Ịchọta Ezi Udo n’Ala Nọ ná Nsogbu
“Ikike na-eyi egwu bụ́ ime ihe ike nke ịrọ òtù esila n’ogige ya pụtachaa,” ka otu akụkọ kwuru laa azụ na 1969. Nke ahụ bụ mgbe Nsogbu ahụ, bụ́ oge oké ọgba agbara dị ugbu a na Northern Ireland, malitere ịrị elu.
IME ihe ike nke ịrọ òtù na igbu ọchụ ghọrọ ihe a na-ahụkarị ka ndị ogbu ọchụ nke Protestant na Katọlik, bụ́ “ndị agamevu nọ n’akụkụ abụọ” nke esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe ahụ, lụsikwuru ọgụ ike maka ịchịisi n’Ireland. Kemgbe ahụ, “e gbuola ihe karịrị mmadụ 3,600 ma nye ọtụtụ puku nkwarụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 nke ime ihe ike,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Irish Times na-akọ.
N’ezie, nke a abụghị ọgụ malitere ọhụrụ. O tiela Ireland ihe otiti ruo ọtụtụ narị afọ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nweela mmetụta ya kasị njọ na Northern Ireland, ma obi ilu na enweghị nkwekọrịta o wetaworo emekpaala ndị nile nọ na Ireland ahụ.
Ka ihe ndị ahụ na-eme, ruo ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova anọwo na-arụtụ aka n’ezi ihe ngwọta dịịrị nsogbu ndị tiworo ala a nọ ná nsogbu ihe otiti. Ihe ngwọta ahụ bụ Alaeze Chineke nke dị n’aka Jisọs Kraịst. (Matiu 6:9, 10) Mgbe Nsogbu ahụ malitere na 1969, e nwere Ndịàmà Jehova 876 n’Ireland. Ugbu a e nwere ihe karịrị nnọọ 4,500, bụ́ ndị nọ n’ihe karịrị 100 ọgbakọ. Ihe na-esonụ bụ ahụmahụ ole na ole sitere n’aka ụfọdụ ndị jụworo itinye aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha.
“Mgbe M Tolitere, Aga M Abanye n’Òtù IRA!”
Michaela tolitere dị ka onye Katọlik na Republic of Ireland. N’ụlọ akwụkwọ, a kụziiri ya akụkọ ihe mere eme banyere Ireland na ọgụ ya na Britain lụworo ọtụtụ narị afọ. Dị ka nwata, ọ zụlitere ịkpọasị dị ukwuu n’ebe ndị England nọ, bụ́ ndị o lere anya dị ka “ndị na-emegbu ndị Ireland.” Mgbe ọ dị afọ iri, ọ gwara nne nne ya, sị, “Mgbe m tolitere, aga m abanye n’òtù IRA!” (Usuu Ndị Agha Mba Ireland) “Ọ mara m ụra nke m ka na-echeta ruo taa,” ka ọ na-ekwu. O mesịrị mata na nna ya ochie anọtụwo n’usuu ndị agha Britain n’oge Agha Ụwa Mbụ. N’otu oge, nne nne ya aghaghị iguzo n’ihu nna ya ochie iji gbochie ndị òtù IRA ịgba ya égbè.
N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Michael tolitekwuru, ọ chọrọ ime ihe iji nyere ndị Katọlik ibe ya nọ na Northern Ireland aka. “N’oge ahụ o yiri m,” ka ọ na-ekwu, “ka nanị ndị na-eme ihe ọ bụla iji nyere ndị Katọlik nke Northern Ireland aka ọ̀ bụ ndị IRA.” N’ịbụ onye ihe o lere anya dị ka ihe ziri ezi kpaliri, ọ ghọrọ onye òtù IRA ma nata ọzụzụ n’otú e si eji ngwá agha eme ihe. Ndị agha Protestant nọ na Northern Ireland gbagburu atọ n’ime ndị enyi ya.
N’ikpeazụ, Michael bịara nwee nkụda mmụọ n’ebe agha ahụ dị, dị ka ihe atụ, ajọ ibu iro dị n’etiti ìgwè ndị agha dị iche iche nyere ya nsogbu n’obi. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ịda iwu n’ihe metụtara ọrụ IRA, o kpegaara Chineke ekpere ka o nyere ya aka ịchọta ezi ụzọ nke na-eduga n’udo na ikpe ziri ezi na-adịgide adịgide. Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya n’ebe obibi ya. Otú ọ dị, ajọ mbunobi ochie ndị o nwere wetara ihe mgbochi. Ndịàmà ahụ bụ ndị England. Ịkpọasị gbamiri mkpọrọgwụ o nwere mere ka o siere ya ike ige ntị. “Adịghị m egosikarị na enwere m obi ụtọ ịhụ ha,” ka ọ na-ekwu, “ma ha nọgidesiri ike na-abịa ma na-eso m ekwurịta okwu, amalitekwara m ịhụ na Alaeze Chineke ga-akwụsị ikpe na-ezighị ezi nile nke ọchịchị na nke ọha mmadụ bụ́ ndị m na-alụ ọgụ ikpochapụ.”—Abụ Ọma 37:10, 11; 72:12-14.
Ọnọdụ dị njọ dapụtara n’otu uhuruchi mgbe Michael zutere ọchịagha ya nke òtù IRA, bụ́ onye kwuru, sị, “O nwere ọrụ ị ga-arụrụ anyị.” “Echere m na aghaghị m ime nhọrọ n’ebe ahụ ozugbo,” ka Michael na-ekwu, “ya mere ekusiri m ume ike ma kwuo, sị, ‘Abụzi m otu n’ime Ndịàmà Jehova,’ ọ bụ ezie na e mebeghị m baptism n’oge ahụ. Amaara m nnọọ na achọrọ m ịbụ ohu Jehova.” “E kwesịrị ịkwụwa gị n’ahụ ájá ma gbagbuo gị,” ka ọchịagha ahụ zaghachiri. N’agbanyeghị iyi egwu ahụ, Michael hapụrụ òtù IRA. O nwetara obi ike ime nke a site n’ikwe ka okwu Jehova metụta uche na obi ya. “Ka oge na-aga, nwunye m na ụfọdụ n’ime ụmụ m rakwaara ndụ ha nye Jehova. Anyị nwere ezi udo ugbu a n’ime obi anyị. Anyị ga na-ekelekwa Jehova mgbe nile maka ikwe ka anyị mụta eziokwu ahụ na ikere òkè n’ịgbasa ozi udo n’ala nọ ná nsogbu.”—Abụ Ọma 34:14; 119:165.
Ịnọpụ Iche Bụ Ezi Ihe Nchebe
“Etolitere m n’ime ime Obodo Derry dị na Northern Ireland,” ka Patrick na-ekwu. “Dị ka nwata, amaghị m ihe ọ bụla ma e wezụga Nsogbu ahụ. N’ụzọ doro anya, gburugburu ebe obibi ahụ metụtara ụzọ m si ele ihe anya na echiche m.” Patrick zụlitere echiche imebiga ihe ókè bụ́ nke ajọ ịhụ mba n’anya na oké ajọ mbunobi megide ndị Britain kpaliri. Ọ hụrụ ndị okpukpe nọ n’akụkụ abụọ nke agha ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ka ha na-emebi ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke ndị Kraịst nakwa omume ọma bụ́ isi nke mmadụ. N’ihi ya, ọ gbakụtara okpukpe azụ, mesịa ghọọ onye na-ekweghị na Chineke dị na onye na-akwadosi echiche Marx ike.—Tụlee Matiu 15:7-9; 23:27, 28.
“Ihe ndị m na-echeta banyere oge m bụ nwata bụ abụbọ nri nke ndị mkpọrọ na-akwado ọchịchị rịpọblik nọ n’Ebe Ugwu gbara,” ka Patrick na-ekwu. “Ha metụtara m n’ụzọ dị ukwuu. Ana m echeta mgbe m na-eweli ọkọlọtọ Ireland elu ma na-edekasị ihe n’ebe nile m nwere ike megide ndị Britain. Mgbe m dị nanị afọ 15, abụ m onye nhazi ihe n’olili ozu nke otu n’ime ndị ahụ gbara abubọ nri bụ́ onye nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ.” Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị ọgba aghara ukwu na ndị nta nke oge ahụ rikpuru, Patrick keere òkè n’ịkpa aghara na n’ime njegharị iwe ná nchụso nke ihe o lere anya dị ka ikpe ziri ezi na ịha nhata nke ọha mmadụ. Ọ ghọrọ ezigbo enyi nke ọtụtụ ndị hụbigara mba ha n’anya ókè, bụ́ ndị ọchịchị Britain tụrụ ọtụtụ n’ime ha mkpọrọ.
“E mesịa,” ka Patrick na-ekwu, “n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba m, emesịrị m nọọ oge ụfọdụ n’England. Mgbe m nọ n’ebe ahụ, ndị uwe ojii Britain jidere otu n’ime ndị enyi m bụ́ onye na-aga ịtụ bọmbụ.” Ọ bụ ezie na Patrick ka nwere nnọọ omume nke ịhụ mba n’anya, àgwà ya malitere ịgbanwe. Ọ malitere ịhụ na ajọ mbunobi o nwere megide ndị England nile bụ nke na-enweghị nnọọ isi. “Amalitekwara m ịghọta,” ka ọ na-ekwu, “na ọ dịghị mgbe agha ga-edozi nsogbu ndị ahụ n’ezie ma wepụ ikpe na-ezighị ezi ndị nyeworo m nsogbu n’obi. E nwere nnọọ ọtụtụ nrụrụ aka na emezighị emezi ndị ọzọ n’etiti ndị na-elekọta òtù ndị agha dị iche iche.”—Eklisiastis 4:1; Jeremaịa 10:23.
N’ikpeazụ, Patrick lọghachitere na Northern Ireland. “Mgbe m lọghachiri, otu enyi m kọwaara Ndịàmà Jehova onye m bụ.” Site n’ọmụmụ Bible o so Ndịàmà na-enwe, Patrick malitere ịhụ ezi ihe ngwọta dịịrị esemokwu na enweghị nkwekọrịta nke ụmụ mmadụ. O nwere ọganihu ime mmụọ dị ngwa ka ụkpụrụ Bible metụtawara uche na obi ya. (Ndị Efesọs 4:20-24) “Ugbu a,” ka ọ na-ekwu, “kama ịgba izu ịkwatu ọchịchị dịnụ, ana m ahụ onwe m ka m na-ekwusa ozi udo sitere na Bible, ọbụna n’ógbè nke ndị na-akwadosi ọchịchị ike bụ́ ebe m na-agaraghị anwa anwa ịga na mbụ. N’ezie, n’oge e nwere ọtụtụ igbu ọchụ nke ịrọ òtù na Belfast, ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova bụ ndị pụrụ nnọọ ịgagharị, n’ejighị ụgbọ agha, n’etiti ógbè ndị na-akwadosi ọchịchị ike na nke ndị na-ahụ mba n’anya.” Dị ka Ndịàmà ndị ọzọ nọ na Northern Ireland n’oge a, ọ chọpụtara na ịnọpụ iche, dị nnọọ ka ndị Kraịst oge gboo nọpụrụ, bụ ezi ihe nchebe. (Jọn 17:16; 18:36) Ọ na-ekwubi, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe na-akpata nnwere onwe ịhụ na Jehova site n’aka Jisọs Kraịst ga-ewetara ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe ziri ezi na enweghị mmegbu.”—Aịsaịa 32:1, 16-18.
“Égbè M Bụ Nanị Ihe Nchebe M Nwere”
“Etolitere m n’akụkụ nke ọzọ nke esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke okpukpe ahụ,” ka William na-ekwu. “Enwere m oké ajọ mbunobi nke ndị Protestant ma nwee oké ịkpọasị n’ebe ihe ọ bụla a kpọrọ Katọlik dị. Agaghịdị m abanye n’ụlọ ahịa onye Katọlik ma ọ bụrụ na o kwere mee, agakwara m Republic of Ireland nanị otu ugboro. Abanyere m n’ọtụtụ òtù na ụlọ ọrụ ndị Protestant, dị ka Òtù Orange—òtù nke mikpuru onwe ya n’ichekwa okpukpe na ụzọ ndụ nke ndị Protestant.” Mgbe ọ dị afọ 22, William banyere n’òtù Ndị Agha Nchebe nke Ulster, bụ́ akụkụ nke ndị agha Britain e si n’ógbè ahụ nweta. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ na ya bụ ndị Protestant. Ọ dị nnọọ njikere igbu ọchụ iji chebe ihe nketa ya. “Enwere m ọtụtụ égbè, agakwaaraghị m egbu oge iji ha mee ihe ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ana m edebe otu n’okpuru ihe nhiwe isi m n’abalị.”
Ma oge oké mgbanwe bịara. “Amalitere m ịghọta na Ndịàmà Jehova nwere ihe pụrụ iche mgbe m so otu n’ime ha rụkọọ ọrụ idozi otu ụlọ ochie. Onye ọrụ ibe m a nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ m. Ka anyị na-arụkọ ụlọ ahụ ọnụ, ajụrụ m ya ọtụtụ ajụjụ na-enye m nsogbu n’obi banyere Nsogbu ahụ, okpukpe, na Chineke. Azịza ya ndị dị mfe ma doo anya nyeere m aka ịhụ ihe Ndịàmà Jehova dị ka ya n’ezie—ìgwè ndị dị n’otu, na-adịghị eme ihe ike ma na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị e ji ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi mara.”—Jọn 13:34, 35.
N’ime ọnwa anọ ọ malitere ịmụ Bible, William gbara arụkwaghịm n’ụlọ ọrụ okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile ọ na-arụ ọrụ na ha. “Nke a bụụrụ m nzọụkwụ dị ukwuu,” ka ọ na-echeta, “n’ihi na aghaghị m ịgbahapụ ọtụtụ ọdịnala ndị m ji kpọrọ ihe eri oge.” Otú ọ dị, ule ya kasịnụ ka na-abịa. “N’ihi ọnọdụ e nwere na Northern Ireland, echere m na égbè m bụ nanị ihe nchebe m nwere. Ndị agha IRA lere m anya dị ka ‘onye a na-achọ achọ.’ Ya mere o siiri m nnọọ ike ịhapụ ngwá agha ndị a.” Otú ọ dị, nke nta nke nta, ndụmọdụ Bible, ndị dị ka nke ahụ a na-ahụ n’Aịsaịa 2:2-4, gbanwere echiche ya. Ọ hụrụ na n’ikpeazụ Jehova bụ ezi nchebe o nwere, dị nnọọ ka Ọ bụụrụ ndị Kraịst narị afọ mbụ. William gbahapụziri égbè ya.
“Otu n’ime ihe ndị na-enye m aṅụrị n’ezie,” ka William na-ekwu, “bụ na ugbu a enwere m ọbụbụenyi miri emi ma na-adịgide adịgide n’ebe ndị m gaara elewo anya na mbụ dị ka ajọ ndị iro nọ. Ọzọkwa, ọ bụ ihe na-enye ọṅụ n’ezie inwe ike iji ozi olileanya nke Bible banye n’ebe ndị bụbuuru m ‘ebe a na-adịghị aba aba.’ Ịtụgharị uche n’ihe eziokwu ahụ mewooro mụ na ezinụlọ m na-eme ka m na-enwe ekele n’ebe Jehova na nzukọ ya nọ ruo mgbe ebighị ebi.”
“Ọ Dịghị Nnọọ Ihe Ọ Bụla Nwere Isi”
A zụlitere Robert na Teresa n’ebe dịgasị nnọọ iche. “Esi m n’ezinụlọ kwụsiri ike na Protestant,” ka Robert na-ekwu. “Ụfọdụ n’ime ndị ikwu m ekerewo òkè n’agha. Mụ onwe m sonyeere òtù Ndị Agha Nchebe nke Ulster nke ndị agha Britain mgbe m dị afọ 19. Eji m ihe ka ọtụtụ n’oge ndị ahụ mee mgbagharị n’ógbè ebe Teresa bi. N’otu abalị, e nyere m ọrụ ndị ọzọ na-abụghị ọrụ ime mgbagharị. N’abalị ahụ, a gbakasịrị ụgbọala Land Rover m gaara eso na-agbagharị. Ndị soja abụọ nwụrụ, abụọ ndị ọzọ merụkwara ahụ.”
Robert malitere iche banyere nzube nke ndụ. “Ekweere m na Chineke kemgbe, ma mgbe m legharịrị anya gburugburu Northern Ireland, ọ dịghị nnọọ ihe ọ bụla nwere isi nye m. Amalitere m n’ezie ikpegara Chineke ekpere. Ajụrụ m Chineke ma ọ̀ dị adị n’ezie, ọ bụrụkwa na ọ dị, ka o gosi m ụzọ ziri ezi isi bie ndụ m. Ana m echeta mgbe m gwara Chineke na ọ ghaghị ịdị ebe e nwere otu ezi okpukpe!” Nanị ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ Robert ma hapụrụ ya ụfọdụ akwụkwọ. Mgbe o si ọrụ ime mgbagharị lọta n’ime abalị ahụ, Robert malitere ịgụ ya ma gụchaa ya n’elekere anya ise nke ụtụtụ. “Achọpụtara m ihe yiri eziokwu ozugbo,” ka ọ na-ekwu, “apụkwara m ịhụ na ihe nile si kpọmkwem n’ime Bible na-apụta.” (2 Timoti 3:16) Ọ malitere inwe ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ raara ndụ ya nye Chineke.
“Ndịàmà Na-adọrọ Uche Anyị Aga na Bible Mgbe Nile”
N’aka nke ọzọ, Teresa si n’ezinụlọ na-ekpe Katọlik, nke nwere echiche miri emi nke ịhụ mba n’anya. “Dị ka nwa agbọghọbịa, abanyere m n’òtù Sinn Féin.”b Teresa na-ekweta, sị: “Nke a mere ka m kere òkè n’ịkwado agha. Enyere m aka inweta ego e ji akwado agha ahụ. Emere m ka ndị òtù IRA mara ihe na-aga n’ógbè m. Etinyekwara m aka n’ịkpa aghara na n’ịtụ ndị uwe ojii na ndị agha na-eme mgbagharị nkume.”
Mgbe ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ Teresa malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, a kpalikwara mmasị ya. Ike nke Okwu Chineke metụtara ya n’ụzọ dị ukwuu. “Ndịàmà na-adọrọ uche anyị aga na Bible mgbe nile iji chọta azịza nye ajụjụ anyị,” ka ọ na-ekwu. “Nkwa ahụ dị na Daniel 2:44 bụ ihe na-emeghe anya n’ezie. Ahụrụ m na Alaeze Chineke bụ ezi ụzọ a ga-esi ewepụ ikpe na-ezighị ezi nile m nọ na-alụ ọgụ megide.” O nwere ịkpọasị na-arịwanye elu megide arụrụala ndị agha na-aru. Dị ka ihe atụ, Teresa apụghị ịghọta ihe mere mmadụ ọ bụla nwere ọmịiko na omume ọma ga-eji na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ nụrụ akụkọ banyere mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu mere bụ́ nke e gburu ma ọ bụ kwarụọ ndị agha ma ọ bụ ndị ọzọ na ya, nke ezinụlọ dị iche iche na-erukwa újú ma na-ahụju anya maka ya. Ya onwe ya kwa nabatara eziokwu dị na Bible ma kwe ka ụkpụrụ Chineke gbazie echiche ya. Ọ raara ndụ ya nye Chineke, e mekwara ya baptism n’oge na-adịghị anya.—Ilu 2:1-5, 10-14.
Teresa zutere Robert mgbe ha abụọ gara nzukọ n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Northern Ireland. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe mbụ m zutere Robert, o siiri m ike ikweta na eso m onye m gaara elewo anya, ruo n’oge na-adịbeghị anya, dị ka onye so n’òtù ndị agha Britain, na-ekwurịta okwu n’ụzọ dị jụụ na n’udo. Okwu Chineke enyeworo m aka n’ezie iwepụ ịkpọasị na ajọ mbunobi ndị gbamiri mkpọrọgwụ.” Ya na Robert chọpụtara na kama ịbụ ndị ịkpọasị na ajọ mbunobi ndị sitere ná ndịrịta iche nke ọdịnala na omenala ha kewara, ha nwekọrọ ọtụtụ ihe ọnụ ugbu a. Nke kasị ike n’ime ihe ndị a bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova Chineke nọ. Ha lụrụ. Ugbu a ha na-arụkọ ọrụ n’iwegara ndị si ná nzụlite na okpukpe nile n’ala a nọ ná nsogbu ozi Chineke maka ezi udo.
Ndị ọzọ nọ na Ireland enweela ahụmahụ yiri ndị a. Site n’ige ntị n’ozizi nke Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na ịnakwere ya, ha agbanahụwo “ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu” nke mmadụ. (Ndị Kọlọsi 2:8) Ugbu a ha na-enwe obi ike zuru ezu ná nkwa Chineke e dekọrọ na Bible. Ha nwere obi ụtọ iso onye ọ bụla ga-ege ntị kerịta olileanya ha banyere ọdịnihu udo—nke ime ihe ike nke ịrọ òtù na ụdị ime ihe ike ndị ọzọ na-agaghị adị na ya ma ọlị.—Aịsaịa 11:6-9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwere aha ndị ahụ agbanwe.
b Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ya na òtù IRA Nwa Oge nwere njikọ chiri anya.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
E toola agha ahụ n’ihe osise dị iche iche na Northern Ireland dum