Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 7/1 p. 3
  • È Nwere Onye Na-anụ Ekpere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Onye Na-anụ Ekpere?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ha Ji Enwe Obi Abụọ?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Okwu mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 7/1 p. 3

È Nwere Onye Na-anụ Ekpere?

“M na-enwebu obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị. Ma m na-ekpekwa ekpere mgbe ụfọdụ. Amaghị m ma è nwere onye na-ege m ntị, ma ọ na-adị m ka ya bụrụ na e nwere onye na-ege m ntị. Obi anaghị adị m ụtọ, ndụ m enweghịkwa isi. Obi akaghị m ikweta na Chineke dị n’ihi na m chere na ọ bụ naanị ndị na-amaghị nke a na-akọ kweere na Chineke.”—PATRICIA,a ONYE AYALAND.

È NWERE mgbe ọ na-adị gị otú ahụ ọ dị Patricia? Ị̀ na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ n’agbanyeghị na ị na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị? Cheta na ọ bụghị naanị gị ka ọ na-adị otú ahụ. Legodị ihe a chọpụtara.

◼ Na Briten, a gbara puku mmadụ abụọ na narị abụọ ajụjụ ọnụ. Ma, ọ bụ naanị ihe dị ka narị mmadụ ise kwetara na e nwere Onye kere ụwa, nakwa na ọ na-anụ ekpere. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe dị ka otu puku mmadụ na narị abụọ n’ime ndị ahụ a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ.

◼ Mgbe a gbara puku mmadụ iri ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị si ná mba dị iche iche n’ụwa, e nwere ndị kwuru na ha ekweghị na Chineke. N’ime ndị ahụ na-ekweghị na Chineke, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla n’ime ha kwuru na ya na-ekpe ekpere.

Gịnị Mere Ha Ji Enwe Obi Abụọ?

Otu onye Ingland aha ya bụ Allan kwuru, sị: “M na-ekwubu na ekweghị m na Chineke n’ihi na echere m na ihe mere e ji nwee okpukpe dị iche iche n’ụwa bụ iji ha kpaa ego nakwa iji ha na-atụrụ ndị mmadụ ihe ha ga-eme. Echekwara m na ọ bụrụ na Chineke dị, a garaghị enwe ọtụtụ ihe ọjọọ n’ụwa. Ma mgbe ụfọdụ, m na-anọrọ onwe m gwa ‘onye m na-amaghị okwu.’ M na-ajụkwa onwe m, sị, ‘Gịnị mere m ji dịrị ndụ n’ụwa?’”

Onye ọ bụla ọ dị otú ọ dị Allan nwere ihe mere o ji enwe obi abụọ ma è nwere onye na-anụ ekpere. Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị mmadụ ji eche na o nweghị onye na-anụ ekpere bụ na e nwere ọtụtụ ajụjụ ndị ha na-amaghị azịza ha. Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ bụ:

◼ È nwere Onye kere ihe niile?

◼ Gịnị mere okpukpe ndị e nwere n’ụwa a ji akpatakarị nsogbu?

◼ Gịnị mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ?

Ọ bụrụ na ị mata azịza nke ajụjụ ndị a, obi ọ̀ ga-esikwu gị ike ikpe ekpere?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya