Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 2/15 p. 30
  • Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • MARCH
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 2/15 p. 30

Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị

MARCH

1. Ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị hụrụ ìhè ukwu: ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ, ìhè amụkwasịwo ha.—Aịsa. 9:2. w-IB 4/1/93 11, 12

2. Na-agbanarị agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa, na-agbasokwa ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.—2 Tim. 2:22. w-IB 4/15/93 6, 10, 11

3. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị.—Deut. 6:6. w-IB 11/1/92 7, 8

4. Uche gbagọrọ agbagọ nke mmadụ na-ekpu ụzọ ya ihu; ọ bụkwa imegide Jehova ka obi ya dị ọkụ.—Ilu 19:3. w-IB 11/15/92 9, 10a

5. Ọ dịghị onye dị ka gị n’etiti chi nile, Onyenwe anyị; ọ dịghịkwa ọrụ dị ka ọrụ gị nile.—Abụ Ọma 86:8. w-IB 12/15/92 14, 15

6. Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.—Jọn 8:12. w-IB 1/15/93 8, 10, 11

7. Jehova bụ Onyeikpe anyị, Jehova bụ Onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ Eze anyị; ya onwe ya ga-azọpụta anyị.—Aịsa. 33:22. w-IB 2/1/93 6, 8

8. Gịnị bụ uche gị, Saịmọn? Ndị eze ụwa, site n’aka olè ndị ka ha na-anara ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ n’isi mmadụ? N’aka ụmụ ha, ma ọ bụ n’aka ndị ọbịa?—Mat. 17:25. w-IB 10/15/92 15, 16a

9. Unu emekwala ihe ga-ewute mmụọ nsọ nke Chineke, bụ́ nke e ji kaa unu akara maka ụbọchị ntọhapụ site n’ihe mgbapụta.—Efe. 4:30, NW. w-IB 9/15/92 15, 17, 18a

10. Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị? Nke na-eme onwe ya ka ọ dị elu ịnọdụ dị ka eze, nke na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya.—Abụ Ọma 113:5, 6. w-IB 11/15/92 8, 9

11. Chetakwara obi gị [ntụaka ala ala peji, NW, “ị ghaghị ichetara uche gị” ], na Jehova, ya onwe ya bụ Chineke.—Deut. 4:39. w-IB 3/1/93 1-⁠3

12. Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, m gaghị enyekwa arụsị dị iche iche a pịrị apị otuto m.—Aịsa. 42:8. w-IB 1/15/93 7, 8, 10a

13. Mba nile ndị i meworo ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị, Onyenwe anyị; ha ga-asọpụrụkwa aha gị.—Abụ Ọma 86:9. w-IB 12/15/92 17

14. Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụru nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.—Mkpu. 4:11. w-IB 2/1/93 9-⁠11

15. Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, onye na-eme ka ọ na-aba ụba.—1 Kọr. 3:​6, 7. w-IB 9/1/92 11, 12a

16. Ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie; ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.—Jes. 5:15. w-IB 9/15/92 17, 18

17. Nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.—Efe. 5:33. w-IB 10/15/92 12, 13

18. Meere m amara, Chineke, dị ka ebere gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere gị nile si dị hichapụ njehie m nile.—Abụ Ọma 51:1. w-IB 3/15/93 10, 11

19. Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.—Mat. 28:19. w-IB 1/15/93 11, 12

20. Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, . . . mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.—Aịsa. 2:2. w-IB 4/1/93 5, 6

21. Ọmụma ihe na-afụli elu, ma ịhụnanya na-ewuli elu dị ka ụlọ.—1 Kọr. 8:1. w-IB 11/15/92 16, 17b

22. Jehova, tọọ ntị gị n’ala, za m, n’ihi na onye e wedara n’ala na ogbenye ka m bụ. Debe mkpụrụ obi m; n’ihi na onye ebere ka m bụ: gị onwe gị Chineke m, zọpụta ohu gị nke na-atụkwasị obi na gị.—Abụ Ọma 86:​1, 2. w-IB 12/15/92 3, 4

23. Ụmụntakịrị m, cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.—1 Jọn 5:21. w-IB 1/15/93 19, 21-⁠23a

24. Dị ka otu n’ime ndị inyom nzuzu si ekwu, otú a ka ị na-ekwu. Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ?—Job 2:10. w-IB 2/1/93 19

25. Ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ [n’ike nke na-akpali, NW] uche unu.—Efe. 4:23. w-IB 3/1/93 11, 12a

26. Onye ukwu ka ị bụ, ị na-arụkwa oké ọrụ dị iche iche: gị onwe gị bụ Chineke, nanị gị.—Abụ Ọma 86:10. w-IB 12/15/92 18-⁠20

27. Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.—Mat. 9:36. w-IB 4/1/93 8a

28. Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.—1 Kọr. 13:8. w-IB 2/15/93 15, 16

29. Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ̀ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?—Maịka 6:8. w-IB 4/15/93 18, 19

30. Mmehie e mehieworo ònye ga-aghọta ha? Gụọ m n’onye ikpe ihe nzuzo nile na-amaghị. Gbochiekwa ohu gị ná mmehie nganga; ekwela ka ha na-achị m: mgbe ahụ ka m ga-ezu okè, a ga-agụkwa m n’onye ikpe njehie hiri nne na-amaghị. Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu gị, Jehova, bụ́ Oké Nkume m, na Onye Mgbapụta m.—Abụ Ọma 19:12-⁠14. w-IB 11/15/92 5a

31. Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.—Efe. 6:1-⁠3. w-IB 10/15/92 17, 18

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya