Iso Ụzọ Kraịst Nọ n’Ọrụ n’Etiti Oké Ọgba Aghara
IHE nile malitere na mberede otu ụbọchị n’April 1994. Ụgbọelu kpọkasịrịnụ gburu president ndị Burundi na ndị Rwanda. N’ime hour ole na ole ime ihe ike nke na-atụ nnukwu ụjọ rikpuru Rwanda. N’ihe karịtụrụ ọnwa atọ, ihe karịrị ndị Rwanda 500,000—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka—anwụọla. Ụfọdụ mmadụ na-ezo aka n’oge ahụ dị ka “mgbukpọ nke agbụrụ.”
Ọkara nke nde 7.5 mmadụ bi na Rwanda aghaghị ịgbalaga. Nke a gụnyere nde 2.4 ndị chọtara ebe mgbaba ná mba ndị agbata obi ha. Ọ bụ mgbapụ kachasị ukwuu, kachasịkwa ngwa ngwa nke ndị na-agba ọsọ ndụ n’akụkọ ihe mere eme nke oge a. E guzobere ogige ndị gbara ọsọ ndụ ọkụ ọkụ na Zaire (nke bụ ugbu a Democratic Republic of Congo), Tanzania, na Burundi. Ụfọdụ n’ime ogige ndị a—ndị kasị ukwuu n’ụwa—nyere mmadụ 200,000 ebe obibi.
Ndị so ná ndị gbara ọsọ ndụ bụ ọtụtụ Ndịàmà Jehova, ndị na-ahụ udo n’anya, na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha. N’ala ọ bụla ha bi, ha na-anọpụ iche kpam kpam ma na-etinye n’ọrụ ụkpụrụ dị n’okwu ndị a nke Aịsaịa 2:4: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” A maara Ndịàmà Jehova n’ebe nile dị ka òtù okpukpe na-ekereghị òkè ná mgbukpọ agbụrụ ahụ na Rwanda.
Jisọs Kraịst kwuru na ụmụazụ ya “esiteghị n’ụwa.” Otú ọ dị, n’ihi na ha “nọ n’ụwa,” ha apụghị ịgbanahụ mgbe nile ọgba aghara nke mba dị iche iche. (Jọn 17:11, 14) N’oge mgbukpọ nke agbụrụ na Rwanda, ihe dị ka Ndịàmà 400 nwụrụ. Ihe dị ka Ndịàmà 2,000 na ndị nwere mmasị n’ozi Alaeze ahụ ghọrọ ndị gbara ọsọ ndụ.
Esiteghị n’ụwa, ọ̀ pụtara na Ndịàmà Jehova agaghị eme ihe ọ bụla mgbe ọdachi dara? Ee e. Okwu Chineke na-asị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị gba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri ga-ezuru ya kwa ụbọchị, ma otu onye n’etiti unu sị ha, Labanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ; ma unu enyeghị ha ihe na-akpa ahụ ha; uru gịnị ka ọ bara? Ọbụna otú a okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.” (Jemes 2:15-17) Ịhụnanya ndị agbata obi na-akpalikwa Ndịàmà inyere ndị na-ekweghị n’echiche okpukpe ha aka.—Matiu 22:37-40.
Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa nwere ọchịchọ inyere ndị kwere ekwe ibe ha na-eche ọnọdụ ọdachi ihu na Rwanda aka, e kenyere Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe ọrụ ịchịkọta ọrụ enyemaka ahụ. N’oge okpomọkụ nke 1994, otu ìgwè Ndịàmà wepụtara onwe ha n’afọ ofufo si Europe gbata inyere ụmụnna ha nwoke na nwanyị ndị Kraịst nọ n’Africa aka. A rụrụ ogige ndị a haziri nke ọma na ụlọ ọgwụ ndị a rụrụ n’ogige dị iche iche maka ndị Rwanda gbara ọsọ ndụ. E ji ụgbọelu ma ọ bụ ụzọ ndị ọzọ bugara ha ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ákwà, blanket, nri, na akwụkwọ e ji amụ Bible. Ihe karịrị mmadụ 7,000 o metụtara—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu atọ nke ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova na Rwanda n’oge ahụ—ritere uru site n’ọrụ enyemaka ahụ. Ka ọ na-erule December nke afọ ahụ, ọtụtụ puku ndị gbara ọsọ ndụ, tinyere ihe ka n’ọtụtụ ndị bụ Ndịàmà Jehova, laghachiri Rwanda ịmaliteghachi ndụ ha.
Agha na Congo
Na 1996, agha tiwapụrụ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Democratic Republic of Congo. Akụkụ nke a gbara Rwanda na Burundi agbata obi. E nwere ndina n’ike na ogbugbu mmadụ ọzọ. Ndị mmadụ gbara ọsọ ndụ ka mgbọ nọ na-efefe, ka obodo nta dị iche iche nọkwa na-agba ọkụ. E jibidoro Ndịàmà Jehova n’oké ọgba aghara ahụ, ihe dị ka 50 nwụkwara. Mgbọ ndị hiere ụzọ gburu ụfọdụ. E gburu ndị ọzọ n’ihi na ha so n’otu ìgwè agbụrụ ma ọ bụ na e chere na ha bụ ndị iro. E ji ọkụ bibie otu obodo nta Ndịàmà 150 bi. N’obodo nta ndị ọzọ a gbariri ọtụtụ ụlọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ n’ọkụ. N’ịbụ ndị a napụrụ ebe obibi na ihe onwunwe ha, Ndịàmà gbagara ebe ndị ọzọ wee nata enyemaka nke ndị ha na ha na-efekọ ofufe nọ n’ebe ahụ.
Agụụ na-esochi agha, ka a na-ebibi ihe ọkụkụ, kwakọrọ nri e chekwara echekwa, ma mechie ụzọ mbubata ihe. Nri e nwere na-adị oké ọnụ. Na Kisangani, ná mbido May 1997, otu kilogram poteto dara ihe dị ka dollar atọ, nke karịrị nnọọ ego ihe ka n’ọtụtụ mmadụ pụrụ inweta. Ihe ka n’ọtụtụ pụrụ iri nanị otu ugbo nri n’ụbọchị. Ọrịa na-esochikwa nnọọ ụkọ nri. Erighị ihe na-edozi ahụ na-ebelata ikike ahụ nwere ịlụso ịba, ọrịa afọ ọsịsa, na nsogbu afọ ọgụ. Ụmụaka karịsịa na-ata ahụhụ wee nwụọ.
Ịchọpụta Mkpa E Nwere
Ndịàmà Jehova na Europe mekwara ihe ọzọ n’egbughị oge igbo mkpa ahụ. Ka ọ na-erule April 1997 otu ìgwè Ndịàmà na-arụ ọrụ enyemaka nke gụnyere ndị dọkịta abụọ ejiriwo ụgbọelu bute ọgwụ na ego. Na Goma Ndịàmà nọ n’ebe ahụ ahaziworị kọmitii enyemaka ikpebi otú ọnọdụ dị ka e wee nwee ike inye aka ozugbo. Òtù ahụ nyochara obodo ukwu ahụ na ógbè ndị gbara ya gburugburu. E zipụrụ ndị ozi ịnata akụkọ site n’ebe ndị dị anya karị. A natakwuru ihe ọmụma site na Kisangani, nke dị ihe karịrị kilomita 1,000 n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Goma. Ụmụnna bi n’ebe ahụ nyere aka ịchịkọta ọrụ enyemaka na Goma, ebe ihe dị ka Ndịàmà 700 bi.
Otu n’ime ndị Kraịst bụ́ okenye na Goma kwuru, sị: “Ịhụ ụmụnna anyị gaworo ogologo njem otú a iji nyere anyị aka kpaliri anyị n’ụzọ miri emi. Tupu ha abịa, anyị nyeere ibe anyị aka. Ụmụnna aghaghị isi n’ime ime obodo gbata Goma. Ụfọdụ enwekwaghị ebe obibi, ha hapụkwara ubi ha. Anyị kpọbatara ha n’ụlọ anyị wee kerịta ákwà na obere nri anyị nwere. Ihe anyị pụrụ ime n’ógbè anyị dị obere. Ụfọdụ n’ime anyị adịghị eri nri na-edozi ahụ.
“Otú ọ dị, ụmụnna si Europe wetaara anyị ego nke nyeere anyị aka ịzụta nri, bụ́ nke dị ụkọ ma dị oké ọnụ. Nri ahụ rutere n’oge dị mkpa, ebe ọtụtụ na-enweghị ihe ọ bụla iri n’ụlọ ha. Anyị kesara nri ahụ nye ma Ndịàmà ma ndị na-abụghị Ndịàmà. Ọ bụrụ na enyemaka ahụ eruteghị mgbe o jiri rute, ọtụtụ ndị ọzọ gaara anwụ, karịsịa ụmụaka. Jehova zọpụtara ndị ya. O metụrụ ndị na-abụghị Ndịàmà nnọọ n’ahụ. Ọtụtụ kwuru okwu banyere ịdị n’otu na ịhụnanya anyị. Ụfọdụ kwenyere na nke anyị bụ ezi okpukpe ahụ.”
Ọ bụ ezie na a zụtara nri n’ógbè ahụ, nyekwa ọgwụ, a chọrọ ihe kanụ. E nwere mkpa maka ákwà na blanket, tinyere iwetakwu nri na ọgwụ. E nwekwara mkpa maka enyemaka iji wughachi ụlọ ndị e bibiworo.
Ndị Mmadụ Na-enye n’Ụba
Ụmụnna na Europe nwere oké mmasị inye aka ọzọ. Ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Louviers, France, kpọkuru ọgbakọ ndị dị na Ndagwurugwu Rhône nakwa na Normandy, na n’akụkụ ụfọdụ nke ógbè Paris. N’ebe a ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ batara: “Onye weere aka ntagide na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa aka ntagide na-ewe ihe ubi; onye werekwa ngọzi na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:6, 7.
Ọtụtụ puku ji ohere ahụ nye ihe n’ọṅụ. Akpati na akpa ákwà, akpụkpọ ụkwụ, na ihe ndị ọzọ nubatara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mgbe ahụ e wee buga ha n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na France. N’ebe ahụ ndị ọrụ afọ ofufo 400 dị njikere ikere òkè ná nkebi ọzọ nke ọrụ “Nyere Zaire Aka.” Ka ngwongwo ndị ahụ a tụkọtara na-enubata, ndị ọrụ afọ ofufo họrọ, pịa, ma tinye ákwà ndị ahụ n’ime akpati ndị a haziri 30 n’elu otu osisi. Ụmụaka echewo banyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ha na-eto eto n’Africa wee zigara ha ihe ndị e ji egwuri egwú—ụgbọ egwuregwu mara mma, okoso, nwa bebi, na anụ bear e ji owu kpaa. A kwanyekọrọ ihe ndị a na ihe ndị dị mkpa maka ndụ. Ná ngụkọta, a kwajuru igbe itoolu dị mita 12 wee buga ha na Congo.
Ihe enyemaka hà aṅaa ka e zigaworo Central Africa site n’enyemaka nke ọtụtụ puku Ndịàmà na Belgium, France, na Switzerland? Ka ọ na-erule June 1997, ngụkọta ya bụ kilogram 500 nke ọgwụ, tọn 10 nke biskit nwere nnukwu ọ̀tụ̀tụ̀ protein, tọn 20 nke nri ndị ọzọ, tọn 90 nke ákwà, akpụkpọ ụkwụ 18,500, na blanket 1,000. E bubatakwara akwụkwọ e ji amụ Bible. E nwere nnukwu ekele maka ihe a nile, na-akasi ndị gbara ọsọ ndụ obi, na-enyekwara ha aka idi ọnwụnwa ha. Ọnụ ahịa ihe ndị ahụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ngụkọta nke $1,000,000, U.S. Onyinye ndị dị otú ahụ bụ ihe àmà nke òtù ụmụnna na ịhụnanya dị n’etiti ndị na-efe Jehova.
Nkesa Ya na Congo
Ka ngwongwo ndị ahụ malitere irute Congo, ụmụnna nwoke abụọ na otu nwanna nwanyị si France bịa isoro kọmitii inyeaka ndị dị n’ógbè ahụ rụọ ọrụ. Banyere obi ekele ndị Congo bụ́ Ndịàmà gosiri, Joseline kwuru, sị: “Anyị natara ọtụtụ akwụkwọ ozi ekele. Otu nwanna nwanyị dara ogbenye nyere m ọla malachite. Ndị ọzọ nyere anyị foto ha. Ka anyị na-ala, ụmụnna nwanyị susuru m ọnụ, makụọ m, ma bee ákwá. Ebekwara m ákwá. Ọtụtụ kwuru okwu ndị dị ka ‘Jehova dị mma. Jehova na-eche banyere anyị.’ Ya bụ na ha matara na ekele maka onyinye a dịịrị Chineke. Mgbe anyị na-ekesa nri, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ji abụ Alaeze too Jehova. Ọ na-emetụ nnọọ n’ahụ.”
Otu dọkịta aha ya bụ Loic so n’òtù ahụ. Ọtụtụ gbakọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma jiri ndidi chere ka o ruoro ha ịnata enyemaka ya. N’ịchọ iso kere òkè, otu nwanna nwanyị onye Congo ghere ma kenye ndị na-echere ịhụ dọkịta ihe dị ka donọt 40. Ebe ihe dị ka ndị mmadụ 80 na-echere, onye ọ bụla natara ọkara otu donọt.
Enyemaka Nye Ndị Na-abụghị Ndịàmà
E nyeghị nanị Ndịàmà Jehova enyemaka obi ebere a. Ndị ọzọkwa ritere uru, dị nnọọ ka ọtụtụ ritere na 1994. Nke a kwekọrọ ná Ndị Galetia 6:10, nke na-asị: “Ya mere otú a, otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
Ndịàmà kesara ọgwụ na ákwà nye ọtụtụ ụlọ akwụkwọ praịmarị na otu ogige ụmụ mgbei dị na nso Goma. Ogige ụmụ mgbei ahụ bụ ebe obibi ụmụaka 85. Na njem bu ụzọ iji chọpụta otú ọnọdụ dị, ndị òtù enyemaka ahụ letara ogige ụmụ mgbei ahụ wee kwe ha nkwa ibunye ha igbe biskit 50 nwere nnukwu ọ̀tụ̀tụ̀ protein, akpati ákwà, blanket 100, ọgwụ, na ihe ndị e ji egwuri egwú. Ụmụaka ahụ kwụrụ n’ahịrị n’ime ogige ahụ wee kweere ndị ọbịa ahụ ukwe. Mgbe nke ahụ gasịrị ha rịọrọ arịrịọ pụrụ iche—hà pụrụ inweta otu bọl ka ha wee nwee ike ịgba bọl?
Mgbe ọtụtụ izu gasịrị ndị òtù enyemaka ahụ mezuru nkwa ha ibute ihe. N’ịbụ onye mmesapụ aka ahụ na ihe ọ gụtara n’akwụkwọ e ji amụ Bible e nyeworo ya masịrị, onye ntụzi ogige ụmụ mgbei ahụ kwuru na ya nọ n’ụzọ ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. È nyekwaranụ ụmụaka ahụ otu bọl? “Ee e,” ka Claude, onye nchịkọta ndị òtù enyemaka ahụ si France na-aza. “Anyị nyere ha bọl abụọ.”
Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
Enyemaka akwụsịghị na Congo. Ọtụtụ puku ndị gbara ọsọ ndụ esiwo ebe a na-alụ agha gbaga mba dị nso ebe e guzobeworo ogige ndị gbara ọsọ ndụ atọ ọkụ ọkụ. Ndịàmà gakwuru ebe ahụ, ka e wee mara ihe a pụrụ ime. Mgbe a chịkọtara akụkọ a, mmadụ 211,000 gbara ọsọ ndụ bi n’ogige ahụ, ihe ka n’ọtụtụ si Congo. Ihe dị ka 800 bụ Ndịàmà na ụmụ ha tinyere ndị nwere mmasị n’ozi ọma Alaeze ahụ. Nsogbu e nwere mgbe ahụ n’ogige ndị ahụ bụ ụkọ nri. N’otu ogige, e nwere nri ga-ezu maka nanị ụbọchị atọ, ọ gụnyekwara àgwà nọworo afọ atọ.
Ka o sina dị, obi dị Ndịàmà mma. N’agbanyeghị na ha nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ole na ole, ha duziri nzukọ chiri anya n’èzí iji wulie onwe ha elu n’ime mmụọ. Ha jikwa ọrụ n’aka ikwusara ndị ọzọ n’ogige ahụ ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25.
Òtù nchọpụta ahụ nke Ndịàmà gụnyere otu dọkịta. N’agbanyeghị na ndị ọchịchị kwere ka ha nọọ nanị ụbọchị ole na ole n’ogige ọ bụla, ha na ndị na-arịa ọrịa kwurịtara okwu. Ha hapụụrụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ọgwụ na ego. N’ụzọ dị otú a, ụmụnna ahụ nwere ike ịlanarị. Ha nwekwara olileanya na Ndịàmà nọ n’ogige ndị ahụ pụrụ ịlaghachi n’ala nke aka ha n’oge na-adịghị anya.
Olee banyere ọdịnihu? Jisọs Kraịst buru amụma na ụbọchị anyị ga-abụ nke oké ọgba aghara, oge agha na ụkọ nri kara akara. (Matiu 24:7) Ndịàmà Jehova maara na ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-eweta ahụhụ dị n’ụwa ugbu a ná ngwụsị. N’okpuru ịchịisi ya, ebe obibi anyị bụ ụwa ga-aghọ paradaịs nke udo, ụbara ihe, na nke obi ụtọ na-adịru ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. (Abụ Ọma 72:1, 3, 16) Ka ọ dị ugbu a, Ndịàmà ga-akpọsa ozi ọma Alaeze eluigwe, ha ga-anọgidekwa na-enyere ndị ofufe ibe ha na ndị ọzọ aka n’oge mkpa.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Kemgbe 1994, Ndịàmà Jehova na Europe nanị ezigawo ihe karịrị tọn 190 nke nri, ákwà, ọgwụ, na ihe enyemaka ndị ọzọ n’ebe Oké Ọdọ Mmiri nke Africa
[Igbe dị na peeji nke 6]
E Tinye Ịhụnanya Ndị Kraịst n’Ọrụ
Otu onye so ná ndị ji oké mmasị kere òkè n’ọrụ “Nyere Zaire Aka” na France bụ Ruth Danner. Mgbe ọ bụ nwata, a tụrụ ya mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi n’ihi okwukwe ndị Kraịst ya. O kwuru, sị: “Obi dị anyị nnọọ ụtọ ime ihe maka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị anyị n’Africa! Ma ọ dị ihe mere ka m nwee nnukwu obi ụtọ. Na 1945, mgbe anyị si Germany lọta ụlọ, anyị enweghị ihe ọ bụla ma ọlị. Ọbụna na a gbazitere uwe anyị yi agbazite. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, anyị nwetara enyemaka anụ ahụ site n’aka ụmụnna ime mmụọ anyị n’America. Ya mere ọrụ enyemaka a nyere m ohere ịkwụghachi obiọma e gosiri anyị ogologo oge gara aga. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịbụ akụkụ nke ụdị nnukwu ezinụlọ dị otú a nke ụmụnna ndị na-etinye ịhụnanya ndị Kraịst n’ọrụ!”—Jọn 13:34, 35.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
N’isi nso—paradaịs elu ala nke nwere ụbara ihe maka mmadụ nile