Ị̀ Bụ Onye Nwere Ekele?
N’otu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị n’Ọdịda Anyanwụ Africa, e nwere otu nkịta nọburu ebe ahụ aha ya bụ Teddy. Mgbe mmadụ tụọrọ Teddy otu ọkpụrụkpụ anụ, o loro ya ozugbo, n’anụghị ụtọ ya, n’ataghị ya ata. Ka ọ nọ na-eku ume ọkụ ọkụ n’anwụ nke ebe okpomọkụ, ọ nọ na-echere ka a tụpụrụ ya ọzọ. Mgbe anụ ahụ gwụrụ, ọ tụgharịrị pụwa.
Teddy egositụghị ekele maka ihe o nwetara. Ọ dịghị onye tụrụ anya ka o mee otú ahụ. E kwuwerị, ọ bụ nkịta efu.
N’IHE banyere inwe ekele, anyị na-atụkarị anya ihe ka ukwuu site n’aka mmadụ ibe anyị karịa ka anyị na-atụ site n’aka ụmụ anụmanụ. Anyị adịghị enwetakebe ihe anyị tụrụ anya ya. Ọtụtụ ndị na-adọbita ihe ọ bụla ha nwere ike ịdọbita ná ndụ ma na-achọkwu ọzọ. Nke a kwa abụghị ihe ijuanya. Bible buru amụma na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-enweghị ekele na mgbe ikpeazụ.—2 Timoti 3:1, 2.
Otú ọ dị, ndị ohu Chineke nwere mmụọ dị iche. Ha na-aṅa ntị na ndụmọdụ Pọl onyeozi, bụ́ onye dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Bụrụkwanụ ndị [nwere, NW] ekele.”—Ndị Kọlọsi 3:15.
Jehova Bụ Onye Na-enwe Ekele
Jehova Chineke na-esetịpụ ihe nlereanya zuru okè n’igosi ekele. Tụlee otú o si ele ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi anya. Pọl, site n’ike mmụọ nsọ, degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.”—Ndị Hibru 6:10.
E nwere ọtụtụ ihe atụ banyere ekele Jehova nwere maka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ gọziri Abraham site n’ime ka ụmụ ya mụbaa, nke na ha dị ka “kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jenesis 22:17) Iji gosi ekele maka ikwesị ntụkwasị obi Job n’oge ule, ọ bụghị nanị na Jehova weghachiri oké akụ̀ na ụba Job kamakwa o nyere ya “okpukpu abụọ.” (Job 42:10) Mmeso Jehova mesoworo ụmụ mmadụ kemgbe ọtụtụ narị afọ iri egosiwo ịbụ eziokwu nke okwu bụ́: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 16:9.
Ekele Chineke nwere maka ndị na-achọ ime uche ya na ọchịchọ ya inye ha ụgwọ ọrụ bụ akụkụ ndị bụ́ isi nke ụdị onye ọ bụ. Ịmata nke a dị oké mkpa n’okwukwe ndị Kraịst. Pọl dere, sị: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe . . . na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachị ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.
Ọ bụrụ na Jehova kama ime otú ahụ egosi mmụọ obi ọjọọ, nke nkatọ, a ga-ama anyị nile ikpe. Onye ọbụ abụ kwuru nke a eri ogologo oge gara aga, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Jehova abụghị onye na-adịghị enwe ekele ma ọ bụ onye nkatọ. O ji ndị na-efe ya kpọrọ ihe. Ọ na-enwe ekele.
Jisọs—Onye Na-enwe Ekele nke Ukwuu
N’iṅomi àgwà Nna ya nke eluigwe n’ụzọ zuru okè, Jisọs Kraịst bụ onye na-enwe ekele maka ihe ndị ọzọ ji okwukwe mee. Tụlee ihe mere n’otu oge n’ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem: “[Jisọs] wee lee anya n’elu, hụ ndị ọgaranya ka ha na-atụba onyinye ha n’ebe a na-edebe ụtụ a na-atụ. O wee hụ otu nwanyị, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ka ọ na-atụba n’ebe ahụ ego nta abụọ. O wee sị, N’ezie asị m unu, Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ha nile: n’ihi na ndị a nile sitere n’inwebiga akụ̀ ókè ha tụba n’onyinye: ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.”—Luk 21:1-4.
N’ile ya anya n’ụzọ ego, onyinye ahụ dị ntakịrị, karịsịa ma e jiri ya tụnyere nke ndị ahụ bara ọgaranya. Ihe ka ukwuu ná ndị nọ n’ebe ahụ agaraghị ahụ ya. Ma, Jisọs hụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Ọ ghọtara ọnọdụ ya. Jisọs hụrụ ya ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ.
Ihe ọzọ merenụ bụ banyere otu nwanyị bara ọgaranya, bụ́ Meri. Ka Jisọs nọ n’otu oriri, ọ wụsara mmanụ dị oké ọnụ ahịa nke na-esi ísì ụtọ n’ụkwụ Jisọs na n’isi ya. Ụfọdụ katọrọ ihe o mere, na-eche na a gaara ereworị mmanụ ahụ ma jiri ego ahụ nyere ndị ogbenye aka. Gịnị ka Jisọs mere? Ọ sịrị: “Hapụnụ ya; gịnị mere unu na-esogbu ya? ọ rụrụ ọrụ ọma n’ahụ m. Ma n’ezie asị m unu, Ebe ọ bụla a ga-ekwusa ozi ọma nke a n’ụwa dum, a ga-ekwutakwa ihe nke nwanyị a mere, ka ọ bụrụ ihe ncheta ya.”—Mak 14:3-6, 9; Jọn 12:3.
Jisọs akwaghị ụta n’ụzọ nkatọ na a gaara eji mmanụ ahụ dị oké ọnụ ahịa mee ihe ọzọ. O nwere ekele maka ịhụnanya Meri n’ụzọ mmesapụ aka na okwukwe ya. E dekọrọ ihe ahụ merenụ n’ime Bible dị ka ihe ncheta nke ọrụ ọma ya. Ihe ndekọ ndị a na ndị ọzọ na-egosi na Jisọs bụ nwoke na-enwe ekele nke ukwuu.
Ọ bụrụ na ị bụ ohu Chineke, ị pụrụ ijide n’aka na ma Jehova Chineke ma Jisọs Kraịst nwere ekele dị ukwuu ná mgbalị gị ịkwalite ofufe dị ọcha. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-adọta anyị nso n’ebe ha nọ ma na-akpali anyị iṅomi ha site n’ịbụ ndị na-enwe ekele.
Mmụọ Ime Nkatọ nke Setan
Ugbu a ka anyị tụlee otu ihe atụ nke onye na-adịghị enwe ekele—Setan bụ́ Ekwensu. Enweghị ekele nke Setan so kpata mkpali ọ kpaliri nnupụisi wetara ọdachi megide Chineke.
Ebe ọ zụliteworo mmụọ dị njọ nke enweghị afọ ojuju n’ime onwe ya, Setan malitere ịkụnye ya n’ime ndị ọzọ. Tụlee ihe ndị mere n’ogige Iden. Jehova kere nwoke na nwanyị mbụ, tinye ha n’ogige bụ́ paradaịs, wee sị ha: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri.” E nwere nanị otu ihe a machibidoro iwu. Chineke sịrị: “Ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.”—Jenesis 2:16, 17.
Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Setan mara Jehova ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi aka. N’otu akụkụ, ọ chọrọ ime ka Iv ghara inwe ekele nye Jehova nke na a ga-akpali ya inupụrụ ya isi, ọbụna dị ka Setan n’onwe ya nupụworo isi. “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” ka Setan jụrụ. (Jenesis 3:1) N’ụzọ doro anya ihe ọ pụtara bụ na Chineke na-anapụ Iv ihe dị oké ọnụ ahịa, ihe ga-emeghe anya ya ma mee ya ka o yie Chineke n’onwe ya. Kama inwe ekele maka ọtụtụ ngọzi Jehova wụkwasịworo ya, Iv malitere inwe agụụ maka ihe a machibidoro iwu.—Jenesis 3:5, 6.
Ihe ọjọọ ndị si na ya pụta doro anya. Ọ bụ ezie na e nyere ya aha bụ́ Iv “n’ihi na nwanyị ahụ bụ nne mmadụ nile nwere ndụ,” n’echiche ọzọ ọ ghọrọ nne mmadụ nile na-anwụ anwụ. Mmadụ nile eketawo mmehie na-eweta ọnwụ site n’aka Adam.—Jenesis 3:20; Ndị Rom 5:12.
Ṅomie Chineke na Kraịst
Tụlee ọdịiche dị n’etiti Setan na Jisọs. A kọwara Setan dị ka “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị.” (Mkpughe 12:10) Jisọs ‘pụkwara ịzọpụtachasị ndị na-esite n’aka Ya abịakwute Chineke, ebe Ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ n’ihi ha.’—Ndị Hibru 7:25.
Setan na-ebo ndị ohu Chineke ebubo. Jisọs nwere ekele n’ebe ha nọ ma na-arịọchitere ha arịrịọ. Dị ka ndị na-eṅomi Kraịst, ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị ịchọ ihe dị mma n’ime ibe ha, na-enwe ekele ma na-eji ibe ha akpọrọ ihe. N’ime otú ahụ, ha na-egosi na ha nwere ekele nye onye ahụ nke na-esetịpụ ihe nlereanya kasịnụ n’inwe ekele, bụ́ Jehova Chineke.—1 Ndị Kọrint 11:1.
[Foto dị na peeji nke 17]
Jisọs gosiri ekele maka ọrụ ọma Meri