Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 1/15 p. 3-4
  • Ị̀ Na-atụkwasị Obi na Chi nke Bụ́ Ezigbo Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-atụkwasị Obi na Chi nke Bụ́ Ezigbo Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chi Ndị “Na-adịghị Azọpụta”
  • “Ọ Dịghịkwa Onye Na-aza”
  • È Nwere Nanị Otu Ezi Chineke?
    Teta!—2006
  • Ofufe Beal—Ọgụ A Lụrụ Iji Nweta Obi Ụmụ Israel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Laghachinụ n’Ofufe Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 1/15 p. 3-4

Ị̀ Na-atụkwasị Obi na Chi nke Bụ́ Ezigbo Ya?

Otu òtù ndị nchọpụta nke American Museum of Natural History dupụrụ na-aga inyocha otu ala dị n’Arctic nke onye na-eme nchọpụta bụ́ Robert E. Peary kwuru na ya hụrụ ihe dị ka afọ asaa tupu mgbe ahụ, na 1906.

SITE na Cape Colgate nke dị n’isi isi ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ nke Ebe Ugwu America, Peary hụrụ ihe yiri ọnụ ọnụ ugwu na-acha ọcha nke otu ala dị anya. Ọ kpọrọ ya Ala Crocker, na-agụ ya aha nke otu n’ime ndị na-akwado ya n’ụzọ ego. Lee ka ndị ahụ na-eme njem nchọpụta na-aghaghị isiwo nwee obi ụtọ mgbe ha hụpeere otu ógbè dị n’ihu ha nke ugwu, ndagwurugwu, na ọnụ ọnụ ugwu ndị snow kpuchiri dịgasị na ya! Ma ha chọputara n’oge na-adịghị anya na ihe ha na-ahụ abụghị ihe ọzọ karịa onyinyo ógbè Arctic. Ihe a ha hụrụ n’ihi mmetụta mbara ikuku nwere n’ógbè ahụ arafuwo Peary, ugbu a kwa, ha emefuwo oge, ike, na ihe onwunwe iji chọpụta ihe na-adịghị adị.

Taa, ọtụtụ ndị na-etinye oge ha n’ife chi ndị ha kweere na ha bụ ezigbo ya. N’oge ndị ozi Jizọs, a na-efe chi ndị dị ka Hamis na Zus ofufe. (Ọrụ 14:11, 12) Taa, chi ndị Shinto, ndị Hindu, na okpukpe ndị ọzọ na-efe ofufe ruru ọtụtụ nde. N’ezie, dị ka Bible na-ekwu, “e nwere ọtụtụ ‘chi’ na ọtụtụ ‘ndị nwenụ.’” (1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Chi ndị a nile, hà pụrụ ịbụ ezigbo ya?

Chi Ndị “Na-adịghị Azọpụta”

Dị ka ihe atụ, tụlee iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe. Nye ndị na-atụkwasị ha obi ma ọ bụ ndị na-ekpe ekpere site na ha, arụsị dị iche iche yiri ndị nzọpụta nwere ike karịrị nke mmadụ bụ́ ndị pụrụ ịkwụ ndị mmadụ ụgwọ ọrụ ma ọ bụ napụta ha n’ihe ize ndụ. Ma hà pụrụ ịzọpụta n’ezie? Banyere ihe oyiyi ndị dị otú ahụ, ọbụ abụ ahụ bụrụ sị: “Arụsị nile nke mba nile bụ ọlaọcha na ọlaedo, ọrụ aka mmadụ. Ha nwere ọnụ, ma ha adịghị ekwu; ha nwere anya abụọ, ma ha adịghị ahụ ụzọ; ha nwere ntị abụọ, ma ha adịghị aṅa ntị; ọ dịghịkwa iku ume dị n’ọnụ ha.” N’ezie, ha bụ chi ndị “na-adịghị azọpụta.”—Abụ Ọma 135:15-17; Aịsaịa 45:20.

N’ezie, ndị na-emepụta arụsị pụrụ ịsị na ọrụ aka ha na-enye ndụ na ike. Ndị na-efekwa arụsị dị iche iche na-atụkwasị ha obi. “Ha na-ebuli [arụsị] n’ubu,” ka Aịzaịa onye amụma kwuru, “na-ebu ya, wee dọba ya n’ọnọdụ ya, o wee guzo.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ gaghị esi n’ebe ya pụọ: ee, mmadụ ga-etiku ya mkpu, ma ọ gaghị aza, ọ gaghị azọpụta ya n’ahụhụ ya.” (Aịsaịa 46:7) Nke bụ́ eziokwu bụ na arụsị ga-anọgide bụrụ ihe na-adịghị ndụ n’agbanyeghị otú ndị na-atụkwasị ya obi si kwenyesie ike na ya. Ihe oyiyi ndị dị otú ahụ a tụrụ atụ na ndị a wụrụ awụ bụ “arụsị.”—Habakuk 2:18.

Ife ndị na-eme ihe ntụrụndụ, ndị na-eme egwuregwu, usoro ọchịchị, na ndị ndú okpukpe ụfọdụ ofufe dị ka chi, inye ha nsọpụrụ ofufe, na igburu ha ikpere n’ala n’ụzọ ofufe, bụkwa ihe jupụtara ebe nile taa. Ọzọkwa, ego bụụrụ ọtụtụ ndị chi. N’ọnọdụ nke ọ bụla, a na-eme arụsị ndị a ka ha bụ ihe ha na-abụghị. Ha adịghị emezu ihe nile ndị kweere na ha na-atụ anya ha, ha apụghịkwa imezu ha. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ iyi ka akụ̀ na ụba ọ ga-agwọta ọtụtụ nsogbu, ma ike nke akụ̀ bụ ihe na-aghọgbu aghọgbu. (Mak 4:19) Otu onye nchọpụta jụrụ, sị: “Gịnị mere ihe ọtụtụ mmadụ na-achọsi ike ma kwere na ọ bụ ọgwọ nnụ ọrịa ji enwe mmetụta dịgasị iche iche malite ná ndị na-akụda mmụọ ruo ná ndị na-akpaghasị uche mgbe e nwetara ya?” Ee, ịchụso akụ̀ na ụba pụrụ ịchọ ka mmadụ chụọ ihe bara ezigbo uru n’àjà, dị ka ezi ahụ ike, ndụ ezinụlọ na-eju afọ, ezi ọbụbụenyi, ma ọ bụ mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ya na Onye Okike. Chi ya na-aghọ nnọọ ‘ihe efu nke na-abụghị ihe’!—Jona 2:8.

“Ọ Dịghịkwa Onye Na-aza”

Ọ bụ ihe nzuzu ịsị na ihe na-abụghị ezigbo ya bụ ezigbo ya. Ndị na-efe chi Beal n’oge Elaịja onye amụma matara nke a n’ụzọ dị ilu. Ha kwenyesiri ike na Beal nwere ikike nke ime ka ọkụ si n’eluigwe bịa ripịa àjà anụmanụ. N’ezie, ‘ha kpọkuru aha Beal site n’ụtụtụ ruo n’etiti ehihie, sị, Beal, za anyị.’ Beal ò nwere ntị nke pụrụ ịnụ ihe na ọnụ nke pụrụ ikwu okwu? Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu, sị: “Ọ dịghị olu dị, ọ dịghịkwa onye na-aza.” N’ezie, “ọ dịghịkwa ọṅụṅa ntị dị.” (1 Ndị Eze 18:26, 29) Beal abụghị ezigbo chi, ọ dịghị ndụ, ma ọ bụ na-arụ ọrụ.

Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị mara ma fee Chi nke bụ́ ezigbo ya ofufe! Ma ònye ka ọ bụ? Oleekwa otú ịtụkwasị ya obi pụrụ isi baara anyị uru?

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Onye òtù Peary, bụ́ Egingwah ka ọ na-enyopụ anya n’ihu ma ọ ga-ahụ ala

Robert E. Peary

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Egingwah: Site n’akwụkwọ bụ́ The North Pole: Its Discovery in 1909 Under the Auspices of the Peary Arctic Club, 1910; Robert E. Peary: NOAA

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

A na-eji ihe ndị a na-efe dị ka chi n’ụwa a eduhie ọtụtụ ndị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya