Ndị Okpukpe Collegiant—Ọmụmụ Bible Mere Ka Ha Dị Iche
Ị̀ nụtụwo banyere ndị okpukpe Collegiant?
Obere òtù okpukpe ndị Holland a nke dịrị na narị afọ nke 17 dị iche na chọọchị ndị bụ́ isi n’oge ahụ. N’ụzọ dị aṅaa, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta n’aka ha? Iji chọpụta, ka anyị laghachi azụ n’oge gara aga.
NA 1587, Jacobus Arminius (ma ọ bụ, Jacob Harmensen) bịarutere n’obodo Amsterdam. O sighịrị ya ike ịchọta ọrụ, n’ihi na akwụkwọ iru eru ya dị mma nke ukwuu. Mgbe ọ dị afọ 21, ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Leiden nke Holland. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nọrọ afọ isii na Switzerland, na-amụ nkà mmụta okpukpe n’okpuru Théodore de Bèze, bụ́ onye nọchiri Onye Protestant Na-eme Mgbanwe bụ́ John Calvin. Ka a sịkwa ihe mere obi ji dị ndị Protestant nọ n’Amsterdam ụtọ ịhọpụta Arminius dị afọ 27 dị ka otu n’ime ndị pastọ ha! Otú ọ dị, afọ ole na ole mgbe e mesịrị, ọtụtụ ndị òtù chọọchị kwara ụta banyere nhọrọ ha mere. N’ihi gịnị?
Okwu Banyere Akara Aka
N’oge na-adịghị anya mgbe Arminius ghọsịrị otu n’ime ndị pastọ ha, esemokwu bilitere n’etiti ndị Protestant nọ n’Amsterdam banyere ozizi akara aka. Ozizi a ghọrọ akụkụ bụ́ isi nke okpukpe Calvin, ma ụfọdụ ndị òtù chọọchị chere na Chineke nke buworo ụzọ kaa ya aka na ụfọdụ ndị ga-enweta nzọpụta, na ndị ọzọ ga-enwetakwa ntaramahụhụ nwere obi ọjọọ ma bụrụ onye na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi. Ndị òtù okpukpe Calvin tụrụ anya na ebe Arminius bụ nwa akwụkwọ Bèze, na ọ ga-agbazi ndị ahụ nwere echiche dị iche olu. Otú ọ dị, kama nke ahụ, Arminius dụnyeere ndị ahụ nwere echiche dị iche úkwù, n’ụzọ juru ndị òtù okpukpe Calvin anya. Ka ọ na-erule 1593 esemokwu ahụ eruola n’ókè nke na o kewara ndị Protestant nọ n’obodo ahụ ụzọ abụọ—ndị kwadoro ozizi ahụ na ndị jụrụ ya, bụ́ ndị nwere echiche dị iche.
N’ime afọ ole na ole, esemokwu a e nwere n’ógbè ahụ kpatara nkewa zuru mba ọnụ n’etiti ndị Protestant. N’ikpeazụ, na November 1618 ọnọdụ ahụ ruru na nke izute ihu na ihu. Ndị òtù okpukpe Calvin, bụ́ ndị ndị agha na ọha na eze kwadoro, kpụpụrụ ndị ahụ nwere echiche dị iche (ndị a na-akpọbu Ndị Mmegidea) na kansụl mba ahụ, bụ́ Nzukọ Ndị Isi Protestant nke Dordrecht. Ná ngwụsị nke nzukọ ahụ, a gwara ndị ụkọchukwu nile nke Ndị Mmegide ka ha mee nhọrọ: Ịbịanye aka n’akwụkwọ na ha agaghị eme nkwusa ọzọ ma ọlị, ma ọ bụ ha isi ná mba ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị họọrọ ibi n’ala ọzọ. Ndị ụkọchukwu na-agbasosi ụkpụrụ ike bụ́ ndị òtù Calvin nọchiri ndị ụkọchukwu nke Ndị Mmegide ahụ pụrụ apụ. Ikpe alaarala okpukpe Calvin—ma ọ dịghị ihe ọzọ otú ahụ ka nzukọ ndị isi chọọchị ahụ chere.
Mmalite na Uto nke Ndị Okpukpe Collegiant
Dị ka ọ dị n’ebe ndị ọzọ, ọgbakọ Ndị Mmegide nke dị n’obodo nta bụ́ Warmond, na nso nso Leiden, enweghịzi pastọ. Otú ọ dị, n’adịghị ka ebe ndị ọzọ, ọgbakọ ahụ anabataghị onye nzukọ ndị isi chọọchị kwadoro ka ọ nọchie ya. Ọzọkwa, mgbe otu onye ụkọchukwu nke Ndị Mmegide tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ịlọta Warmond na 1620 iji lekọta ọgbakọ ahụ, ụfọdụ ndị òtù ọgbakọ ahụ jụkwara ya. Ndị òtù ọgbakọ a amalitela inwe nzukọ okpukpe ha na nzuzo n’enweghị enyemaka nke onye ụkọchukwu ọ bụla. Ka oge na-aga, a kpọrọ nzukọ ndị a kọleji, a kpọkwara ndị na-aga ha, ndị okpukpe Collegiant.
Ọ bụ ezie na ọ bụ ọnọdụ e nwere mere ka ndị okpukpe Collegiant malite kama ịbụ ụkpụrụ, ihe gbanwere n’oge na-adịghị anya. Onye òtù ọgbakọ ahụ bụ́ Gijsbert van der Kodde rụrụ ụka na site n’izukọ n’enweghị ndị ụkọchukwu na-elekọta ha, ìgwè ahụ na-agbaso ụkpụrụ Bible nakwa ụzọ nke ndị Kraịst oge mbụ karịa chọọchị ndị bụ́ isi. O kwuru na e chepụtara òtù ndị ụkọchukwu mgbe ndị ozi nwụsịrị iji kepụtara ndị ikom na-achọghị ịmụ ọrụ, ọrụ.
Na 1621, Van der Kodde na ndị ha na ya nwere otu echiche bufere nzukọ ha n’obodo nta dị nso bụ́ Rijnsburg.b Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, mgbe mkpagbu okpukpe nyere ohere maka ikwe ibe nọrọ, akụkọ banyere nzukọ nke ndị okpukpe Collegiant gbasara ebe nile ná mba ahụ ma dọta “ụdị mmadụ dị iche iche,” dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Siegfried Zilverberg si kwuo. Ha bụ Ndị Mmegide, ndị òtù okpukpe Mennon, ndị òtù okpukpe Socinus, na ọbụna ndị ọkà mmụta okpukpe. Ụfọdụ bụ ndị ọrụ ugbo. Ndị ọzọ bụ ndị na-ede uri, ndị na-ebi akwụkwọ, ndị dibịa bekee, na ndị ahịa. Ọkà ihe ọmụma bụ́ Spinoza (Benedictus de Spinoza) na onye nkụzi bụ́ Johann Amos Comenius (ma ọ bụ, Jan Komenský), nakwa onye a ma ama na-ese ihe bụ́ Rembrandt van Rijn, kwadoro òtù ahụ. Echiche dị iche iche nke ndị a na-eme nsọ nsọ ji bịa nwere mmetụta ná nguzobe nke nkwenkwe okpukpe Collegiant.
Mgbe afọ 1640 gasịrị, ìgwè a dị ike mụbara ngwa ngwa. Ìgwè a mụbara ngwa ngwa na Rotterdam, Amsterdam, Leeuwarden, na n’obodo ndị ọzọ. Prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme bụ́ Andrew C. Fix kwuru na n’agbata afọ 1650 na 1700, “ndị okpukpe Collegiant . . . mụbara wee ghọọ otu n’ime òtù okpukpe ndị kasị mkpa na ndị a kasị mara na Holland nke narị afọ nke iri na asaa.”
Nkwenkwe Ndị Okpukpe Collegiant
Ebe inwe ọgụgụ isi, ikwe ibe nọrọ, na nkwuwa okwu bụ ihe ndị e ji mara okpukpe ndị Collegiant, ndị okpukpe Collegiant n’otu n’otu nweere onwe ha inwe nkweta dịgasị iche. N’agbanyeghị nke ahụ, nkweta ụfọdụ ha nwekọrọ ọnụ jikọtara ha. Dị ka ihe atụ, ndị okpukpe Collegiant nile ghọtara ịdị mkpa nke ọmụmụ Bible onwe onye. Onye òtù nke ọ bụla, ka otu onye okpukpe Collegiant dere, kwesịrị “ime nnyocha n’onwe ya, ọ bụghịkwa isi n’aka onye ọzọ mara Chineke.” Ha mere otú ahụ. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere banyere chọọchị na narị afọ nke 19 bụ́ Jacobus C. van Slee si kwuo, ndị okpukpe Collegiant nwere ihe ọmụma banyere Bible karịa òtù okpukpe ndị ọzọ n’oge ahụ. Ọbụna ndị na-emegide ndị okpukpe Collegiant toro ha maka ikike ha nwere n’iji nkà jiri Bible na-eme ihe.
Otú ọ dị, ka ndị okpukpe Collegiant na-amụkwu Bible, otú ahụ ka ha na-enwekwu nkweta ndị dị iche ná nke chọọchị ndị bụ́ isi nwere. Ihe ndekọ ndị e dere laa azụ na narị afọ nke 17 ruo na nke 20 na-akọwa ụfọdụ n’ime nkwenkwe ha:
Chọọchị Oge Gboo. Onye okpukpe Collegiant nakwa ọkà mmụta okpukpe bụ́ Adam Boreel dere na 1644 na mgbe chọọchị oge gboo tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’oge Eze Ukwu Constantine, o mebiri ọgbụgba ndụ ya na Kraịst, kwụsịkwa inwe nduzi mmụọ nsọ. Ọ gbakwụnyere na n’ihi ya, ozizi ụgha mụbara ma dịgide ruo n’oge ya.
Mgbanwe. Mgbanwe nke narị afọ nke 16 nke Luther, Calvin, na ndị ọzọ duziri emebeghị ihe dị ukwuu n’ịgbanwe chọọchị. Kama nke ahụ, dị ka onye okpukpe Collegiant a ma ama nakwa dibịa bekee bụ́ Galenus Abrahamsz (1622-1706) si kwuo, Mgbanwe ahụ mere ka ọnọdụ okpukpe ahụ ka njọ site n’ịkpalite esemokwu na ịkpọasị. Ezi mgbanwe kwesịrị ịgbanwe obi, bụ́ nke Mgbanwe ahụ na-emeghị.
Chọọchị na Ndị Ụkọchukwu. Chọọchị ndị bụ́ isi rụrụ arụ, nwee omume ụwa, gharakwa inwe ikike sitere n’aka Chineke. Onye ọ bụla nke ji okpukpe kpọrọ ihe enweghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ bụghị ịhapụ chọọchị ọ nọ na ya ka ọ ghara iso ná mmehie ya. Ọkwá onye ụkọchukwu, ka ndị okpukpe Collegiant kwuru, megidere Akwụkwọ Nsọ ma bụrụ “ihe na-emerụ ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ ndị Kraịst.”
Alaeze na Paradaịs. Otu n’ime ndị guzobere kọleji dị n’Amsterdam, bụ́ Daniel de Breen (1594-1664), dere na Alaeze Kraịst abụghị alaeze ime mmụọ nke dị n’obi mmadụ. Onye nkụzi bụ́ Jacob Ostens, bụ́ onye okpukpe Collegiant nke nọ na Rotterdam, kwuru na “ndị nna ochie lepụrụ anya n’ihu maka nkwa dị iche iche banyere ụwa.” N’otu aka ahụ, ndị okpukpe Collegiant nọ na-echere mgbe a ga-agbanwe ụwa ka ọ ghọọ paradaịs.
Atọ n’Ime Otu. Ụfọdụ ndị okpukpe Collegiant a ma ama, n’ịbụ ndị nkwenkwe Socinus metụtara, jụrụ Atọ n’Ime Otu.c Dị ka ihe atụ, Daniel Zwicker (1621-1678) dere na ozizi ọ bụla nke na-emegide ezi izu, dị ka Atọ n’Ime Otu, bụ “ihe na-agaghị ekwe omume, bụrụkwa ụgha.” Na 1694, e bipụtara nsụgharị Bible nke onye okpukpe Collegiant bụ́ Reijnier Rooleeuw sụgharịrị. Ọ sụgharịrị akụkụ ikpeazụ nke Jọn 1:1: “Okwu ahụ bụkwa chi” kama ịbụ dị ka nsụgharị e nweburu si dị: “Okwu ahụ bụrụkwa Chineke.”d
Nzukọ Kwa Izu
Ọ bụ ezie na ndị okpukpe Collegiant ekwekọrịtachaghị n’otu ihe n’ihe banyere nkwenkwe, kọleji ha ndị dị n’obodo dị iche iche sikwa otú a na-arụ ọrụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Van Slee na-akọ na mgbe mbụ òtù ndị okpukpe Collegiant malitere, a dịghị akwadebe maka nzukọ tupu oge eruo. Ndị okpukpe Collegiant chere na dabere n’ihe Pọl onyeozi kwuru banyere mkpa ọ dị ‘ibu amụma,’ na ndị ikom nile nọ n’òtù ha nweere onwe ha ịgwa kọleji ahụ okwu. (1 Ndị Kọrint 14:1, 3, 26) N’ihi ya, a na-anọkarị ná nzukọ ruo n’ime abalị, “oké ụra” na-eburukwa ụfọdụ ndị bịaranụ.
Ka oge n’aga, nzukọ ghọrọ nke a haziri nke ọma karị. Ọ bụghị nanị na Sunday ka ndị okpukpe Collegiant na-ezukọ kamakwa n’uhuruchi n’ime izu. Iji mee ka ọkà okwu na ọgbakọ nwee ike ime nkwadebe tupu oge eruo maka nzukọ nile a ga-enwe n’afọ ahụ, usoro ihe omume e biri ebi depụtara amaokwu Bible ndị a ga-atụle nakwa mkpụrụ akwụkwọ ndị bidoro aha ndị ọkà okwu. Mgbe e jisịrị abụ na ekpere meghee nzukọ ahụ, ọkà okwu na-akọwa amaokwu Bible ndị ahụ. Mgbe ọ kọwachara, ọ na-agwa ndị ikom ka ha kwuo ihe ha chere banyere isiokwu ahụ a ka tụlesịrị. Mgbe ahụ, ọkà okwu nke abụọ na-egosi ụzọ a pụrụ isi tinye amaokwu ndị ahụ n’ọrụ. A na-eji abụ na ekpere emechi nzukọ ahụ.
Ndị okpukpe Collegiant nọ n’obodo Harlingen, n’ógbè Friesland, nwere ụzọ dị ịrịba ama maka ime ka nzukọ ha na-emechi n’oge. Ọkà okwu nke kwuru okwu karịa otú o kwesịrị aghaghị ịkwụ obere nhá.
Mgbakọ Mba
Ndị okpukpe Collegiant chekwara na ọ dị mkpa inwe mgbakọta ndị ka ukwuu. N’ihi ya, malite na 1640, ndị okpukpe Collegiant sitere n’akụkụ nile nke mba ahụ mere njem ugboro abụọ n’afọ (n’oge opupu ihe ubi na n’oge okpomọkụ) gaa Rijnsburg. Mgbakọta ndị a, ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Fix na-ede, nyere ha ohere “ịmara nke ọma banyere echiche, mmetụta, nkwenkwe, na ọrụ nke ụmụnna ha ndị si n’ebe dị iche iche.”
Ụfọdụ ndị okpukpe Collegiant si esi bịa na-achọta ụlọ ná ngo n’aka ndị obodo ebe ndị ọzọ na-anọ na Groote Huis, ma ọ bụ Ụlọ Ukwu, bụ́ ụlọ ndị okpukpe Collegiant nke nwere ọnụ ụlọ 30. A na-ekesa ihe oriri n’ọha maka mmadụ 60 ruo 70 n’ebe ahụ. Mgbe ha risịrị nrị, ndị bịara nleta pụrụ ịkpagharị ná nnukwu ogige nke ụlọ ukwu ahụ iji hụ ‘ọrụ Chineke, nwee mkparịta ụka dị jụụ, ma ọ bụ oge ntụgharị uche.’
Ọ bụ ezie na ọ bụghị ndị okpukpe Collegiant nile chere na baptism dị mkpa, ọtụtụ chere na ọ dị. N’ihi ya, baptism ghọrọ otu akụkụ nke mgbakọ ukwu ndị ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Van Slee na-ekwu na ihe omume ahụ na-ewerekarị ọnọdụ n’ụtụtụ Saturday. Okwu dabeere ná mkpa ọ dị imikpu mmadụ n’ime mmiri na-esochi abụ na ekpere. Mgbe ahụ ọkà okwu ahụ na-akpọ ndị toruworo oge mmadụ chọrọ ka e mee ha baptism òkù ikwupụta okwukwe ha, dị ka, “Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke ahụ dị ndụ.” Mgbe e jisịrị ekpere mechie okwu ahụ, ndị nile bịaranụ na-eji ụkwụ gaa n’ebe a na-eme baptism ma kirie ndị ikom na ndị inyom gbunyere ikpere n’ime ọdọ mmiri ahụ, ka mmiri wee ruo ha n’ubu. Onye ahụ na-eme baptism na-ejizi nwayọọ kwalaa isi onye ọhụrụ ahụ kwere ekwe ihu, nubakwa ya n’ime mmiri. Mgbe ihe omume ahụ gasịrị, mmadụ nile na-alaghachi n’oche ha maka ịnụrụ okwu ọzọ.
N’ehihie Saturday n’elekere 5:00 nke mgbede, a na-eji ọgụgụ Bible dị mkpirikpi, abụ, na ekpere amalite nzukọ ahụ kpọmkwem. Iji jide n’aka na a na-enwe ndị ọkà okwu mgbe nile, kọleji ndị dị na Rotterdam, Leiden, Amsterdam, na North Holland na-ewepụta ndị ọkà okwu maka mgbakọ nke ọ bụla mgbe o ruuru ha. A na-edo ụtụtụ Sunday iche maka ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Mgbe okwu, ekpere, na abụ gasịrị, ndị ikom, e mesịzie ndị inyom na-eri achịcha, na-aṅụkwa mmanya ahụ. A na-ekwukwu okwu ndị ọzọ n’uhuruchi Sunday, n’ụtụtụ Monday kwa, mmadụ nile na-ezukọta maka okwu ikpeazụ. Ihe ka ọtụtụ n’okwu ndị e kwuru ná mgbakọ ndị a, ka Van Slee na-ekwu, na-aba uru, na-emesi ike itinye ya n’ọrụ karịa ịkọwa ya nke ọma.
Obi dị ndị obodo Rijnsburg ụtọ ịdị na-eme ndokwa maka mgbakọta ndị a. Otu onye hụrụ ihe na-emenụ na narị afọ nke 18 dere na nnubata nke ndị ọbịa, bụ́ ndị na-emefu ego buru ibu, na-enye obodo nta ahụ ezigbo ego. Tụkwasị na nke a, mgbe mgbakọ nke ọ bụla gasịrị, ndị okpukpe Collegiant na-atụkọta ego nye ndị ogbenye nọ na Rijnsburg. Obi abụọ adịghị ya na o metụtara obodo nta ahụ mgbe a kwụsịrị inwe nzukọ ndị ahụ na 1787. Mgbe nke ahụ gasịrị, òtù okpukpe Collegiant pụrụ n’anya. N’ihi gịnị?
Ihe Mere Ha Ji Pụọ n’Anya
Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke narị afọ nke 17, esemokwu ebilitela banyere òkè ọgụgụ isi na-ekere n’okpukpe. Ụfọdụ ndị okpukpe Collegiant chere na ọgụgụ isi mmadụ kwesịrị ibute mkpughe Chineke ụzọ, ma ndị ọzọ ekweghị. N’ikpeazụ, esemokwu ahụ kewara òtù okpukpe Collegiant dum. Nanị mgbe ndị bụ́ isi na-akwado akụkụ abụọ ahụ nwụsịrị ka ndị okpukpe Collegiant dịghachiri n’otu. Otú o sina dị, mgbe nkewa a gasịrị okpukpe ahụ “abụghịzi ihe ọ bụbu ma ọlị,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Fix na-ekwu.
Ikwe ibe nọrọ nke na-ebuwanye ibu n’ime chọọchị Protestant nke narị afọ nke 18 tụnyekwara ụtụ n’ọdịda nke ndị okpukpe Collegiant dara. Ka ọha na eze n’ozuzu ha nakweere ụkpụrụ nke ọgụgụ isi na ikwe ibe nọrọ nke ndị okpukpe Collegiant karị, “ìhè chi ọbụbọ ahụ na-eti gbaa nke Oge Nghọta kpuchiri ìhè ahụ dịbu nanị ya nke ndị okpukpe Collegiant.” Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke narị afọ nke 18, ihe ka ọtụtụ ná ndị okpukpe Collegiant esonyeworo òtù okpukpe Mennon na òtù okpukpe ndị ọzọ.
Ebe ndị okpukpe Collegiant na-ezubeghị inwe ịdị n’otu nke echiche n’ime òtù ha, e nwere echiche dịgasị iche dị ka e nwere ndị okpukpe Collegiant. Ha matara nke a, n’ihi ya kwa, ha adịghị azọrọ ịbụ ndị “dị n’otu . . . n’otu ụzọ iche echiche,” dị ka Pọl onyeozi na-agba ndị Kraịst ume ka ha dị. (1 Ndị Kọrint 1:10, NW) Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, ndị okpukpe Collegiant na-atụ anya ịhụ mgbe nkwenkwe ndị bụ́ isi nke ndị Kraịst, dị ka ịdị n’otu nke echiche, ga-adị n’ezie.
N’ịtụle eziokwu ahụ bụ́ na ezi ihe ọmụma ababeghị ụba n’oge ndị okpukpe Collegiant, ha setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke ọtụtụ okpukpe taa pụrụ ịrịba ama. (Tụlee Daniel 12:4.) Mmesi ha mesiri ike mkpa ọ dị ịmụ Bible kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́: “Na-anwanụ ihe nile.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Ọmụmụ Bible onwe onye kụziiri Jacobus Arminius na ndị ọzọ na ụfọdụ ozizi na omume okpukpe ndị ha nwere eri ogologo oge adabereghị na Bible ma ọlị. Mgbe ha matara nke a, ha nwere obi ike isi n’okpukpe bụ́ isi pụta. Ị̀ gaara emeworị otu ihe ahụ?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na 1610 ndị ahụ nwere echiche dị iche ezigaworo ndị ọchịchị Holland otu akwụkwọ na-ekwu ihe ndị kpatara mmegide ha. Mgbe ha mesịrị ya, a kpọrọ ha Ndị Mmegide.
b N’ihi ebe a ọ dị, a kpọkwara ndị okpukpe Collegiant ndị Rijnsburg.
c Lee Teta! (Bekee), November 22, 1988, peji nke 19, “Ndị Òtù Okpukpe Socinus—Gịnị Mere Ha Ji Jụ Atọ n’Ime Otu?”
d Het Nieuwe Testament van onze Heer Jezus Christus, uit het Grieksch vertaald door Reijnier Rooleeuw, M.D. (Agba Ọhụrụ nke Onyenwe Anyị Jisọs Kraịst, nke Reijnier Rooleeuw, M.D. sụgharịrị site n’asụsụ Grik.)
[Foto dị na peeji nke 24]
Rembrandt van Rijn
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Obodo nta bụ́ Warmond ebe ndị okpukpe Collegiant bu ụzọ malite, na Osimiri De Vliet bụ́ ebe a nọ mee baptism
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 23]
N’azụ: Site n’ikike nke American Bible Society Library, New York