Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 8/1 p. 13
  • “Ọ Na-echeta na Anyị Bụ Ájá”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Na-echeta na Anyị Bụ Ájá”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Na-efe Chineke Onye Ebere Ya “Na-enweghị Atụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • “Nna Unu Na-eme Ebere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jehova Na-echeta na Anyị Bụ Ájá
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 8/1 p. 13

Bịaruo Chineke Nso

“Ọ Na-echeta na Anyị Bụ Ájá”

OTU nwaanyị bụ́ Onye Kraịst dere banyere mmehie o mere n’oge gara aga, sị: “Ekwetaghị m na Jehova ga-agbaghara m kpamkpam, echekwara m na obi m ga na-ama m ikpe ruo mgbe m nwụrụ.” N’eziokwu, obi anaghị eru onye ọ bụla akọnuche ya na-apịa ụtarị ala. Ma, Baịbụl kwuru ihe nwere ike ime ka obi dajụọ ndị mmehie chegharịrịnụ. Ka anyị tụlee ihe ọbụ abụ bụ́ Devid dere n’Abụ Ọma 103:8-14.

Devid maara na “Jehova dị ebere,” marakwa na ọ naghị ‘ahụta mmejọ anyị mgbe niile.’ (Amaokwu nke 8-10) Ọ bụrụ na Chineke ahụ ezigbo ihe mere ọ ga-eji meere onye mmehie ebere, ọ na-agbaghara onye ahụ kpamkpam. Devid, onye bụ́ ọkà n’ide abụ, mere ihe atụ atọ ndị gosiri otú ebere Chineke na-emere anyị si dị ukwuu.

“Dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka obiọma o nwere n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ si dị elu.” (Amaokwu nke 11) Ọ bụrụ na anyị elee anya n’eluigwe n’abalị, anyị agaghị aghọtali otú eluigwe dịruru anya n’ụwa. Devid si otú a mee ka anyị ghọta na ebere Jehova dị ukwuu. Nke a bụ otu ụzọ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ndị Chineke na-emere ebere a bụ “ndị na-atụ egwu” ya, ya bụ, “ndị ji obi umeala na obi ha niile na-asọpụrụ ya,” dị ka otu ọkà mmụta si kwuo ya.

“Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” (Amaokwu nke 12) Olee otú ọwụwa anyanwụ dịruru anya ma e si n’ọdịda anyanwụ gawa ya? Ọ dị ezigbo anya. Otu ọkà mmụta kwuru na ọ bụghị ihe e ji ọnụ ekwu; mmadụ enweghịdị ike ịghọta otú ọ dịruru anya.” Ihe Devid na-agwa anyị n’ebe a bụ na mgbe ọ bụla Chineke gbaghaara anyị mmehie anyị, ọ na-atụfu ya n’ebe dị nnọọ ezigbo anya.

“Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere.” (Amaokwu nke 13) Devid mụrụ ụmụ. Ọ maara na nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya na-emetere ụmụ ya ebere, karịchaa, ma ọ bụrụ na ha nọ ná mwute. Devid mesiri anyị obi ike na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye hụrụ anyị bụ́ ụmụ ya ndị nọ n’ụwa n’anya, ga-emere anyị ebere, nke ka nke, ma ọ bụrụ na anyị echegharịa ma jiri “obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute” rịọ ya mgbaghara.—Abụ Ọma 51:17.

Mgbe Devid kwuchara ihe atụ atọ ahụ, o kwuziri ihe mere Jehova ji emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebere. Ọ sịrị: “Ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Amaokwu nke 14) Jehova maara na ọ bụ ájá ka e ji kpụọ anyị, na anyị adịghị ike, nakwa na o nwere ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Ebe Jehova maara na anyị bụ ndị mmehie, ọ ‘dị njikere ịgbaghara anyị mmehie,’ ma ọ bụrụhaala na anyị egosi na anyị ji obi anyị niile chegharịa.—Abụ Ọma 86:5.

Ihe ndị a Devid kwuru banyere ebere Jehova ò ruru gị n’obi? Nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite mụrụ ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke si dị njikere ịgbaghara anyị mmehie. Ihe ọ mụtara mere ka o kwuo, sị: “Aghọtawala m na m nwere ike ịbịaru Jehova nso, ọ dịkwa m ka è bupụla ibu dị arọ m bu.”a Ọ̀ bụ na ọ dịghị mma ka ị matakwuo banyere ebere Chineke na ihe ndị ị ga-eme ka o ruo gị aka? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-adịkwa gị ka è bupụrụ ibu dị arọ i bu.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na baịbụl n’ọnwa ọgọst:

◼ Abụ Ọma 87-118

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke nke ‘Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie,’” n’isi nke 26 nke akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

“Aghọtawala m na m nwere ike ịbịaru Jehova nso, ọ dịkwa m ka è bupụla ibu dị arọ m bu”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya