malitere ịhụ mmetụta dị mma nke eziokwu Bible na-enwe n’akparamagwa ụmụ ya. Otu ụbọchị o zutere enyi ya na-akwa ya emo, onye nọ ná mwute ugbu a, onye sịrị: “Nchekwube m nwere n’ebe ụmụ m nọ akụwo nnọọ afọ n’ala. Ha na-aghọgbu m, na-ezukwa m ohi.” Ma nna ahụ nke ụmụ ya so Ndịàmà Jehova na-amụ ihe sịrị: “Oo, ụmụ m dị iche! Ha na-emeso m n’ụzọ obi ọma nnọọ, ọbụna na ha enyewokwara m aka ịkwụghachi ụgwọ ego m na-akwụnye maka ụgbọ ala mgbe m na-enweghị ọrụ.”

Taa, ụmụ agbọghọ atọ ahụ na nne ha bụ ndị e mere baptism. Otu n’ime ụmụ ndị ikom ahụ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Gịnị banyere nna ahụ bụ ekwe ekwe nke na-ebu ọnụma na mbụ? O nwewo omume enyi ugbu a ma jeekwa Ememe Ncheta.

Jehova nyeghachiri nwa ya nwoke ahụ na ụmụnne ya nwanyị atọ tinyere nne ha ụgwọ ọrụ n’ihi iguzosi ike n’ihe nye Ya. Ha bụ ugbu a ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi, na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.​—⁠Ilu 27:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya