Nyere Ndị Ọzọ Aka Ijegharị n’Ụzọ Kwesịrị Jehova
“Anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu . . . ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla.”—NDỊ KỌLỌSI 1:9, 10.
1, 2. Gịnị kpọmkwem pụrụ ịbụ isi iyi nke ọṅụ na afọ ojuju?
“ANYỊ bi n’ime ụlọ nta ụgbọ na-adọkpụ nke dị n’ugbo. Site n’ime ka ndụ anyị dị mfe, anyị nwekwuru oge iwere ozi ọma ahụ gakwuru ndị mmadụ. E jiriwo ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ ndị aka ịrara ndụ ha nye Jehova gọzie anyị n’ụba.”—Di na nwunye, bụ́ ndị ozi oge nile nọ na South Africa.
2 Ọ̀ bụ na ị gaghị ekweta na inyere ndị ọzọ aka na-eweta ọṅụ? Ụfọdụ ndị na-agbalị mgbe nile inyere ndị ọrịa, ndị a napụrụ ihe, ma ọ bụ ndị owu na-ama, aka—na-enweta afọ ojuju site n’ime otú ahụ. Ezi ndị Kraịst ji n’aka na ha iso ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst bụ enyemaka kasịnụ ha pụrụ inye. Ọ bụ nanị nke a pụrụ iduga ndị ọzọ n’ịnakwere ihe mgbapụta Jisọs, soro Chineke na-enwe ezi mmekọrịta, ma sonyezie ná ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi.—Ọrụ 3:19-21; 13:48.
3. Ụdị inyeaka dị aṅaa ka anyị kwesịrị itinye uche na ya?
3 Otú ọ dị, gịnị banyere inyere ndị nọworo na-ejere Chineke ozi, bụ́ ndị na-agbaso “Ụzọ” ahụ, aka? (Ọrụ 19:9) Obi abụọ adịghị ya na mmasị i nwere n’ebe ha nọ dị ukwuu dị ka ọ dịworo kemgbe, ma e nwere ike ị gaghị ahụ otú ị pụrụ isi mekwuo ihe ma ọ bụ tinyekwuo ihe n’aka ị na-enye. Ma ọ bụ ọnọdụ gị pụrụ iyi ka ọ na-eme ka ị ghara inyetụchara ha aka, si otú ahụ na-ebelata afọ ojuju ị pụrụ inweta. (Ọrụ 20:35) Banyere akụkụ abụọ ahụ, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’akwụkwọ Ndị Kọlọsi.
4. (a) Ọnọdụ dị aṅaa ka Pọl nọ na ya mgbe o degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ? (b) Olee otú Epafras si kere òkè?
4 Mgbe Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ, ọ nọ na Rom dị ka onye e jichiri ejichi n’ụlọ ya, ọ bụ ezie na ọ pụrụ inwe ndị ọbịa. Dị ka ị ga-atụ anya ya, Pọl ji nnwere onwe ya a kpaara ókè kwusaa banyere Alaeze Chineke. (Ọrụ 28:16-31) Ndị Kraịst ibe Pọl pụrụ ileta ya, ikekwe a na-akpọchikọta ọbụna ya na ụfọdụ n’ime ha mgbe ụfọdụ. (Ndị Kọlọsi 1:7, 8; 4:10) Otu bụ onye ahụ na-eji ịnụ ọkụ n’obi ezisa ozi ọma bụ́ Epafras nke si n’obodo Kọlọsi nke dị na Frijia, n’ala dị larịị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Efesọs dị n’Asia Minor (Turkey nke oge a). E siwo n’aka Epafras guzobe ọgbakọ na Kọlọsi, ọ rụsikwara ọrụ ike maka ọgbakọ ndị dị n’obodo ndị dị nso bụ́ Leọdisia na Hierapọlis. (Ndị Kọlọsi 4:12, 13) N’ihi gịnị ka Epafras ji mee njem iji hụ Pọl na Rom, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site ná mmeghachi omume Pọl?
Enyemaka Dị Irè Maka Ndị Kọlọsi
5. N’ihi gịnị ka Pọl ji dee ihe o degaara ndị Kọlọsi?
5 Iji nweta ndụmọdụ Pọl banyere ọnọdụ ndị dị n’ọgbakọ Kọlọsi, Epafras mere njem na-agwụ ike gaa Rom. Ọ kọrọ banyere okwukwe, ịhụnanya, na mgbalị ndị Kraịst ahụ na-eme n’izisa ozi ọma. (Ndị Kọlọsi 1:4-8) Ma, ọ ghaghị ikwupụtawokwa nchegbu ya banyere mmetụta na-adịghị mma bụ́ ndị na-eyi ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Kọlọsi egwu. Pọl meghachiri omume site n’ide akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke gbaghara ụfọdụ n’ime echiche ndị ozizi ụgha nọ na-agbasa. O lekwasịrị anya karịsịa n’ọnọdụ bụ́ isi e kwesịrị idebe Jisọs Kraịst na ya.a Enyemaka ya ò jedebere nanị n’imesi eziokwu ndị bụ́ isi nke Bible ike? Olee ụzọ ọzọ ọ pụrụ isi nyere ndị Kọlọsi aka, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta banyere inyere ndị ọzọ aka?
6. Gịnị ka Pọl mesiri ike n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi?
6 Ná mmalite nke akwụkwọ ozi ya, Pọl mere ka otu ụdị enyemaka anyị nwere ike ileghara anya pụta ìhè. Ọ bụ ụzọ isi nye aka n’ụzọ dị irè site n’ebe dị anya, ebe ọ bụ na Pọl na Epafras nọ n’ebe dị anya site na Kọlọsi. Pọl mesiri ike, sị: “Anyị na-ekele Chineke, bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-ekpe ekpere banyere unu mgbe nile.” Ee, ha bụ ekpere e kpere n’isi ndị Kraịst nọ na Kọlọsi kpọmkwem. Pọl gbakwụnyere, sị: “N’ihi nke a anyị onwe anyị kwa, site n’ụbọchị anyị nụrụ ya, anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu, ka e wee mee ka unu jupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ.”—Ndị Kọlọsi 1:3, 9.
7, 8. Ekpere onwe onye anyị na nke ọgbakọ anyị na-ekwutakarị gịnị?
7 Anyị maara na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere,” ya mere anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi na ọ dị njikere ịnụ ekpere anyị kpere dị ka uche ya si dị. (Abụ Ọma 65:2; 86:6; Ilu 15:8, 29; 1 Jọn 5:14) Otú ọ dị, a bịa n’ihe banyere anyị ikpe ekpere maka ndị ọzọ, gịnị ka ekpere anyị na-adị ka ya?
8 Mgbe mgbe anyị pụrụ iche echiche ma kpee ekpere banyere ‘òtù ụmụnna anyị ndị nọ n’ụwa.’ (1 Pita 5:9) Ma ọ bụ anyị pụrụ ikpeku Jehova ekpere banyere ndị Kraịst na ndị ọzọ nọ n’ógbè e nwere ọdachi. Mgbe ndị na-eso ụzọ na narị afọ mbụ nọ n’ebe ọzọ nụrụ banyere ụnwụ nri e nwere na Judia, ọ ghaghị ịbụ na ha kpere ọtụtụ ekpere maka ụmụnna ha ọbụna tupu ha eziga ihe enyemaka. (Ọrụ 11:27-30) N’oge anyị, a na-anụkarị ekpere a na-ekpe maka òtù ụmụnna anyị ma ọ bụ maka ìgwè buru ibu nke ụmụnna ná nzukọ ndị Kraịst, bụ́ ebe ọ dị ọtụtụ ndị mkpa ịghọta ha ma nwee ike ịsị “Amen.”—1 Ndị Kọrint 14:16.
Na-akpọ Ihe Aha n’Ekpere
9, 10. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na ikpe ekpere maka ndị a kpọrọ aha kpọmkwem dabara adaba? (b) Olee otú Pọl si bụrụ onye a kpọrọ aha kpọmkwem n’ekpere?
9 Ma, Bible na-enye anyị ihe atụ nke ekpere e kpere maka ndị ọzọ bụ́ ndị a kpọrọ nnọọ ihe aha, kpọọ ndị mmadụ aha kpọmkwem na ha. Tụgharịa uche n’ihe Jisọs kwuru bụ́ nke e dekọrọ na Luk 22:31, 32. Ndị ozi 11 kwesịrị ntụkwasị obi gbara ya gburugburu. Nkwado Chineke ga-adị ha nile mkpa n’oge ndị tara akpụ dị n’ihu, Jisọs kpekwara ekpere n’isi ha. (Jọn 17:9-14) Ma, Jisọs kpọrọ Pita aha, na-ekpe ekpere pụrụ iche maka onye ahụ na-eso ụzọ kpọmkwem. Ihe atụ ndị ọzọ: Elaịsha kpere ekpere ka Chineke nyere otu nwoke kpọmkwem, bụ́ onye na-ejere ya ozi, aka. (2 Ndị Eze 6:15-17) Jọn onyeozi kpere ekpere ka Gaịọs nọgide na-enwe ahụ ike n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ ime mmụọ. (3 Jọn 1, 2) Ekpere ndị ọzọ lekwasịkwara anya n’ìgwè mmadụ ndị a kpọrọ aha kpọmkwem.—Job 42:7, 8; Luk 6:28; Ọrụ 7:60; 1 Timoti 2:1, 2.
10 Akwụkwọ ozi Pọl na-eme ka okwu banyere ịkpọ ihe aha n’ekpere pụta ìhè. Ọ rịọrọ ka e kpee ekpere n’isi ya ma ọ bụ n’isi ya na ndị ibe ya. Ndị Kọlọsi 4:2, 3 na-agụ, sị: “Na-anọgidesinụ ike n’ekpere unu, na-amụkwanụ anya n’ime ya n’ikele ekele; na-ekpekwanụ ekpere n’ihi anyị n’otu oge ahụ, ka Chineke wee megheere anyị ọnụ ụzọ ikwusa okwu Ya, ka anyị kwuo ihe omimi nke Kraịst, nke m nọkwa n’agbụ n’ihi ya.” Tụleekwa ihe atụ ndị ọzọ a: Ndị Rom 15:30; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:25; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:1; Ndị Hibru 13:18.
11. Mgbe Epafras nọ na Rom, ole ndị ka ọ nọ na-ekpe ekpere maka ha?
11 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe enyi Pọl nọ na Rom nọ. “Epafras, onye bụ́ otu onye n’etiti unu, . . . na-ekele unu, na-agbasi mgba ike n’ihi unu n’ekpere ya nile mgbe nile.” (Ndị Kọlọsi 4:12) Okwu a sụgharịrị ịbụ “na-agbasi mgba ike” pụrụ inye echiche nke “ndọlị,” dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ n’egwuregwu oge ochie. Epafras ọ̀ nọ na-ekpesi ekpere ike nanị banyere ìgwè ndị kwere ekwe gburugburu ụwa ma ọ bụ ọbụna banyere ezi ndị na-efe ofufe n’Asia Minor nile? Pọl gosipụtara na Epafras nọ na-ekpe ekpere kpọmkwem maka ndị nọ na Kọlọsi. Epafras maara ọnọdụ ha. Anyị amaghị aha ha nile, anyị amaghịkwa nsogbu ndị chere ha ihu, ma buru ihe ụfọdụ o nwere ike ịbụ n’uche. Ikekwe Laịnọs na-eto eto nọ na-alụso mmetụta nke nkà ihe ọmụma jupụtara ebe nile ọgụ, Rufọs pụkwara inwewo mkpa maka ume iji guzogide ndọrọ nke omume ndị ọ na-emebu n’okpukpe ndị Juu. N’ịbụ onye nwere di na-ekweghị ekwe, ndidi na amamihe ọ̀ dị Pasis mkpa iji zụlite ụmụ ya n’ime Onyenwe anyị, nkasi obi ọ̀ dịkwu Asịkritọs, bụ́ onye na-arịa ọrịa ga-emecha gbuo ya, mkpa? Ee, Epafras maara ndị nọ n’ọgbakọ dị n’obodo ya, o kpesikwara ekpere ike maka ha n’ihi na ma ya ma Pọl chọrọ ka ndị dị otú ahụ raara onwe ha nye na-ejegharị n’ụzọ kwesịrị Jehova.
12. Olee otú anyị pụrụ isi na-akapị ihe ọnụ karị n’ekpere onwe onye anyị?
12 Ị̀ na-ahụ ụkpụrụ e setịpụụrụ anyị—ụzọ anyị ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka? Dị ka e kwuru, ekpere ihu ọha ná nzukọ ndị Kraịst na-asakarị mbara karị n’ihi ndị dịgasị iche na-ege ntị. Ma ekpere onwe onye anyị ma ọ bụ nke ezinụlọ anyị pụrụ ịbụ nke a kpọrọ nnọọ ihe aha na ha. Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ịrịọ Chineke ka o duzie ma gọzie ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nile ma ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ, ọ̀ bụ na anyị apụghị ịdị na-akapị ihe ọnụ mgbe ụfọdụ? Dị ka ihe atụ, gịnị ma ị kpọọ onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ gị ma ọ bụ onye nduzi nke Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị aha n’ekpere? Ndị Filipaị 2:25-28 na 1 Timoti 5:23 na-egosi nchegbu onwe onye Pọl nwere banyere ahụ ike Timoti na Epafrọdaịtọs. Ànyị pụrụ igosipụta mmasị yiri nke ahụ n’ebe ndị ọrịa anyị maara aha ha nọ?
13. Ọnọdụ ndị dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka anyị na-etinye n’ekpere onwe onye anyị?
13 N’eziokwu, anyị aghaghị izere inyoba anya n’okwu ndị dịịrị ndị ọzọ, ma, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka ekpere anyị na-egosipụta ezi mmasị anyị nwere n’ebe ndị anyị maara ma na-echebara echiche nọ. (1 Timoti 5:13; 1 Pita 4:15) A pụrụ ịchụwo nwanna n’ọrụ, anyị apụghịkwa inye ya ọrụ ọzọ. Ma, anyị pụrụ ịkpọtụ ya aha ma lekwasị anya n’ihe isi ike ya n’ekpere onwe onye anyị. (Abụ Ọma 37:25; Ilu 10:3) Ànyị maara banyere nwanna nwanyị kataworo ahụ nke na-alụbeghị di bụ́ onye na-enwetabeghị di na ụmụ n’ihi na o kpebisiri ike ịlụ di “nanị n’ime Onyenwe anyị”? (1 Ndị Kọrint 7:39) N’ekpere ị na-ekpe nanị gị, gịnị ma ị rịọ Jehova ka ọ gọzie ya ma nyere ya aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe n’ozi ya? Dị ka ihe atụ ọzọ, ndị okenye abụọ pụrụ inyewo nwanna nwoke mehiere ihe ndụmọdụ. Gịnị mere onye nke ọ bụla n’ime ha na-agaghị eji na-akpọtụ nwanna ahụ aha n’ekpere onwe onye ha site n’oge ruo n’oge?
14. Olee njikọ ekpere ndị a kapịrị ọnụ na inyere ndị ọzọ aka nwere?
14 N’ekpere onwe onye gị, i nwere ohere zuru ezu itinye ndị mmadụ ị maara bụ́ ndị nwere mkpa maka nkwado, ngụgụ obi, amamihe, na mmụọ nsọ Jehova, ma ọ bụ otu n’ime mkpụrụ ndị ọ na-arụpụta. N’ihi ịdị anya ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ, ị pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ onye na-apụghị inyetụchara mmadụ aka kpọmkwem n’ụzọ ihe onwunwe ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị. Ma echefula ikpe ekpere maka ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị. Ị maara na ha chọrọ ijegharị n’ụzọ kwesịrị Jehova, ma enyemaka pụrụ n’ezie ịdị ha mkpa iji na-eme otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe bụ́ isi n’inye aka bụ ekpere gị.—Abụ Ọma 18:2; 20:1, 2; 34:15; 46:1; 121:1-3.
Rụọ Ọrụ Iji Wusikwuo Ndị Ọzọ Ike
15. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’akụkụ ikpeazụ nke Ndị Kọlọsi?
15 N’ezie, ikpesi ekpere a kapịrị ọnụ ike abụghị nanị ụzọ isi nyere ndị ọzọ aka, karịsịa ndị na-abịaru gị nso ma bụrụ ndị ị hụrụ n’anya. Akwụkwọ Ndị Kọlọsi na-eme ka nke ahụ doo anya. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na mgbe Pọl nyesịrị ntụzi ndị metụtara ozizi nakwa ndụmọdụ ndị dị irè, ọ gbakwụnyere ekele nkịtị. (Ndị Kọlọsi 4:7-18) N’ụzọ dị iche, anyị achọpụtaworị na akụkụ ikpeazụ a nke akwụkwọ ahụ bu ndụmọdụ kwesịrị ịrịba ama, e nwekwara ihe ndị ọzọ a ga-amụta site n’akụkụ a.
16, 17. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere ụmụnna ndị a kpọtụrụ aha ná Ndị Kọlọsi 4:10, 11?
16 Pọl dere, sị: “Arịstakọs onye a dọkọọrọ mụ na ya n’agha na-ekele unu, ya na Mak nwanne Banabas (onye unu natara ihe ụfọdụ e nyere n’iwu banyere ya; a sị na ọ bịakwute unu, naranụ ya nke ọma), Jisọs kwa, onye a na-akpọ Justọs, mmadụ atọ ndị a sitere n’obibi úgwù: nanị ndị a bụ ndị sooro m na-arụkọ ọrụ n’ikwusa alaeze Chineke, mmadụ ndị e mere ka ha bụụrụ m ndị ngụgụ obi.”—Ndị Kọlọsi 4:10, 11.
17 N’ebe ahụ, Pọl kpọtụrụ ụmụnna ụfọdụ bụ́ ndị kwesịrị ka a rịba ama n’ụzọ pụrụ iche aha. O kwuru na ha so n’etiti ndị e biri úgwù, bụ́ ndị Juu. E nwere ọtụtụ ndị Juu e biri úgwù nọ na Rom, ụfọdụ ha kwa bụzi ndị Kraịst. Ma, ndị ahụ Pọl kpọtụrụ aha gbataara ya ọsọ enyemaka. Ma eleghị anya, ha alaghị azụ n’iso ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl na-akpakọrịta, ha aghaghịkwa ijiwo ọṅụ soro Pọl na-ekwusara ndị Jentaịl ozi ọma.—Ndị Rom 11:13; Ndị Galetia 1:16; 2:11-14.
18. Olee otú Pọl si jaa ụfọdụ ndị nọnyeere ya mma?
18 Rịba ihe Pọl kwuru ama: ‘Mmadụ ndị a bụụrụ m ndị ngụgụ obi.’ O ji okwu Grik pụtara nanị otu ugbo a n’ime Bible mee ihe. Ọtụtụ ndị nsụgharị na-asụgharị ya ịbụ “nkasi obi.” Otú ọ dị, e nwere okwu Grik ọzọ (pa·ra·ka·le’o) bụ́ nke a ka asụgharị ịbụ “nkasị obi.” Pọl ji okwu dị otú ahụ mee ihe n’ebe ọzọ n’akwụkwọ ozi a kpọmkwem ma o jighị ya mee ihe ná Ndị Kọlọsi 4:11.—Matiu 5:4; Ọrụ 4:36; 9:31; 2 Ndị Kọrint 1:4; Ndị Kọlọsi 2:2; 4:8.
19, 20. (a) Gịnị ka okwu ahụ Pọl ji mee ihe banyere ụmụnna ndị nyeere ya aka na Rom na-enye echiche ya? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ụmụnna ndị ahụ pụrụ isiwo nyere Pọl aka?
19 Ndị ahụ Pọl kpọrọ aha aghaghị imewo ihe karịrị nanị ịgwa ya okwu nkasi obi. E ji okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ndị ngụgụ obi” ná Ndị Kọlọsi 4:11 mee ihe mgbe ụfọdụ n’ihe odide ụwa maka ọgwụ ndị e ji ebelata ihe mgbu. Bible bụ́ New Life Version na-agụ, sị: “Lee aka ha nyewooro m nnọọ!” Bible bụ́ Today’s English Version ji nkebi ahịrịokwu bụ́: “Ha enyeworo m aka n’ụzọ dị ukwuu,” mee ihe. Gịnị ka ụmụnna ndị ahụ bụ́ ndị Kraịst nọ Pọl nso pụrụ imewo iji nyere ya aka?
20 Pọl pụrụ inwe ndị ọbịa, ma e nwere ọtụtụ ihe ndị ọ na-apụghị ime, dị ka ịzụta ihe ndị bụ́ isi dị ya mkpa—nri na ihe oyiyi maka oge oyi. Olee otú ọ pụrụ isi nweta akwụkwọ mpịakọta maka ịmụ ihe ma ọ bụ zụta ihe ndị ọ ga-eji na-ede ihe? (2 Timoti 4:13) Ọ̀ bụ na i cheghị na ụmụnna ndị ahụ nọ na-enyere Pọl aka igbo mkpa ya, na-eme ihe ndị bụ́ isi dị ka ịzụtara ya ihe ma ọ bụ ijere ya ozi? O nwere ike ịchọ ịchọpụta ọnọdụ dị n’otu ọgbakọ ma wulie ha elu. N’ịbụ onye e jichiri ejichi, ọ pụghị ime otú ahụ, ya mere ụmụnna ndị ahụ pụrụ imechiteworo Pọl nleta dị iche iche, na-ewetara ya ozi, na-eweghachiri ya akụkọ. Lee ihe na-ewusikwu ike ọ bụ!
21, 22. (a) N’ihi gịnị ka okwu ndị dị ná Ndị Kọlọsi 4:11 kwesịrị iji masị anyị? (b) Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi tinye ihe nlereanya nke ndị ahụ ha na Pọl nọrọ n’ọrụ?
21 Ihe Pọl dere banyere ịbụ “ndị ngụgụ obi” na-enye ihe ọmụma banyere ụzọ anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka. Ha pụrụ ịdị na-ejegharị n’ụzọ kwesịrị Jehova n’ihe banyere ụkpụrụ omume ya, ịga nzukọ ndị Kraịst, na ikere òkè n’ọrụ nkwusa. N’ihi nke ahụ, ha kwesịrị inweta okwu ekele anyị. Otú ọ dị, ànyị pụrụ ime karịa nke ahụ, na-abụ “ndị ngụgụ obi” dị ka ndị ahụ ha na Pọl nọrọ bụụrụ ya?
22 Ọ bụrụ na ị maara nwanna nwanyị nke ji amamihe na-agbaso 1 Ndị Kọrint 7:37 ma bụrụ onye na-enweghịzi ezinụlọ nọ ya nso, ị̀ pụrụ ime ka o sonye n’ihe omume ụfọdụ nke ezinụlọ gị, ikekwe ịkpọ ya ka o kere òkè ná nri ma ọ bụ iso jee obere nnọkọ oriri nke ndị enyi ma ọ bụ ndị ikwu gị? Gịnị banyere ịgba ya ume iso ezinụlọ gị gaa mgbakọ ma ọ bụ mkpapụ ezumike? Ma ọ bụ kpọọ ya ka o soro gị gaa ịzụ ihe oriri n’oge o nwere ohere. Anyị pụkwara ime ihe ndị dị otú ahụ n’ebe ndị inyom di ha nwụrụ ma ọ bụ ndị ikom nwunye ha nwụrụ, ma ọ bụ ndị na-enweghịzi ike ịkwọ ụgbọala, nọ. Ị pụrụ ịhụ na ọ bụ ihe na-akwụghachi ụgwọ bụ́ ịnụ ahụmahụ ha ma ọ bụ ịmụta ihe site n’ihe ọmụma ha banyere ihe ndị a na-emekarị nnọọ dị ka ịhọta mkpụrụ osisi ma ọ bụ ịhọta uwe ụmụaka. (Levitikọs 19:32; Ilu 16:31) Ọ pụrụ ịrụpụta ọbụbụenyi ka mma. N’ihi ya, ha nwere ike inwerekwu onwe ha ịrịọ gị maka enyemaka ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịzụrụ ọgwụ ụfọdụ n’ebe a na-ere ọgwụ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ụmụnna ndị ha na Pọl nọ na Rom aghaghị inyewo aka dị irè na nke na-agụgụ obi dịkwa ka nke gị pụrụ ịdị. Ma mgbe ahụ ma ugbu a, ngọzi ọzọ a na-enweta bụ na a na-eme ka njikọ nke ịhụnanya sikwuo ike, anyị na-ekpebisikwa ike iji nguzosi ike n’ihe na-ejekọrọ Jehova ozi ọnụ.
23. Gịnị ka ọ ga-adị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị na-etinye oge ime?
23 Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịtụgharị uche n’ọnọdụ ndị a kpọtụrụ aha n’isiokwu a. Ha bụ ihe atụ nkịtị, ma ha pụrụ ichetara anyị ọnọdụ ndị dị adị bụ́ ndị anyị pụrụ ịbụrụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị “ndị ngụgụ obi” na ha. Ihe a na-ekwu n’ebe a abụghị ka anyị ṅomiwe ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ. Nke ahụ abụghị ihe mgbaru ọsọ nke ụmụnna ndị a kpọtụrụ aha ná Ndị Kọlọsi 4:10, 11. Ha bụ “ndị sooro [Pọl] na-arụkọ ọrụ n’ikwusa alaeze Chineke.” Mmetụta na-ewusikwu ike ọ na-enwe nwere ihe jikọrọ ya na nke ahụ kpọmkwem. Ka ọ dị otú ahụ n’ebe anyị nọ.
24. Gịnị bụ isi ihe mere anyị ji ekpe ekpere maka ndị ọzọ ma na-agbalị iwusikwu ha ike?
24 Anyị na-akpọ ndị ọzọ aha n’ekpere onwe onye anyị ma na-agbalị iwusikwu ha ike n’ihi nke a: Anyị kweere na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị chọrọ ‘ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile.’ (Ndị Kọlọsi 1:10) Eziokwu ahụ nwere ihe ọzọ e jikọrọ ya na ya bụ́ nke Pọl kpọtụrụ uche na ya mgbe ọ na-ede banyere ekpere Epafras kpere n’isi ndị Kọlọsi, bụ́ ka ha nwee ike ‘iguzo dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.’ (Ndị Kọlọsi 4:12) Olee otú anyị pụrụ isi mezuo nke ahụ n’onwe anyị? Ka anyị lee.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Insight on the Scriptures, Mpịkọta nke 1, peeji nke 490-491, na “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peeji nke 226-228, ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Rịbara Ama?
• Olee otú anyị pụrụ isi na-enyekwu aka n’ekpere onwe onye anyị?
• N’echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst ụfọdụ bụụrụ Pọl “ndị ngụgụ obi”?
• N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịbụ “ndị ngụgụ obi”?
• Gịnị bụ ebumnobi anyị n’ikpe ekpere n’isi ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na ịgbalị iwusikwu ha ike?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ị̀ pụrụ ime ka onye Kraịst ọzọ soro ezinụlọ gị mee mkpapụ?
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke Green Chimney’s Farm