Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/1 p. 3-4
  • Ọtụtụ Na-asị na Ha Nwere Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọtụtụ Na-asị na Ha Nwere Okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aha Jisọs Taa
  • Aha nke Na-eduga n’Ezi Okwukwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Otú Jizọs Jiruru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Otú Anyị Kwesịrị Ijiru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/1 p. 3-4

Ọtụtụ Na-asị na Ha Nwere Okwukwe

“JISỌS dị ebube! Ọ dị nnọọ egwu!” ka otu nwanyị ji okpukpe kpọrọ ihe na Brazil tipụrụ. N’ezie, a pụghị ịgọnahụ ike nke aha Jisọs. N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị mmadụ ejiriwo ọchịchọ obi taa ahụhụ ma nwụọ maka Jisọs.

Ndị ozi bụ́ Pita na Jọn mere nkwusa ‘n’aha Jisọs’ n’ime Jerusalem. N’ihi ime nke ahụ, e jidere ha, pịakwa ha ihe. Ma ha “siri n’ihu nnọkọ ikpe ahụ laa, na-aṅụrị na a gụrụ ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi Aha ahụ.”—Ọrụ 5:28, 41.

Antipas bụ onye Kraịst narị afọ mbụ ọzọ nke ji aha Jisọs kpọrọ ihe. N’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, Jisọs zoro aka n’ebe ọ nọ dị ka “onye àmà m, onye nke m kwesịrị ntụkwasị obi, onye e gburu n’etiti unu, ebe Setan bi.” (Mkpughe 2:13) Tinyere ndị Kraịst ndị ọzọ nọ na Pagamọm, Antipas jụrụ ịgọnahụ okwukwe o nwere n’ebe Kraịst nọ. Antipas jigidesiri aha Jisọs ike ọbụna tụfuo ndụ ya n’ihi ya!

Ihe dị ka afọ iri ise mgbe e mesịrị, na 155 O.A., otu onye sị na ya bụ onye Kraịst aha ya bụ́ Polycarp chere ule yiri nke ahụ ihu mgbe e nyere ya iwu ka o kwutọọ Kraịst. Nzaghachi ya bụ: “Ejeworo m Ya ozi ruo afọ 86, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla O meworo m. Olee otú m pụrụ isi kwuluo Eze m bụ́ onye zọpụtaworo m?” N’ihi ọjụjụ ọ jụrụ ịgọnahụ Kraịst, a gbara Polycarp ọkụ n’elu osisi.

Ndị ozi, Antipas, na ndị ọzọ dị njikere ịkwado àmà ha na-agba banyere Kraịst site n’ịnwụ! Gịnị banyere ndị mmadụ taa?

Aha Jisọs Taa

Aha Jisọs na-anọgide na-akpali mmetụta uche ndị siri ike. Na Latin America, mmụba nke chọọchị ndị na-asị na ha kweere na Jisọs adịwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya. Ọbụna obodo ndị dịkarịsịrị nta nwere chọọchị Pentikọstal. N’otu oge ahụ, mmetụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke chọọchị ndị dị otú ahụ na-arị elu. Dị ka ihe atụ, ná Nnọkọ na Nzukọ Ndị Ome Iwu nke Brazil, ndị òtù chọọchị ndị a nwere ọnọdụ 31.

Jisọs bụkwa onye otu òtù okpukpe ọhụrụ dị na United States lekwasịrị anya. Ndị òtù ya na-akpọ onwe ha Ndị Na-emezu Nkwa. Magazin bụ́ Time kọrọ na 1997 na ndị na-aga nzukọ ha mụbara site na 4,200 na 1991 ruo 1.1 nde na 1996. Otu n’ime ukwe ya na-asị: “Oo mmeri n’ime Jisọs, bụ́ Onye Nzọpụta m ruo mgbe ebighị ebi.”

Otú ọ dị, ọ bụghị mmetụta nile nke aha Jisọs kpaliworo bụ ndị ziri ezi. A lụwo agha mgbe mgbe n’aha ya. E gbuchapụwo ndị Juu, gbuo ndị ọgọ mmụọ, taa ndị na-enupụ isi ahụhụ, bekasịa ha ahụ, gbaakwa ha ọkụ n’elu osisi—ihe a nile n’aha Jisọs. N’oge na-adịbeghịkwa anya, iji okwuchukwu agba mgbere abụrụwo ihe na-ewu ewu. Ihe ndị a nile bụ iji aha Jisọs na ihe ọ pụtara n’ezie eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma jọgbuo onwe ya!

Ọzọkwa, ọ na ewelite ajụjụ ụfọdụ bara uru: Gịnị ka inwe okwukwe n’aha Jisọs gụnyere? Gịnịkwa bụ echiche Ndịàmà Jehova n’okwu a? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya