Olee Mgbe E Dere Baịbụl?
Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ihe karịrị ijeri mmadụ atọ ndị bi n’ụwa weere ya ka akwụkwọ dị nsọ. E kwuola na ọ bụ akwụkwọ kacha aga ahịa. E bipụtala ya ihe ruru ijeri isii, n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị anọ (ma nke zuru ezu ma nke na-ezughị ezu).
Ọ BỤ EZIOKWU na Baịbụl bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha agụ n’ụwa, e nweela ọtụtụ ihe ndị mmadụ kwuru banyere oge e dere ya, nke ka nke, oge e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke a na-akpọkarị Agba Ochie. O nwere ike ịbụ na ị gụọla ụdị ihe ahụ n’akwụkwọ ma ọ bụ kirie ebe ndị ọkachamara na-ekwu banyere ya na tiivi. Lee ụfọdụ ihe ndị ọkachamara nke oge anyị a kwurula.
▪ ‘E dere Baịbụl n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga, bụ mgbe ndị amụma bụ́ Aịzaya na Jeremaya dịrị ndụ.’
▪ ‘Kemgbe narị afọ abụọ gara aga, ndị ọkà mmụta na-ekwu na e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru n’agbata oge ndị Peshia na ndị Gris na-achị ụwa (n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ anọ na puku afọ abụọ na otu narị afọ gara aga).’
▪ ‘E dere Akwụkwọ Nsọ Hibru niile e nwere taa n’oge ndị Gris na-achị ụwa (n’ihe dị ka puku afọ abụọ na otu narị afọ gara aga).’
Olee otú Onye Kraịst bụ́ onye kweere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke” ga-esi lee ihe ndị a dị iche iche a na-ekwu anya? (2 Timoti 3:16) Ka anyị leba anya n’ihe ndị ahụ ha na-ekwu iji mata azịza ya.
Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Oge E Dere Ya
Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru ọtụtụ ihe banyere oge ihe ndị e dere na ya mere. Ihe ndị a na-egosi na e dere akwụkwọ Baịbụl ndị mbụ mgbe Mozis na Jọshụa nọ ndụ, nke bụ́ ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga.a Samuel, Devid, Sọlọmọn, na ndị ọzọ dere ndị nke ha n’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga. Akwụkwọ ndị ọzọ e dere mgbe e dechara ndị nke ahụ bụ akwụkwọ ndị kọrọ ihe mere ná ndụ ụmụ Izrel, na akwụkwọ ndị dị ka Abụ Ọma na Ilu, nakwa akwụkwọ ndị amụma. E dere ha n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asatọ na puku afọ abụọ na narị afọ anọ gara aga.
Akwụkwọ ndị a, ma ọ bụ iberibe ha ụfọdụ, ma e wezụga akwụkwọ Esta, so n’akwụkwọ ndị a hụrụ n’akụkụ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. A na-akpọ ha Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ndị ọkà mmụta ji ụzọ ọgbara ọhụrụ ndị e si achọpụta afọ ole ihe nọrọla mata na e dere akwụkwọ mpịakọta ndị kacha ochie n’ime ha n’ihe dị ka puku afọ abụọ na otu narị afọ gara aga.
Ihe Ndị Na-akatọ Baịbụl Na-ekwu
Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere na ụfọdụ ndị ekwetaghị n’oge Baịbụl kwuru na e dere akwụkwọ ndị dị na Baịbụl bụ na Baịbụl kwuru na e si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee ya. Ọkachamara bụ́ Walter C. Kaiser, Jr., dere banyere nke a n’akwụkwọ ya, sị: “Ihe mere na e kwesịghị ikwere n’ihe e dere na [Baịbụl] bụ na Baịbụl kwuru na e si n’ike mmụọ nsọ dee ya, kwuo banyere Chineke, kwuokwa banyere ọrụ ebube dị iche iche.” Ndị ọkà mmụta ndị na-ekweghị na Chineke na-ekwu na e kwesịrị inyocha Baịbụl nke ọma iji mata ma ihe o kwuru ọ̀ bụ eziokwu, dị ka a na-eme akwụkwọ ndị ọzọ.
O nwere mgbe e ji ozizi evolushọn, nke kwuru na mmadụ si n’otu ihe ghọọ ihe ọzọ, gbanwegide ghọọ mmadụ, akọwa otú ụmụ mmadụ si jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee otú ha si efe ofufe. E kwuru na ụmụ mmadụ bu ụzọ fewe ụmụ anụmanụ, e mechaa ha efewe ọtụtụ chi, mechazie fewe otu Chi. Ma, ebe ọ bụ na akwụkwọ Baịbụl ndị e bu ụzọ dee kọrọ na ndị mmadụ fere otu Chi, ụfọdụ ndị na-ekwuzi na ọ ga-abụrịrị na oge Baịbụl kwuru na e dere akwụkwọ ndị ahụ agafechaala tupu e dee ha.
Kemgbe ahụ, e nweela ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ sizi akatọ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ ọkọwa okwu e bipụtara ná nso nso a, bụ́ nke na-akọwa okwu ndị dị n’Agba Ochie, kwuru nnọọ otú ndị ọkà mmụta dị iche iche sizi akatọ Baịbụl. Ụfọdụ na-akatọ otú e si dee ya, ụfọdụ na-ekwu na ihe ndị a kọrọ na ya emeghị eme, ndị ọzọ na-ekwukwa na otú e si kọọ ihe ndị a kọrọ na ya adịghị mma, ndị ọzọ na-akatọkwa ya n’ụzọ ndị ọzọ.
Ọ bụ eziokwu na oge ndị ọkà mmụta kwugasịrị na e dere akwụkwọ ndị dị na Baịbụl dị iche iche, ọtụtụ n’ime ha kwetara ihe Prọfesọ R. E. Friedman kwuru. O dere, sị: “Ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị dere akwụkwọ n’oge ochie dere ọtụtụ akụkọ, abụ na iwu. Ndị ọzọ na-ede ihe lekwasịziri anya n’ihe ndị ahụ ha dere dee Baịbụl.”
Akwụkwọ bụ́ Faith, Tradition, and History kwuru ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si akatọ Baịbụl, tinyere ndị nke a anyị kwuru okwu ha. Ma o kwuziri, sị: “Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị ọkà mmụta ekweghị n’Akwụkwọ Nsọ, ha kwenyesiri ike n’ihe ndị ha na-ekwu, ma ha na-akatọkwa nnọọ ihe ndị ọkà mmụta ibe ha na-ekwu.”
Ihe Ndị Na-egosi na Mgbe Baịbụl Kwuru na E Dere Ya Bụ Eziokwu
E dere akwụkwọ Baịbụl ndị mbụ n’ihe ndị na-emebi ngwa ngwa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya na akwụkwọ ndị mbụ ahụ e dere n’oge Mozis, Jọshụa, Samuel, ma ọ bụ Devid ka dị. Ma e nwere ihe ndị ọzọ nwere ike inyere anyị aka ikweta na oge Baịbụl kwuru na e dere ya bụ eziokwu. Ihe ndị ahụ enyerela ọtụtụ ndị ọkà mmụta a ma ama na ndị ọkachamara ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie aka ikweta. Gịnị bụ ihe ndị ahụ? Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha.
▪ Mgbe Mozis na Jọshụa dịrị ndụ, nke bụ́ ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, è bidola ide ihe n’akwụkwọ ná mba ndị dị ka Ijipt na Izrel oge ochie otú ahụ Baịbụl kwuru? Ndị Ijipt na ndị Mesopotemia oge ochie dere ọtụtụ ihe banyere okpukpe ha, otú ha si ekpe ikpe, ihe ndị mere eme, na ihe ndị ọzọ. Oleekwanụ maka Mozis na ụmụ Izrel? Akwụkwọ bụ́ Dictionary of the Old Testament: Pentateuch, sịrị: “E nweghị ihe mere anyị ga-eji kwuo na e nweghị ihe e dere ede na Kenan oge ochie [ihe dị ka afọ 1550 ruo 1200 T.O.A.].” O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na e jiri ihe ndị e dere n’oge gboo tụnyere ihe ndị e kwuru na Mozis dere, o nweghị ihe mere mmadụ ga-eji kwuo na ọ bụghị Mozis dere akwụkwọ ndị e kwuru na o dere, nke a ga-ejikwanụ kwuo na ọ bụghị ndị dere akwụkwọ ndị nke ọzọ dere ha.”—Ọpụpụ 17:14; 24:4; 34:27, 28; Ọnụ Ọgụgụ 33:2; Diuterọnọmi 31:24.
▪ Ndị dere Baịbụl hà nwetara ihe ụfọdụ ha dere n’akwụkwọ ndị ọzọ e dere n’oge ochie? Ee, ụfọdụ n’ime ha kwuru banyere ‘akwụkwọ’ dị iche iche. Akwụkwọ ndị ahụ nwere ike ịbụ akwụkwọ ndị ọchịchị, akwụkwọ ndị e dere aha ezinụlọ dị iche iche, ndị nke kọrọ ọrụ dị iche iche a rụrụ, na akwụkwọ ndị kọrọ banyere agbụrụ na ezinụlọ dị iche iche.—Ọnụ Ọgụgụ 21:14; Jọshụa 10:13; 2 Samuel 1:18; 1 Ndị Eze 11:41; 2 Ihe E Mere 32:32.
▪ Gịnị mere na a hụbeghị akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ mere ochie karịa Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ? Akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review kwuru, sị: “N’Izrel oge ochie na mba ndị gbara ya gburugburu, e nweghị ihe ndị e dere n’akwụkwọ papaịrọs ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ ka dịnụ taa, ma e wezụga nke ahụ a hụrụ n’ógbè Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ bụ́ ebe mmiri na-anaghị ezokarị. Akwụkwọ papaịrọs na akpụkpọ anụ na-erekasị erekasị ma ha dịrị n’ala na-ede mmiri. Na o nwebeghị nke a hụrụ n’ime ihe ndị ahụ e dere ede apụtakwanụghị na o nweghị mgbe e dere ha.” A hụdịla ọtụtụ ụrọ ndị e ji emechi akwụkwọ e dere ihe. Ọkụ ma ọ bụ ájá emebisiela akwụkwọ papaịrọs na akpụkpọ anụ ndị e dere ihe na ha n’oge ochie, ma ụrọ ndị e ji mechie ha emebighị. Ụrọ ndị a hụrụ adịwala kemgbe ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asatọ gara aga.
▪ Olee otú Baịbụl e nwere ugbu a si ruo anyị aka? Akwụkwọ bụ́ The Bible as It Was kwuru, sị: “Ọ ga-abụrịrị na e depụtaghachiri akụkọ, abụ ọma, iwu, na amụma ndị anyị na-agụ na Baịbụl taa ọtụtụ ugboro, e depụtaghachidịrị ha n’oge ahụ a ka na-ede Baịbụl. . . . Ọ bụrụ na e depụtara ihe ndị ahụ ọtụtụ ugboro n’oge a ka na-ede Baịbụl, ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ na-agụ ha agụ n’oge ahụ; ihe ndị ahụ ha dere baara ndị mmadụ uru kwa ụbọchị. . . . O nweghị onye gaara ata ahụhụ na-edepụtaghachi ha ma ọ bụrụ na o nweghị uru ha bara.”—Diuterọnọmi 17:18; Ilu 25:1.
Ihe nke a pụtara bụ na e depụtaghachigidere akwụkwọ Baịbụl ndị e bu ụzọ dee ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu puku afọ na narị afọ ise, ya bụ, na narị afọ mbụ Oge Anyị, bụ́ mgbe e dechara Baịbụl. Akwụkwọ bụ́ On the Reliability of the Old Testament kwuru na mgbe a na-edepụtaghachi akwụkwọ n’oge ochie, a “na-edezigharị okwu ndị a na-asụpeghị nke ọma ma ọ bụ ndị a gbanwerela otú e si ede ha, deziekwa ụtọ asụsụ ha. Otú a ka ndị na-edepụtaghachi ihe ná mba Izrel oge ochie na mba ndị gbara ya gburugburu na-eme.”b Nke a na-egosi na ihe ndị na-akatọ Baịbụl na-ekwu erijughị afọ.
Olee Mgbe E Dere Baịbụl?
Ọ̀ dị mma ikwu na ebe ọ bụ na akwụkwọ ndị ahụ Mozis, Jọshụa, na Samuel na ndị ọzọ ji aka ha dee adịkwaghị, na ọ pụtara na e deghị ha n’oge Baịbụl kwuru na e dere ha? Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na ọ bụrụgodị na akwụkwọ ndị ahụ adịkwaghị, ọ pụtaghị na e nweghị mgbe e dere ha. A sị ka e kwuwe, ole n’ime ihe ndị ahụ na-emebi emebi e dere ihe na ha n’oge ochie ka e nwere ike ichekwa ruo taa? Dị ka ihe atụ, otu ọkachamara nke na-amụ banyere Ijipt oge ochie, nke aha ya bụ K. A. Kitchen, kwuru na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ihe niile ndị Ijipt oge ochie dere n’akwụkwọ papaịrọs tupu oge ndị Gris na oge ndị Rom na-achị ụwa emebichaala.
Ndị ji Baịbụl kpọrọ ihe nwekwara ike ịjụ onwe ha, sị, ‘Olee otú Jizọs si were Akwụkwọ Nsọ Hibru?’ N’oge Jizọs nọ n’ụwa, oge e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru esewebereghị ndị mmadụ okwu. O doro anya na Jizọs na ndị Juu ibe ya weere na oge Baịbụl kwuru na e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ eziokwu. Ma, Jizọs ò kwetara na ọ bụ ndị e kwuru na ọ bụ ha dere akwụkwọ ndị ahụ dere ha?
Jizọs kwuru ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ndị Mozis dere. Dị ka ihe atụ, o kwuru ihe e dere “n’akwụkwọ Mozis.” (Mak 12:26; Jọn 5:46) O kwuru ihe dị na Jenesis (Matiu 19:4, 5; 24:37-39); n’Ọpụpụ (Luk 20:37); na Levitikọs (Matiu 8:4); n’Ọnụ Ọgụgụ (Matiu 12:5); nakwa na Diuterọnọmi (Matiu 18:16). Ọ sịrị: “Ihe niile e dere n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.” (Luk 24:44) Ọ bụrụ na Jizọs kwetara na ọ bụ Mozis na ndị ọzọ dere akwụkwọ ndị ahụ, o doro anya na o kwetara na e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru mgbe Baịbụl kwuru na e dere ha.
Oleezi mgbe e dere Baịbụl? Mmadụ ò kwesịrị ikwere ihe Baịbụl kwuru banyere oge e dere ya? Anyị ahụla ihe ọtụtụ ndị ọkà mmụta ndị na-akatọ Baịbụl kwuru, hụ ihe Baịbụl n’onwe ya kwuru, hụ otú Jizọs si were Baịbụl, nakwa ihe ndị ọzọ gosiri na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Dabere n’ihe niile a anyị tụlere, ihe ị ga-aza ọ̀ ga-egosi na i kwetara na Jizọs kwuru eziokwu mgbe ọ gwara Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.”?—Jọn 17:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara oge e dere akwụkwọ Baịbụl dị iche iche na ihe ndị mere n’oge ahụ, gụọ akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Nke 1, peeji nke 447-467. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Jikọtara Ndị Odeakwụkwọ Oge Ochie na Okwu Chineke,” nke dị n’Ụlọ Nche March 15, 2007, peeji nke 18-20.
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 20-23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
(Afọ ndị e dere ebe a abụghị kpọmkwem afọ e dechara akwụkwọ Baịbụl ndị a)
2000 T.O.A.
1800
[Foto]
Ndị odeakwụkwọ e nwere n’Ijipt edewele ihe n’akwụkwọ tupu a mụọ Mozis
[Ebe E Si Nweta Foto]
© DeA Picture Library/Art Resource, NY
1600
[Foto]
Mozis dechara Jenesis n’afọ 1513 T.O.A. O dere ya n’ihe ndị na-emebi emebi
Jenesis 1513 T.O.A.
Jọshụa
1400
1200
Samuel
1000 T.O.A.
[Foto]
Ọtụtụ ụrọ ndị e ji mechie ihe ndị e dere ede n’oge ochie ka dị taa
E kwuru na ha adịwala kemgbe afọ 900 na 500 T.O.A.
Jona
800
Aịzaya
600
Jeremaya
Daniel
[Foto]
Akwụkwọ papaịrọs a pịakọtara apịakọta, kee ya eriri ma jiri ụrọ mechie ya
E dere ya n’ihe dị ka 449 T.O.A.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe ndebe ihe mgbe ochie dị na Brooklyn. Ihe Charles Edwin Wilbour hapụụrụ nwa ya nwaanyị bụ́ Theodora Wilbour
400
200
[Foto]
E ji ákwà kechie Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ma tinye ha n’ime ite ájá. Ha bụ akwụkwọ Baịbụl kacha ochie a hụrụla
E dere ya n’agbata afọ 200 na 100 T.O.A.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Shrine of the Book, Photo © The Israel Museum, Jerusalem