Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 11/1 p. 8
  • Na-egbo Mkpa Ime Mmụọ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-egbo Mkpa Ime Mmụọ Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-Agbasonụ Ihe Nlereanya Jisọs Nke Nsọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Na-Agbasonụ Nsọpụrụ Chineke Dị Ka Ndị Kraịst Meworo Baptism
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nyezuokwanụ Ntachi Obi Unu Nsọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 11/1 p. 8

Nke 5

Na-egbo Mkpa Ime Mmụọ Gị

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI? “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? E nwere ọtụtụ puku okpukpe, ọtụtụ n’ime ha na-akụzikwa ihe dị iche iche banyere otú ị ga-esi gboo mkpa ime mmụọ gị. Olee otú ị ga-esi mata nke na-akụzi eziokwu ma na-eme nnọọ ihe na-atọ Chineke ụtọ? Ụfọdụ ndị edemede a ma ama na-ekwu na ikwere na Chineke na ife ya bụ iberiibe, nakwa na ọ na-emebidịrị mmadụ ihe. Magazin bụ́ Maclean’s si otú a chịkọta echiche otu onye a ma ama na-ekweghị na Chineke dị: “Echiche a Ndị Kraịst nwere, nke bụ́ na e nwere ihe karịrị nkà mmụta sayensị na ihe karịrị echiche mmadụ . . . na-eme ka naanị otu ndụ a anyị nwere yie ihe na-abaghị uru, na-emekwa ka anyị na-enwe nnọọ ọchịchọ ime ihe ike.”

OLEE IHE I NWERE IKE IME? Tụlee ihe ndị na-egosi na Chineke dị. (Ndị Rom 1:20; Ndị Hibru 3:4) Ekwela ka onye ọ bụla mee ka ị kwụsị ịchọ azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa, dị ka ndị a: Olee ihe mere anyị ji dịrị ndụ n’ụwa a? Mmadụ ọ̀ na-adị ndụ mgbe ọ nwụchara? Olee ihe mere ahụhụ ji ju ebe niile? Olee ihe Chineke chọrọ m n’aka? Iji nwee afọ ojuju na-adịgide adịgide, ọ dị mkpa ka i nweta azịza na-eju afọ nke ajụjụ ndị a.

Ma, ekwerela nnọọ ihe niile ndị mmadụ na-agwa gị n’ajụghị ase. Okwu Chineke na-agba gị ume ka i jiri ‘ike iche echiche’ gị chọpụta n’onwe gị ihe dị Chineke mma. (Ndị Rom 12:1, 2) Mbọ gị agaghị efu ọhịa. Ọ bụrụ na i wepụta oge mụọ Baịbụl ma soro ndụmọdụ ya bara uru, ị ga-ezere ọtụtụ nsogbu, kwụsịlata nchekasị ị na-enwe, nwetakwuokwa obi ụtọ ná ndụ. Nke ahụ abụghị nkwa elu ọnụ. Ịmụta eziokwu banyere Chineke na nzube ya abaarala ọtụtụ nde mmadụ si n’ebe dị iche iche n’ụwa uru. Dị ka ihe atụ, gụọ akụkọ ndụ ndị dị na peeji nke 18 ruo nke 21 nke magazin a.

Ka ị na-erite uru maka iso ezi ndụmọdụ Baịbụl, ị ga-ahụkwu Chineke n’anya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị nabata agbamume Ndịàmà Jehova na-enye gị ka ha mụọrọ gị Baịbụl? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, i nwere nnọọ ike ikweta ihe a Pọl onyeozi dere: “Nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu.”—1 Timoti 6:6.

[Foto dị na peeji nke 8]

Chọpụta n’onwe gị ihe dị Chineke mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya