Mụta Ihe N’okwu Chineke
Gịnị Ga-eme Okpukpe Ndị E Nwere n’Ụwa?
N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.
1. Okpukpe niile hà dị mma?
N’ọtụtụ okpukpe taa, e nwere ndị ji obi ha niile chọọ ife Chineke. Chineke na-ahụ ha, ọ na-echekwa banyere ha. Ma ọ dị mwute na ụfọdụ ndị ejirila okpukpe na-akpa arụ. N’oge ndị gara aga, ụfọdụ ndị isi okpukpe mekpọrọ ndị okpukpe ọzọ ọnụ. (2 Ndị Kọrịnt 4:3, 4; 11:13-15) Akụkọ ndị anyị na-anụ taa gosiri na ụfọdụ ndị isi okpukpe na-agba ndị mmadụ ume iji bọmbụ na-atụgbusi ndị mmadụ. Ụfọdụ n’ime ha na-akwado agha ma ọ bụ na-emetọ ụmụaka.—Gụọ Matiu 24:3-5, 11, 12.
Baịbụl sịrị na e nwere okpukpe abụọ, ya bụ, ezi okpukpe na okpukpe ụgha. Okpukpe ụgha anaghị akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke. Ma, Jehova Chineke chọrọ ka ndị mmadụ mụta eziokwu banyere ya.—Gụọ 1 Timoti 2:3-5.
2. Gịnị ga-eme okpukpe ndị e nwere n’ụwa?
E nwere okpukpe ndị na-asị na ha hụrụ Chineke n’anya, ma ha anaghị akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke. Chineke achọghị ka okpukpe ndị a na-eduhie ndị mmadụ. N’eziokwu, ọ na-atọ ndị na-ekpe okpukpe ndị ahụ ụtọ ịbụ enyi nke ụwa a nke Setan bụ́ Ekwensu na-achị. (Jems 4:4; 1 Jọn 5:19) Baịbụl kwuru na okpukpe ndị na-akwado ọchịchị mmadụ kama ịkwado ọchịchị Chineke yiri nwaanyị akwụna. Ọ kpọkwara nwaanyị akwụna a “Babịlọn Ukwu ahụ.” Ebe e si nweta aha ahụ bụ n’obodo oge ochie a na-akpọ Babịlọn. Ọ bụ ebe ahụ ka okpukpe ụgha malitere mgbe Iju Mmiri oge Noa gachara. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi okpukpe niile na-eduhie ndị mmadụ ma na-emekpọ ha ọnụ. A ga-ebibi ha mgbe ha na-atụghị anya ya.—Gụọ Mkpughe 17:1, 2, 5, 17; 18:8, 23, 24.
3. Olee otú Chineke ga-esi mee ka ndị mmadụ nwee ọṅụ n’ụwa niile?
Mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha bụ ozi ọma. Ọ ga-eme ka a kwụsị ịna-emegbu ndị mmadụ n’ụwa niile. Okpukpe ụgha agaghịzi na-eduhie ndị mmadụ ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. Ndị niile bi n’ụwa ga na-efe naanị otu ezi Chineke.—Gụọ Aịzaya 11:9; Mkpughe 18:20, 21; 21:3, 4.
4. Gịnị ka ndị chọrọ iji obi ha niile fee Chineke kwesịrị ime?
Jehova echefubeghị ndị niile chọrọ iji obi ha niile fee ya, bụ́ ndị ka nọ n’okpukpe ụgha ndị e nwere n’ụwa niile. Ọ na-akpọbata ndị dị otú ahụ n’ọgbakọ ya. Ọ na-akụziri ha eziokwu dị na Baịbụl nke na-eme ka ha dịrị n’otu.—Gụọ Maịka 4:2, 5.
Jehova na-akpọbata ndị niile chọrọ ife ya n’ọgbakọ ya. Ọ bụrụgodị na obi adịghị ndị ikwu na ibe anyị mma mgbe anyị bidoro ife ya, e nwere ọtụtụ uru anyị ga-erite ma anyị nọgide na-ejere ya ozi. Anyị na Chineke ga-adị ná mma, anyị ga-eso ‘n’ezinụlọ’ Chineke ndị hụrụ ibe ha n’anya, nweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Gụọ Mak 10:29, 30; 2 Ndị Kọrịnt 6:17, 18.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 15 na nke 16 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]
Akwụkwọ bụ́ The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck