Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 12/1 p. 8
  • “Oge A Kara Aka” Dị Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Oge A Kara Aka” Dị Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Ga-aṅa Ntị N’ịdọ Aka ná Ntị Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Ànyị Bi “n’Ụbọchị Ikpeazụ” n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 12/1 p. 8

“Oge A Kara Aka” Dị Nso

Dị Ka onye amụma bụ́ Habakọk, ọ gụsiri ndị na-eso ụzọ Jizọs agụụ ike ịhụ ka ahụhụ kwụsịrị. Ebe ha mụtarala ihe Alaeze Chineke ga-eme iji dozie ihe n’ụwa, ha jụrụ Jizọs, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị [n’ike Alaeze] na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Matiu 24:3) Jizọs zara ha na ọ bụ naanị Jehova Chineke maara kpọmkwem mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị ụwa niile. (Matiu 24:36; Mak 13:32) Ma, Jizọs na ndị ọzọ buru amụma banyere ihe ụfọdụ ga-emenụ, bụ́ ndị ga-egosi na oge ahụ adịla nso.—Lee igbe dị n’aka nri.

Ị́ gaghị ekweta na ihe ndị a na-eme ebe niile taa? Jizọs bukwara amụma na a ga-arụ ọrụ izi ihe n’ụwa niile. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe na-eme taa. Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ahụ. N’ihe dị ka narị ala abụọ na iri atọ na isii, ihe karịrị nde Ndịàmà asaa na-agwa ndị mmadụ ihe Alaeze ahụ ga-eme, ha na-enyekwara ha aka irubere iwu ezi omume Chineke isi, bụ́ onye ọ bụ uche ya ịkwụsị ahụhụ na ihe mgbu. Nọgide na-amụ banyere Alaeze Chineke, ị ga-enwekwa olileanya ibi n’ụwa nke ahụhụ na-agaghị adị na ya—ruo mgbe ebighị ebi.

[Igbe dị na peeji nke 8]

Amaokwu Ndị Na-ekwu Banyere Ụbọchị Ikpeazụ

MATIU 24:6, 7; MKPUGHE 6:4

• Ụdị agha a na-enwetụbeghị mbụ

MATIU 24:7; MAK 13:8

• Oké ala ọma jijiji

• Ụkọ nri

LUK 21:11; MKPUGHE 6:8

• Ọrịa na-efe efe

MATIU 24:12

• Ịba ụba nke mmebi iwu

• Ịhụnanya ịjụ oyi

MKPUGHE 11:18

• Ibibi ụwa

2 TIMOTI 3:2

• Ịhụ ego n’anya gabiga ókè

• Inupụrụ nne na nna isi

• Ịhụ onwe onye n’anya gabiga ókè

2 TIMOTI 3:3

• Enweghị obi mmadụ

• Ndị mmadụ achọghị inwe nkwekọrịta ọ bụla

• Ndị mmadụ enweghị njide onwe onye

• Ọtụtụ ndị ahụghị ezi ihe n’anya

2 TIMOTI 3:4

• Ịhụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya

2 TIMOTI 3:5

• Inwe ọtụtụ Ndị Kraịst ihu abụọ

MATIU 24:5, 11; MAK 13:6

• Inwe ọtụtụ ndị amụma ụgha

MATIU 24:9; LUK 21:12

• Mkpagbu nke ezi Ndị Kraịst

MATIU 24:39

• Ndị mmadụ aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị sitere na Baịbụl

[Foto dị na peeji nke 8]

N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya