Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 1/15 p. 3
  • Ọ Ka Bụ nke A Na-amụ Amụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Ka Bụ nke A Na-amụ Amụ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọ Nche Ọhụrụ A Na-amụ Amụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mgbanwe Ndị Magburu Onwe Ha A Ga-eme n’Ụlọ Nche!
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • E Bidola Ibipụta Ụlọ Nche Bekee nke E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Gịnị Mere E Ji Malite Ibipụta Ụlọ Nche E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 1/15 p. 3

Ọ Ka Bụ nke A Na-amụ Amụ!

Anyị agbanweela ihe ụfọdụ n’otú Ụlọ Nche nke a na-amụ na-adị ka ọ na-amakwu mma, nakwa ka o nyere gị aka ịmụta eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa si n’Okwu Chineke.—Ọma 1:2; 119:97.

Ọ bụ afọ anọ gara aga ka anyị bidoro ibipụta Ụlọ Nche nke ọhaneze na nke anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-amụ n’ọmụmụ ihe.

O nwere ihe otu nwanna nwoke jeerela Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ dere banyere Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ. O dere, sị: “Obi tọrọ m ụtọ mgbe a malitere ibipụta Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ. Ọ magburu onwe ya, ihe ọ na-akụzi na-eru m n’obi. Eziokwu ndị si na Baịbụl ọ na-akọwa anaghị apụ m apụ n’obi. Unu emeela maka ihe ọhụrụ a na-enweghị atụ.” Nwanna nwoke ọzọ dere, sị: “Ọ na-atọ m ụtọ iwepụta ezigbo oge jiri Baịbụl m na-amụ Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ.” Anyị ma na ọ dị gị otú ọ dị ụmụnna ndị a.

Ị ma na a na-ebipụta Ụlọ Nche kemgbe afọ 1879. Ihe mere ka nke a kwe omume bụ n’ihi na Jehova na-enye anyị mmụọ ya, na-agọzikwa ihe anyị na-eme. (Zek. 4:6) N’ime otu narị afọ na iri afọ atọ na atọ e bipụtawara Ụlọ Nche, e nweela ihe ụfọdụ anyị gbanwerela n’otú ihu ya na-adị. N’afọ a, bụ́ 2012, a ga na-ese ọmarịcha ihe osise n’ihu Ụlọ Nche nke ọ bụla a na-amụ amụ. Ihe a ga-ese na ya bụ ebe a na-ekwusa ozi ọma. Ọ ga na-echetara anyị ọrụ Chineke nyere anyị, ya bụ, ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Jehova. (Ọrụ 28:23) Na peeji nke 2, ị ga-ahụ foto e si na ya nweta ihe ahụ e sere n’ihu Ụlọ Nche, na ihe ole na ole e dere na-emenụ nakwa ebe ha na-eme. N’afọ a dum, ihe ndị a ga na-ese n’ihu Ụlọ Nche a ga na-echetara anyị na ndị Jehova na-ekwusa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mat. 24:14.

Olee ihe ndị ọzọ a gbanwere na magazin a? Igbe ntụleghachi ga na-adịzi ná mmalite nke isiokwu ọ bụla a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Nke a ga-enyere gị aka ịma ihe ndị ị ga-achọ ịmụta ka ị na-agụ isiokwu ahụ nakwa ka ị na-amụ ya. Ndị na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga na-ejikwa ajụjụ ndị a atụleghachi ihe ndị a mụrụ ma a mụchaa isiokwu nke ọ bụla. Ị ga-achọpụta na akụkụ peeji nke ọ bụla ehikwuola nne, nọmba peeji na nọmba paragraf ndị na-adị na ya agbakwuokwala okpotokpo.

Dị ka a kọwara na nke ọnwa a, e webatara ihe ọhụrụ anyị kpọrọ “Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie” iji nyere anyị aka ịghọta otú ihe si aga kemgbe ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke oge a bidoro. Mgbe ụfọdụkwa, akụkọ ndụ ụmụnna anyị ga na-agba n’isiokwu bụ́ “Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha.” Akụkọ ndụ ụmụnna anyị ndị ga na-agba n’isiokwu a ga-enyere anyị aka ịhụ otú ozi ha jere n’ebe a chọsiri ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ike si mee ka ha nwee ọṅụ na obi ụtọ.

Ka oge ị na-ewepụta na-eji magazin a amụ Okwu Chineke baara gị ezigbo uru.

Ndị Bipụtara Ya

[Foto dị na peeji nke 3]

1879

[Foto dị na peeji nke 3]

1895

[Foto dị na peeji nke 3]

1931

[Foto dị na peeji nke 3]

1950

[Foto dị na peeji nke 3]

1974

[Foto dị na peeji nke 3]

2008

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya