Ejila Echiche Ụgha Aghọgbu Onwe Gị
MGBE Iv riri mkpụrụ osisi ahụ a sị ha erila, Chineke jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ ihe a i mere?” Ọ zara, sị: “Ọ bụ agwọ duhiere m, m wee rie ya.” (Jen. 3:13) E mechara kpọọ Setan, bụ́ agwọ aghụghọ ahụ nke mere ka o nupụrụ Chineke isi, “agwọ mbụ ahụ, . . . onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpu. 12:9.
Akụkọ a dị na Jenesis na-egosi na Setan bụ onye aghụghọ nke na-agha ụgha iji duhie ndị na-amụghị anya. Nke a mere o ji ghọgbuo Iv. Ma, anyị ekwesịghị iche na ọ bụ naanị Setan nwere ike iduhie anyị. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na anyị nwere ike ‘iji echiche ụgha na-aghọgbu onwe anyị.’—Jems 1:22.
Anyị nwere ike iche na o nweghị ihe ga-eme ka anyị ghọgbuo onwe anyị. Ma, ịdọ aka ná ntị a dị n’Okwu Chineke na-egosi na nke a nwere ike ime. Ya mere, anyị kwesịrị ichebara onwe anyị echiche iji mara ihe ndị nwere ike ime ka anyị ghọgbuo onwe anyị nakwa iji mara echiche ụgha ndị nwere ike iduhie anyị. Akụkọ dị n’Akwụkwọ Nsọ nwere ike inyere anyị aka ime nke a.
Ha Ghọgburu Onwe Ha
N’ihe dị ka n’afọ 537 T.O.A., Saịrọs, bụ́ Eze Ukwu na-achị Peshia, nyere iwu ka ndị Juu a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn laghachi Jeruselem ma wughachi ụlọ nsọ Jehova. (Ezra 1:1, 2) N’afọ 536 T.O.A, ha tọrọ ntọala ụlọ nsọ ọhụrụ, nke bụ́ ihe Jehova chọrọ ka ha mee. Ụmụ Izrel ahụ lọghachirinụ ṅụrịrị ọṅụ ma too Jehova maka otú o si nyere ha aka ịmalite ọrụ ahụ dị mkpa. (Ezra 3:8, 10, 11) Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị ọrụ ahụ ha na-arụ na-adịghị mma n’obi malitere ịkpagbu ha, nke a kụdakwara ha obi. (Ezra 4:4) Mgbe ihe dị ka afọ iri na ise gafere ka ha lọtachara Babịlọn, ndị ọchịchị Peshia kwụsịrị ọrụ niile a na-arụ na Jeruselem. Ndị na-achị Juda na ala ndị dị ya nso rutere Jeruselem wee “jiri ngwá agha mee ka [ndị Juu] kwụsị ọrụ.”—Ezra 4:21-24.
Nke a mere ka ndị Juu malite iji echiche ụgha na-aghọgbu onwe ha. Ha gwara onwe ha, sị: “Oge erubeghị, oge a ga-ewu ụlọ Jehova.” (Hag. 1:2) Obi ha bụ na Chineke achọghị ka ha wughachi ụlọ nsọ ahụ ozugbo. Kama ichebara otú ha ga-esi mee uche Chineke echiche, ha hapụrụ ọrụ o nyere ha wee malite itinye obi ha niile n’ime ka ụlọ nke ha dịkwuo mma. Onye amụma Chineke bụ́ Hagaị jụrụ ha ajụjụ n’ezoghị ọnụ, sị: “Ugbu a ọ̀ bụ oge unu onwe unu ga-ebi n’ụlọ unu e ji osisi machie ahụ́ ya, ebe ụlọ a [ya bụ, ụlọ nsọ Jehova] bụ mkpọmkpọ ebe?”—Hag. 1:4.
Ò nwere ihe ị mụtara n’akụkọ a? Anyị nwere ike ileghara ihe ndị metụtara ofufe Chineke anya wee malite ịchụ ihe nke onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị ejighị oge Chineke zubere ka e jiri mee ihe kpọrọ ihe. Ka e were ya na ị na-atụ anya ndị ọbịa. Ị ga-arụsiwe ọrụ ike iji kwadebe maka ọbịbịa ha. Ma, ka ị na-eme ihe ndị a, gị anụ na ha ga-egbu oge tupu ha abịa. Ị̀ ga-akwụsị ịkwadebe maka ọbịbịa ha?
Chetakwa na Hagaị na Zekaraya nyeere ndị Juu aka ịmata na Jehova ka chọrọ ka ha wughachi ụlọ nsọ ahụ n’egbughị oge. Hagaị gwara ha, sị: “Dịkwanụ ike, unu niile bụ́ ndị bi n’ala a, . . rụọkwanụ ọrụ.” (Hag. 2:4) Ha kwesịrị ịmaliteghachi ọrụ ahụ ma nwee obi ike na mmụọ Chineke ga-akwado ha. (Zek. 4:6, 7) Akụkọ a ò nwere ike inyere anyị aka ile ụbọchị Jehova anya otú Jehova si ele ya?—1 Kọr. 10:11.
Na-eche Echiche Ziri Ezi Ọ Bụghị nke Ụgha
N’akwụkwọ nke abụọ Pita onyeozi dere, o kwuru banyere oge Jehova ga-eme ka e nwee “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13) O kwuru na ndị ụfọdụ ndị na-akwa emo mere ka ndị mmadụ nwewe obi abụọ ma Chineke ọ̀ ga-ebibi ụwa n’eziokwu. Ha kwuru na o nweghị ihe ga-eme, na ‘ihe niile dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.’ (2 Pita 3:4) Pita chọrọ ka a mata na ihe a ha kwuru abụghị eziokwu. Nke a mere o ji dee na ya ‘na-akpali ezi ikike iche echiche Ndị Kraịst site n’ichetara ha ihe.’ O chetaara ha na ihe ndị ahụ na-akwa emo kwuru abụghị eziokwu. N’oge ochie, Chineke tinyere aka n’ihe ụmụ mmadụ na-eme wee weta iju mmiri bibiri ndị ajọ omume.—2 Pita 3:1, 5-7.
N’afọ 520 T.O.A., Hagaị gwara ndị Juu ahụ kwụsịrị iwu ụlọ nsọ n’ihi nkụda mmụọ ihe yiri ihe a Pita gwara Ndị Kraịst. Ọ gbara ha ume, sị: “Chebaranụ ụzọ unu echiche.” (Hag. 1:5) Iji mee ka ụmụnna ya chebara ihe ọ na-agwa ha echiche, o chetaara ha nzube Chineke nakwa nkwa o kwere ndị ya. (Hag. 1:8; 2:4, 5) N’oge na-adịghị anya ka ọ gbachara ha ume a, ha maliteghachiri iwu ụlọ nsọ ahụ n’agbanyeghị na ọchịchị Peshia kwụsịrị ha ọrụ. Ndị iro bịara ọzọ ka ha meghasịa ọrụ ahụ, ma, ọ gazirighị ha. Ndị ọchịchị nyere iwu ka a maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ, e wuchakwara ya n’afọ ise.—Ezra 6:14, 15; Hag. 1:14, 15.
Ichebara Ụzọ Anyị Echiche
Ì chere na obi nwere ike ịkụda anyị mgbe ihe siiri anyị ike dị ka o mere ndị Juu n’oge Hagaị nọ ndụ? Ọ bụrụ na nke a emee anyị, o nwere ike isiri anyị ike ịnọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma. Olee ihe nwere ike ịkụda anyị obi? Anyị nwere ike ịta ahụhụ n’ihi ikpe na-ezighị ezi juru n’ụwa a. Chegodị banyere Habakọk, bụ́ onye jụrụ, sị: “Ruo ole mgbe ka m ga na-akpọku gị ka i nyere m aka napụta m n’ihe ike, ma ị dịghị azọpụta m?” (Hab. 1:2) Ihe ndị ụfọdụ na-ele anya dị ka igbu oge nwere ike ime ka Onye Kraịst chewe na ụbọchị Jehova ka dị anya wee malite ibute ikpori ndụ ụzọ ná ndụ ya. Ihe a ò nwere ike ime gị? Anyị na-aghọgbu onwe anyị ma anyị na-eche na ụbọchị Jehova ka dị anya. Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị na-aṅa ntị n’ihe ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru, ya bụ, ka anyị ‘chebara ụzọ anyị echiche’ nakwa ka a ‘kpalie ezi ikike iche echiche anyị.’ Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Ò kwesịrị ịtụ m n’anya na ajọ ụwa Setan adịteela aka karịa otú m tụrụ ya?’
Oge Baịbụl Kwuru na A Ga-eji Na-echere
Chebagodịrị ihe Jizọs kwuru banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a echiche. Akwụkwọ Mak gosiri na mgbe Jizọs na-ebu amụma banyere oge ikpeazụ ọ gbara anyị ume ugboro ugboro ka anyị nọrọ na nche. (Mak 13:33-37) Ịdọ aka ná ntị yiri nke a dị n’amụma na-ekwu otú ụbọchị Jehova ga-adị n’Amagedọn. (Mkpu. 16:14-16) Gịnị mere e ji nye ịdọ aka ná ntị a ugboro ugboro? Ọ bụ n’ihi na ọ naghị esi ike ụmụ mmadụ eleghara ihe ha na-atụ anya ya anya ma ọ bụrụ na ihe ahụ abịaghị mgbe ha tụrụ anya ya.
Jizọs mere ihe atụ na-egosi na anyị kwesịrị ịnọ ná nche mgbe niile ka anyị na-echere ọgwụgwụ nke usoro ihe a. O kwuru banyere otu onye nwe ụlọ nke onye ohi bịara ohi n’ụlọ ya. Olee ihe ọ gaara eme ka onye ohi ahụ ghara izu ya ohi? Ọ gaara amụrụ anya abalị ahụ dum onye ohi ahụ ga-abịa. Jizọs nyere anyị ndụmọdụ mgbe ọ na-apịachi ihe atụ ahụ. Ọ sịrị: “Dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Mat. 24:43, 44.
Ihe atụ ahụ na-egosi na anyị kwesịrị ịdị njikere ichere ụbọchị Jehova, ọ bụrụgodị na ọ dịla anya anyị nọ na-eche ya. Anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị na e bibibeghị ụwa ọjọọ a. Anyị ekwesịghị iji echiche ụgha na-aghọgbu onwe anyị wee na-asị na ‘oge Jehova erubeghị.’ Echiche dị otú a ga-eme ka anyị kwụsị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze.—Rom 12:11.
Otú Anyị Ga-esi Akwụsị Echiche Ụgha
Ihe e dere ná Ndị Galeshia 6:7 ga-enyere anyị aka ịkwụsị iche echiche ụgha. Ebe ahụ sịrị: “Unu ekwela ka e duhie unu . . . Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.” Ọ bụrụ na a kụghị ihe n’ubi, ahịhịa ga-etochi ya. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị akpalighị ezi ikike iche echiche anyị, anyị nwere ike malite iche echiche ụgha. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgwa onwe anyị, sị: ‘Ama m na ụbọchị Jehova ga-abịa, ma, ọ bụghị ugbu a.’ Ọ bụrụ na anyị esi otú a kwụsị ịtụsi anya ụbọchị Jehova ike, o nwere ike ime ka anyị kwụsị iji ihe ndị metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ka oge na-aga, anyị nwere ike ileghara ihe ndị anyị na-eme n’ọgbakọ anya. Nke a nwere ike ime ka ụbọchị Jehova bịakwasị anyị na mberede.—2 Pita 3:10.
Ma, anyị agaghị na-eche echiche ụgha ma ọ bụrụ na mgbe niile anyị ‘na-achọpụta n’onwe anyị ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.’ (Rom 12:2) Otu n’ime ihe ndị ga-akacha enyere anyị aka ime nke a bụ ịgụchi Okwu Chineke anya. Akwụkwọ Nsọ ga-emekwu ka o doo anyị anya na mgbe niile, Jehova ga-eme ihe n’oge ọ kara aka.—Hab. 2:3.
Inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ikpe ekpere, ịgachi ọmụmụ ihe anya, na ịrụrụ ndị ọzọ ọrụ obiọma, bụ́ ihe ndị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya, ga-enyere anyị aka ‘iburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.’ (2 Pita 3:11, 12) Jehova ga-ahụ otú anyị si na-anụ ọkụ n’obi n’ofufe ya. Pọl onyeozi chetaara anyị, sị: “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”—Gal. 6:9.
N’eziokwu, ugbu a abụghị oge anyị ga-eji echiche ụgha na-aghọgbu onwe anyị wee na-eche na e yigharịala ụbọchị Jehova. Kama nke ahụ, ọ bụ oge anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso.
[Foto dị na peeji nke 4]
Hagaị na Zekaraya gbara ndị Juu ume ka ha malite iwu ụlọ nsọ Chineke
[Foto dị na peeji nke 5]
Gịnị ka onye nwe ụlọ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ ma na onye ohi na-abịa izu ohi n’ụlọ ya?