Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w16 Ọgọst p. 20-24
  • Ị̀ Ghọtara na I Kwesịrị Ịna-emekwu Nke Ọma n’Ọgbakọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ghọtara na I Kwesịrị Ịna-emekwu Nke Ọma n’Ọgbakọ?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE IMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ PỤTARA
  • NA-AGBA MBỌ KA Ị NA-EMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ
  • JISIE IKE, ADALA MBÀ
  • NA-EMEKWU NKE ỌMA N’OZI ỌMA
  • KA OTÚ I SI EME NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ GOSI NA Ị NA-ETO JEHOVA
  • Ndị Na-eto Eto, Na-emekwunụ Nke Ọma ma Unu Mechaa Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Otú Ị Ga-esi Ekpebi Ihe Ndị Ị Ga-emekwu n’Ofufe Jehova ma Mee Ha
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
w16 Ọgọst p. 20-24
Ebe ụmụnna nwaanyị atọ ji ekwentị na-ezi ozi ọma na ebe otu nwa agbọghọ na-ege ntị n’ozi ọma

Ị̀ Ghọtara na I Kwesịrị Ịna-emekwu Nke Ọma n’Ọgbakọ?

“Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe.”—1 TIM. 4:13.

ABỤ: 45, 70

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ?

  • Olee otú ị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ n’adaghị mbà?

  • Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ịgbanwe iji na-emekwu nke ọma n’ozi ọma?

1, 2. (a) Olee otú Aịzaya 60:22 si na-emezu n’oge ikpeazụ a? (b) Olee mkpa e nwere ugbu a ná nzukọ Jehova?

AỊZAYA 60:22 sịrị: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.” Amụma a na-emezu n’oge ikpeazụ a. N’eziokwu, n’afọ ije ozi 2015, nde mmadụ asatọ, narị puku abụọ na iri abụọ, otu narị na ise kwusara ozi ọma n’ụwa niile. Ihe ikpeazụ e kwuru n’amụma ahụ kwesịrị ịgbasa onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst, n’ihi na Nna anyị nke eluigwe kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” Otú ahụ ndị nọ́ n’ụgbọala na-ama ma ọ gbasiwe ike ka anyị na-ahụ otú e si na-agbapụ ozi ọma ahụ ọsọ. N’ihi ya, gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-eme? Ànyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke? Ọtụtụ ụmụnna na-edejupụta akwụkwọ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị na-akwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ma ọ bụ soro na-arụ ihe ndị ọzọ a na-arụ ná nzukọ Jehova?

2 Anyị na-ahụkwa ihe gosiri na a chọkwuru ndị ọrụ. A na-ehiwe ihe dị́ ka puku ọgbakọ abụọ n’afọ ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ bụ ndị okenye ise ga na-eje ozi n’ọgbakọ nke ọ bụla, ọ pụtara na kwa afọ, puku ndị ohu na-eje ozi iri kwesịrị ịgbalịsi ike ka ha ruo eruo ịbụ ndị okenye. Ọ pụtakwara na ọ ga-adị mkpa ka ọtụtụ puku ụmụnna ruo eruo ịbụ ndị ohu na-eje ozi. Ihe ọzọ bụ na, ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị ‘nwere ọtụtụ ihe anyị ga-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58.

IHE IMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ PỤTARA

3, 4. Gịnị ka ị ghọtara imekwu nke ọma n’ọgbakọ pụtara?

3 Gụọ 1 Timoti 3:1. N’amaokwu a, okwu Grik e si sụgharịta “na-agbalị” pụtara mmadụ ịmatị aka ka o were ihe, ikekwe ihe dị́ n’ebe aka ya na-erughị. Pọl ji okwu ahụ mee ka o doo anya na onye chọrọ ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike. Chegodị banyere nwanna na-eche gbasara ihe ọ ga-abụ n’ọgbakọ n’ọdịnihu. O nwere ike ọ bụbeghị ohu na-eje ozi, ma ọ ghọtara na ya kwesịrị ịna-akpakwu àgwà ka Onye Kraịst. Ọ ga-ebu ụzọ gbalịsiwe ike ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi. Ka oge na-aga, ọ ga-ebu n’obi na ọ ga-eru eru ịbụ okenye. Ọ ga na-agbasi mbọ ike ka o ruo eruo ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ.

4 Otú ahụkwa ka ụmụnna ndị chọrọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ, ndị na-eje ozi na Betel, ma ọ bụ ndị na-enyere ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka kwesịrị ịna-agba mbọ ka ha ruo eruo. Ka anyị leba anya n’otú Baịbụl si gbaa anyị niile ume ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ.

NA-AGBA MBỌ KA Ị NA-EMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ

5. Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi jiri ike ọkpụkpụ aka ha na-ejere Jehova ozi?

5 Ndị na-eto eto nwere ike ọkpụkpụ aka ha ga-eji na-ejekwuru Jehova ozi. (Gụọ Ilu 20:29.) Na Betel, ụfọdụ ndị na-eto eto na-arụ n’ebe a na-ebi Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ. Ọtụtụ ụmụnna bụ́ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, sorokwa na-arụzi ndị nke a chọrọ ịrụzi. Ụfọdụ na-eso enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. E nwekwara ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-amụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ gaa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’obodo ọzọ.

6-8. (a) Olee otú otu nwa okorobịa si gbanwee otú o sibu ele ozi Chineke anya, oleekwa uru ọ baara ya? (b) Olee otú anyị nwere ike isi ‘detụ Jehova ire, hụ na ọ dị mma’?

6 O nwere ike ịbụ na ị ghọtara na ọ dị mkpa ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere Chineke ozi. Ma, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu nwanna aha ya bụ Aaron. Ọ bụ eziokwu na a mụrụ ya n’ọgbakọ, ọ sịrị: “Ọmụmụ ihe na ozi ọma na-agwụ m ike.” Ọ chọrọ iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi, ma ọ maghị ihe mere obi anaghị adị ya ụtọ. Gịnị ka o mere?

7 Aaron gbalịsiri ike na-agụchi Baịbụl anya, na-akwadebe maka ọmụmụ ihe, na-azakwa ajụjụ. Ọ malitekwara ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Ka ọ na-ahụkwu Jehova n’anya, ọ malitere imekwu nke ọma n’ọgbakọ. Kemgbe ahụ, Aaron ejirila obi ụtọ sụọ ụzọ, soro nyere ụmụnna ọdachi dakwasịrị aka, kwusaakwa ozi ọma ná mba ọzọ. Ọ na-ejezi ozi na Betel, bụrụkwa okenye. Olee otú obi dị ya maka ihe a o mere? Ọ sịrị: “‘Edetụla m Jehova ire, hụ na ọ dị mma.’ Otú o si gọzie m emeela ka m ghọta na m kwesịrị ijekwuru ya ozi, meekwa ka m na-agbakwu mbọ n’ozi ya. Ọ bụ ya mere o ji na-agọzikwu m.”

8 Devid bụrụ abụ, sị: “Ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ihe ọma ga-akọ ha.” (Gụọ Abụ Ọma 34:8-10.) N’eziokwu, Jehova anaghị emechu ndị jí ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi ihu. Ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi ya, anyị ‘na-edetụ ya ire, hụ na ọ dị mma.’ Anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke, anyị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ.

JISIE IKE, ADALA MBÀ

9, 10. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka ị ‘na-echere Chineke’?

9 Ka ị na-agba mbọ ime ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova, ‘na-echere Chineke.’ (Maị. 7:7) Jehova na-akwado ndị jí obi ha niile na-efe ya n’agbanyeghị na o nwere ike ikwe ka ha chere tupu ha enweta ihe ùgwù ụfọdụ ma ọ bụ tupu ihe agbanwee ma dịtụrụ ha mma. O kwere Ebreham nkwa na ọ ga-amụta nwa, ma Ebreham kwesịrị inwe okwukwe na ndidi. (Hib. 6:12-15) Ọ bụ eziokwu na Ebreham cheere ọtụtụ afọ tupu a mụọ Aịzik, ma ọ daghị mbà, Jehova emechughịkwa ya ihu.—Jen. 15:3, 4; 21:5.

10 Ichere ihe anaghị adị mfe. (Ilu 13:12) Ma, anyị kwawa ụwa maka otú ihe si dịrị anyị, obi nwere ike ịda anyị mbà. Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị iji oge anyị na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Ka anyị leba anya n’ụzọ atọ anyị ga-esi eme ya.

11. Olee àgwà ndị anyị nwere ike ịgbasi mbọ ike ka anyị mụta, gịnịkwa mere ha ji dị́ mkpa?

11 Na-amụta àgwà ndị ga-abara gị uru n’ọgbakọ. Ịmụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya ga-enyere anyị aka inwe amamihe, nghọta, ezi uche, ihe ọmụma, ikike iche echiche, na uche zuru okè. Àgwà ndị a na-enyere ụmụnna na-elekọta ọgbakọ aka ịrụ ọrụ ha. (Ilu 1:1-4; Taị. 1:7-9) Anyị mụwa Baịbụl, anyị nwere ike ịmata otú Jehova si ele ihe dị́ iche iche anya. Anyị ga-eburuzi ihe Jehova chọrọ n’obi ma anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, anyị ga-amata otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ, ihe anyị ga-eji ego anyị na-eme, na otú anyị ga-esi na-ekpebi ma ụdị uwe anyị ga-eyi ma ihe ndị anyị ga-eji na-atụrụ ndụ.

12. Olee otú ndị nọ́ n’ọgbakọ nwere ike isi gosi na a ga-atụkwasịli ha obi?

12 Bụrụ onye a ga-atụkwasịli obi. Ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị kwesịrị iji ike anyị niile na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ọgbakọ. Mgbe Nehemaya bụ gọvanọ, ọ chọrọ ndị Izrel ọ ga-enye ọrụ. Olee ndị ọ họọrọ? Ọ bụ ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị a ga-atụkwasịli obi. (Nehe. 7:2; 13:12, 13) Taa, “ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-elekọta ụlọ bụ ka ha bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.” (1 Kọr. 4:2) Onye ọ bụla na-ahụ ihe ọma anyị na-eme.—Gụọ 1 Timoti 5:25.

13. Ndị ọzọ mee gị ihe ọjọọ, olee otú i nwere ike isi mee ka Josef?

13 Kwe ka Jehova nụchaa gị. Gịnị ka ị ga-eme ma ndị ọzọ mee gị ihe ọjọọ? I nwere ike ịgwa ha otú obi dị gị ozugbo. Ma, mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịnọ ebe ị na-esi ọnwụ ka a mata na aka gị dị ọcha, ihe akazie njọ. Ụmụnne Josef rụsara ya arụrụala, ma o burughị ha iwe n’obi. E mechara bo Josef ihe ọ na-emeghị ma tụọ ya mkpọrọ arụrụala. Ma, o kwere ka Jehova duzie ya n’oge ahụ niile ihe siiri ya ike. Olee uru o ritere? “Okwu Jehova nụchara ya.” (Ọma 105:19) Ọnwụnwa niile ahụ nyeere Josef aka iru eru ịrụ ọrụ pụrụ iche. (Jen. 41:37-44; 45:4-8) Ndị ọzọ mee gị ihe ọjọọ, rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. Ọ ga-enyere gị aka iwetu obi, meekwa ka i jiri obiọma gwa ha okwu.—Gụọ 1 Pita 5:10.

NA-EMEKWU NKE ỌMA N’OZI ỌMA

14, 15. (a) Gịnị mere anyị ga-eji ‘na-elezi otú anyị si ezi ozi ọma anya’? (b) Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ịgbanwe ka i nwee ike izi ndị ị na-anaghị ahụ n’ụlọ ozi ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a, kwuokwa ihe dị́ n’igbe bụ́ “Ị̀ Ga-esili Otú Ọzọ Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma??”)

14 Pọl gwara Timoti, sị: “Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.” (1 Tim. 4:13, 16) Timoti abụrụlarị aka ochie n’ikwusa ozi ọma mgbe Pọl gwara ya ihe a, ma ọ ga na-emekwu nke ọma n’ozi ọma ma ọ bụrụ na ọ ‘na-elezi onwe ya na ozizi ya anya.’ Ihe ga-eme ka okwu ya na-eru ndị mmadụ n’obi mgbe niile bụ ma ọ na-agbanwe otú o si ezi ihe. Anyị kwesịkwara ime ka Pọl, na-agbanwe otú anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma ka o ruo ha n’obi.

15 Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị ahụ ndị mmadụ n’ụlọ ma anyị gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. N’ebe ụfọdụ, a naghị ekwe ka anyị gaa zie ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ndị a gbara ogige. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ókèala unu, ì nwere ike ịgba mbọ ka i sí ụzọ ndị ọzọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?

16. Olee otú ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị nwere ike isi baa uru?

16 Ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị so n’ụzọ ndị magburu onwe ha e si ezi ozi ọma. Ọtụtụ ụmụnna na-esi otú a ezi ọtụtụ ndị ozi ọma. Ha na-aga n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’ebe bọs na-akwụsị, n’ọma ahịa, n’ebe a na-atụrụ ndụ nakwa n’ebe ndị ọzọ. Onye nkwusa ga-eji uche ya mata ma otú ọ ga-esi bido izi mmadụ ozi ọma ọ̀ bụ ịgwa ya ihe e kwuru n’akụkọ ụwa, ka ọ̀ bụ ịjawa ụmụ ya mma ka ọ̀ bụ ịjụwa ya gbasara ọrụ ya. Ka ha na-akparịta, ya ekwuzie ihe gbasara Baịbụl ma jụọ onye ahụ ihe o chere banyere ya. Ọtụtụ mgbe, ihe onye ahụ zara ga-eme ka e zie ya ozi ọma.

17, 18. (a) Olee ihe nwere ike ime ka obi kakwuo gị ịna-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị? (b) Gịnị mere abụ Devid ji too Jehova ga-eji baara gị uru n’ozi ọma?

17 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike izi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, ike agwụla gị. E nwere otu ọsụ ụzọ bí na Niu Yọk aha ya bụ Eddie. Ọ na-esiburu ya ike izi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Gịnịzi nyeere ya aka ịkata obi? Ọ sịrị: “Anyị nwewe ofufe ezinụlọ, mụ na nwunye m na-eme nchọnchọ ka anyị mata ihe anyị ga-aza ndị nwere ike ịjụ anyị ajụjụ, matakwa ihe ndị anyị na-ezi ozi ọma na-ekwukarị. Anyị na-agwakwa ụmụnna ndị ọzọ ka ha tụọrọ anyị aro.” Ọ na-adịzi Eddie ka oge e ji aga ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị ruwe eruwe.

18 Ọ bụrụ na ozi anyị ana-atọ anyị ụtọ, anyị ana-emekwa nke ọma n’ozi ọma, ndị ọzọ ga-ahụ ọganihu anyị. (Gụọ 1 Timoti 4:15.) Ihe ọzọ bụ na ọ ga-egosi na anyị na-eto Jehova otú ahụ Devid mere. Ọ sịrị: “M ga-agọzi Jehova mgbe niile; otuto ya ga-adị n’ọnụ m mgbe niile. Mkpụrụ obi m ga-eji Jehova nyaa isi; ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya wee ṅụrịa ọṅụ.” (Ọma 34:1, 2) Ozi ọma anyị nwere ike ime ka ndị dị́ umeala n’obi bịa fewe Jehova.

KA OTÚ I SI EME NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ GOSI NA Ị NA-ETO JEHOVA

19. Gịnị mere onye jí obi ya niile na-efe Jehova kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na ọ gaghị emeli ihe ndị o kwesịrị ime?

19 Devid sịkwara: “Jehova, ọrụ gị niile ga-eto gị, ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ga-agọzikwa gị. Ha ga na-ekwu banyere ịdị ebube nke ọbụbụeze gị, ha ga na-ekwukwa banyere ịdị ike gị, iji mee ka ụmụ mmadụ mara oké ọrụ ya, nakwa ebube nke ịma mma ọbụbụeze ya.” (Ọma 145:10-12) Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ndị niile jí obi ha niile na-erubere Jehova isi. Ma, ọ bụrụkwanụ na nká ma ọ bụ ọrịa emee ka ị ghara ịna-aga ozi ọma otú i kwesịrị? Na-echeta na mgbe ọ bụla i ziri ndị nọọsụ, ndị dọkịta ma ọ bụ ndị gị na ha nọ ozi ọma, ị na-eto Jehova. Ọ bụrụkwanụ na a tụrụ gị mkpọrọ n’ihi ihe i kweere? Cheta na ọ bụrụ na ị na-eji ohere ọ bụla ezi ndị mmadụ ozi ọma, obi ga-adị Jehova mma. (Ilu 27:11) Obi ga-adịkwa ya mma ma ọ bụrụ na ị na-efe ya n’agbanyeghị na ndị ọzọ nọ́ n’ezinụlọ unu anaghị efe ya. (1 Pita 3:1-4) A sịgodị na ihe esiere gị ezigbo ike, ị ka nwere ike ịna-eto Jehova, na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ.

20, 21. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ihe ị na-arụ ná nzukọ Jehova, olee otú i nwere ike isi na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru?

20 Jehova ga-agọzi gị ma ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị gbanwetụ ihe ndị ị na-eme ma ọ bụ otú i si ebi ndụ, i nwere ike inwekwu ohere inyere ndị mmadụ aka ka ha mụta banyere ọmarịcha nkwa ndị Jehova kwere anyị. Otú i si eme nke ọma n’ọgbakọ na otú i si ewepụta onwe gị ga-abara ụmụnna gị ọtụtụ uru. Mbọ ị na-agba n’ọgbakọ ga-eme ka ụmụnna hụ gị n’anya, jiri gị kpọrọ ihe, na-akwadokwa gị.

21 Ma ànyị efeela Jehova ọtụtụ afọ ma ọ bụ naanị ọnwa ole na ole, anyị niile ka nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Ma, olee otú ụmụnna nọterela aka n’ọgbakọ nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ GA-ESILI OTÚ ỌZỌ ZIE NDỊ MMADỤ OZI ỌMA?

OTU nwanna nwaanyị onye Venezuela aha ya bụ Venecia sịrị: “Echebughị m na m ga-ejili ekwentị ezi mmadụ ozi ọma.” Ma otu ụbọchị, ọ kpọrọ otu nwaanyị ọ mabu, gwatụ ya ihe sí na Baịbụl. Nwaanyị ahụ chọrọ ịmụtakwu ihe, Venecia amụwaziere ya Baịbụl. Nwaanyị ahụ mechara mee baptizim. Ugbu a, Venecia sịrị: “Iji ekwentị ezi ozi ọma bụ ebe a nọ.”

Na Laịberịa, otu nwa okoro aha ya bụ Peter na-ejikarị akwụkwọ anyị aga ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ ụmụ klas ha hụrụ traktị ahụ isiokwu ya bụ Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? ma gwa ya na ha chọrọ ya. Peter kọwaara ha ihe dị́ na traktị ahụ, ma jụọ ha, sị: “Gịnị ka unu ga-eji ndụ unu eme?” Otu n’ime ha asị ya: “Achọrọ m iji ndụ m efe Chineke.” Peter bidoziri ịmụrụ ya Baịbụl.

Na Poland, otu nwanna na nwunye ya malitere iji akwụkwọ ozi ezi ozi ọma n’ihi na ọrịa ekweghị ha gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Otu nwoke zara akwụkwọ ozi ha degaara ya. O dere, sị: “Obi dị m ụtọ maka okwu ndị ahụ unu ji kasie m obi. Nwunye m nwụrụ afọ atọ gara aga, nwa m nke ikpeazụ anwụọ n’afọ gara aga n’ihe mberede.” Otu nwaanyị mechara detara ha akwụkwọ ozi, sị: “Akwụkwọ ozi unu nyeere m aka ịmụta eziokwu. Ugbu a m na-edetara unu akwụkwọ ozi a afọ abụọ garala, abụ m nwanna unu nwaanyị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya