ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA MOZIS?
Ònye Bụ Mozis?
Gịnị na-agbata gị n’obi ma ị nụ aha ahụ bụ́ Mozis? Ọ̀ bụ . . .
nwa ọhụrụ nne ya nyiwere n’ime nkata ma dọsa ya n’akụkụ Osimiri Naịl?
nwata nwoke ada Fero zụrụ n’obí eze nke na-echefughị na ya bụ onye Izrel?
nwoke nọ n’obodo Midian zụọ atụrụ afọ iri anọ?
nwoke ya na Jehovaa kparịtara ụka n’ihu osisi ogwu nke na-enwu ọkụ?
nwoke obi kara nke gara n’ihu eze Ijipt ma gwa ya ka ọ hapụ ụmụ Izrel na-agbara ya ohu ka ha laa?
nwoke Chineke dunyere ka ọ gaa gwa eze Ijipt Ihe Otiti Iri a ga-eti ndị Ijipt mgbe eze ahụ mara Chineke aka?
nwoke du ndị Izrel si n’Ijipt pụta?
nwoke Chineke si n’aka ya kewaa Osimiri Uhie?
nwoke Chineke si n’aka ya nye ụmụ Izrel Iwu Iri?
IHE niile a mere ná ndụ Mozis. Ka a sịkwa ihe mere Ndị Kraịst, ndị Juu, na ndị Alakụba ji akwanyere ya ezigbo ùgwù!
O doro anya na Mozis bụ onye amụma nke ‘rụrụ ọrụ dị ike.’ (Diuterọnọmi 34:10-12) O kwere ka Chineke were ya rụọ ọtụtụ ọrụ dị egwu. Ma nke a apụtaghị na Mozis karịrị ụmụ mmadụ ndị ọzọ. Mozis nwere “ụdị mmetụta anyị na-enwe” otú ahụ Ịlaịja onye amụma nwekwara. Ọ bụ ya na Ịlaịja ka Pita, Jems, na Jọn hụrụ n’ọhụụ n’oge Jizọs nwoghara n’otu ugwu. (Jems 5:17; Matiu 17:1-9) Ọtụtụ n’ime nsogbu ndị na-abịara anyị taa bịakwaara Mozis. Ma o merichara ha.
Ị̀ ga-achọ ịmata otú o si merie nsogbu ndị bịaara ya? Ka anyị leba anya n’àgwà ọma atọ ndị Mozis nwere na ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.
a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.