Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 6/15 p. 16-17
  • Ebreham Ò Nwere Kamel n’Eziokwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebreham Ò Nwere Kamel n’Eziokwu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ha Mere Uche Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Achọrọ M Iso Ya Laa”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 6/15 p. 16-17

Ebreham Ò Nwere Kamel n’Eziokwu?

BAỊBỤL kwuru na kamel so n’anụ ụlọ ndị Fero nyere Ebreham. (Jen. 12:16) Mgbe ohu Ebreham gara obodo dị anya, bụ́ Mesopotemia, ọ chịịrị “kamel iri n’ime kamel nna ya ukwu.” Anyị ahụla na Baịbụl kwuru hoo haa na Ebreham nwere kamel n’ihe dị ka puku afọ anọ gara aga.—Jen. 24:10.

Ụfọdụ ndị ekweghị na nke a bụ eziokwu. Otu akwụkwọ na-akọwa ihe e dere na Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụta ekwuola na ihe a e kwuru banyere kamel abụghị eziokwu n’ihi na ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 1200 T.O.A., ọtụtụ narị afọ ka Ebreham nwụchara, ka ndị mmadụ bidoro nwewe anụmanụ a n’ụlọ ha.” Ya bụrụ otú ahụ, a ga-ewere ihe ọ bụla Baịbụl kwuru banyere kamel tupu afọ 1200 T.O.A. ka ihe na-adabaghị n’oge e kwuru na o mere.

Ma ndị ọzọ, bụ́kwa ndị ọkà mmụta, kwuru na n’agbanyeghị na ọ bụ n’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga ka ndị mmadụ bidoro nwewe kamel n’ụlọ ha, ọ pụtaghị na e nweghị ndị nwere kamel tupu mgbe ahụ. Akwụkwọ kwuru banyere mba Izrel oge ochie sịrị: “Ihe ndị a chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya gosiri na e nwere ndị nwere kamel n’ụlọ ha n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Arebia ihe karịrị puku afọ anọ gara aga. Na mbụ, ọ ga-abụ na ihe mere ndị mmadụ ji enwe ya bụ ka ha nweta mmiri ara ya, ajị ya, akpụkpọ ya, na anụ ya. Ma, o nwere ike ịbụ na o teghị aka ha amata na e nwekwara ike iji ya na-ebu ibu.” O yiri ka ọkpụkpụ na ihe ndị ọzọ e gwupụtara n’ala hà na-egosi n’eziokwu na ndị mmadụ enwewela kamel n’ụlọ ha tupu oge Ebreham dịrị ndụ.

E nwekwara ihe ndị e dere ede gosiri na nke a bụ eziokwu. Akwụkwọ ahụ kwuru banyere mba Izrel oge ochie kwukwara, sị: “Na Mesopotemia, a kpọrọ aha anụmanụ ahụ, [ya bụ kamel,] n’ihe e dere na cuneiform, e sekwara ya n’ọtụtụ stampụ a na-esu n’akwụkwọ, nke gosiri na o nwere ike ịbụ na e nwere anụmanụ a na Mesopotemia n’ihe dị ka puku afọ anọ gara aga,” ya bụ, n’oge Ebreham dịrị ndụ.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na ndị ahịa ndị si na Saụt Arebia, bụ́ ndị na-ere insensi, ji kamel si n’ọzara buga ngwá ahịa ha ná mba ndị dị n’ebe ugwu Saụt Arebia. Ọ ga-abụ na ha gara Ijipt nakwa Siria, si otú ahụ mee ka ndị nọ n’ebe ndị a mara ihe bụ́ kamel. O nwere ike ịbụ na a malitere ịgba ahịa a n’afọ 2000 T.O.A. Ọ dị mma ịmara na Jenesis 37:25-28 kwuru okwu banyere ndị ahịa, bụ́ ndị Ishmel, ndị na-eji kamel ebuga ihe ndị e ji eme insensi n’Ijipt mgbe ihe dị ka otu narị afọ gara ka Ebreham nwụchara.

O nwere ike ịbụ na ihe dị ka puku afọ anọ gara aga, ọtụtụ ndị enweghị kamel ná mba Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ma, e nwere ihe ndị gosiri na nke a apụtaghị na e nweghị ndị ma ihe ọ bụ. N’ihi ya, akwụkwọ ọzọ na-akọwa ihe e dere na Baịbụl kwuru na e kwesịghịzi ile ihe Baịbụl kwuru banyere kamel anya ka ihe na-adabaghị n’oge e kwuru na o mere, ebe e nwere ọtụtụ ihe ndị e gwupụtara n’ala ndị na-egosi na ndị mmadụ enwewela kamel n’ụlọ ha tupu oge Ebreham dịrị ndụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya