Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 2/15 p. 31
  • Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • APRIL
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 2/15 p. 31

Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị

APRIL

1. Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu.—Hib. 13:17. w-IB 9/1/92 8

2. Ọ ga-achịkwa site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.—Zek. 9:10. w-IB 9/15/92 8, 9b

3. Gị onwe gị bụ Kraịst [Mesaịa] ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.—Mat. 16:16. w-IB 10/1/92 1, 2

4. Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.—Ilu 2:6. w-IB 11/1/92 10, 11

5. Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma m gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.—Mal. 3:10. w-IB 12/1/92 10, 15, 16a

6. Mgbe Israel siri n’Ijipt pụta, mgbe ụlọ Jekọb siri ná ndị na-atatọ okwu pụta; Juda ghọrọ ebe nsọ ya, Israel ghọrọ ala ọ na-achị.—Abụ Ọma 114:​1, 2. w-IB 11/15/92 12, 13

7. Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.—Efe. 6:4. w-IB 10/15/92 9, 10a

8. Devid wee nye Solomọn nwa ya ihe atụ . . . dị n’aka ya site ná mmụọ nsọ.—1 Ihe Eme. 28:​11, 12. w-IB 1/1/93 17, 18

9. Bilie, nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ gị dị ka anyanwụ. N’ihi na, lee, . . . n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.—Aịsa. 60:​1, 2. w-IB 1/15/93 15, 16

10. Napụta m n’aka ikpe ọmụma ọbara dị iche iche, Chineke, bụ́ Chineke nke nzọpụta m; ire m ga-eti mkpu ọṅụ banyere ezi omume gị.—Abụ Ọma 51:14. w-IB 3/15/93 12a

11. Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.—Gal. 6:1. w-IB 2/1/93 9, 10a

12. Meere m amara, Onyenwe anyị; n’ihi na gị ka m na-akpọku ogologo ụbọchị nile. Mee ka mkpụrụ obi ohu gị ṅụrịa; n’ihi na ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m na-ebuli mkpụrụ obi m nye.—Abụ Ọma 86:​3, 4. w-IB 12/15/92 6, 7

13. E kewo nwunye n’ahụ di ya ka oge di ya nọ ná ndụ hà; ma a sị na di ya adawo n’ụra ọnwụ, o nweere onwe ya ịlụ di ọ na-achọ; ma ọ bụ nanị n’ime Onyenwe anyị.—1 Kọr. 7:39. w-IB 2/15/93 3, 4a

14. Ka unu tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi unu na mbụ si dị.—Efe. 4:22. w-IB 3/1/93 8, 9a

15. Bịanụ, ka anyị laghachikwute Jehova . . . ka anyị gbasoo ịmara Jehova.—Hos. 6:​1-⁠3. w-IB 4/15/93 13, 14

16. Ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị hụrụ ìhè ukwu: ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ, ìhè amụkwasịwo ha.—Aịsa. 9:2. w-IB 4/1/93 12-⁠14

17. Otu ụbọchị abalị na ehihie ka m nọworo n’ime ogbu mmiri; n’ije ọtụtụ mgbe, n’ize ndụ site n’osimiri, . . . n’ize ndụ n’ime ọhịa, n’ize ndụ n’ime oké osimiri.—2 Kọr. 11:25, 26. w-IB 9/1/92 9

18. N’ihi aha gị, Jehova, gbaghara ajọ omume m, n’ihi na o hiri nne.—Abụ Ọma 25:11. w-IB 9/15/92 11, 12

19. Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?—Mat. 24:3, NW. w-IB 10/1/92 9, 10a

20. M ga-ala amamihe nke ndị maara ihe n’iyi, m ga-ajụkwa nghọta nke ndị nwere nghọta.—1 Kọr. 1:19. w-IB 11/1/92 13-⁠15a

21. Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.—Efe. 6:4. w-IB 10/15/92 9, 13, 14a

22. Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka o meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka o mesoworo anyị.—Abụ Ọma 103:10. w-IB 11/15/92 6a

23. Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m, . . . biko nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma m gaghị . . . [awụsara] unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.—Mal. 3:10. w-IB 12/1/92 10-⁠12a

24. Unu ga-anata ike, mgbe mmụọ nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.—Ọrụ 1:8. w-IB 1/1/93 6, 7a

25. Jehova, bụ́ Chineke gị, ọkụ na-eripịa eripịa ka ọ bụ, Chineke ekworo.—Deut. 4:24. w-IB 1/15/93 5, 13b

26. Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu: n’ihi na nke a bụ iwu na ndị amụma Chineke.—Mat. 7:12. w-IB 2/1/93 4, 5a

27. Ọ dị mma ịnọkwasị ná nkuku elu ụlọ, karịa ịnọnyere nwanyị na-ese okwu n’ụlọ buru ibu.—Ilu 21:9. w-IB 2/15/93 1, 2a

28. Ya mere nke a ka m na-ekwu, kwusiekwa ike n’ime Onyenwe anyị, ka unu ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa, n’ihe efu nke uche ha.—Efe. 4:17. w-IB 3/1/93 7, 8

29. Ana m emerị ka ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.—Abụ Ọma 32:5. w-IB 3/15/93 1, 8

30. N’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị. Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị.—Aịsa. 60:​2, 3. w-IB 4/1/93 9, 10

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya