Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 5 p. 4-5
  • Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Mmụọ Ozi
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 5 p. 4-5
Onyeisi ndị mmụọ ozi na iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi ndị ọzọ

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ MMỤỌ OZI HÀ DỊ ADỊ N’EZIOKWU?

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi

Ị̀ ga-achọ ịma nke bụ́ eziokwu gbasara ndị ndị mmụọ ozi bụ, otú ha si malite na ihe ha na-eme? E nweghị ebe ka mma anyị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu ma ọ bụghị na Baịbụl bụ́ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nso dee. (2 Timoti 3:16) Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi?

  • Otú ahụ Chineke bụ Mmụọ ka ndị mmụọ ozi bụkwa. Ha “adịghị enwe anụ ahụ́ na ọkpụkpụ.” Ndị mmụọ ozi na-erubere Chineke isi bi n’eluigwe, ha na-ahụkwa Chineke ihu na ihu.​—⁠Luk 24:39; Matiu 18:10; Jọn 4:⁠24.

  • E nwere mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa n’ụdị mmadụ, gaa ozi Chineke dunyere ha. Mgbe ha gachara, ha ghọghachiri mmụọ ma laghachi n’eluigwe.​—⁠Ndị Ikpe 6:​11-23; 13:​15-20.

  • Na Baịbụl, a na-akọwakarị ndị mmụọ ozi ka ụmụ nwoke. Mgbe ụfọdụ Baịbụl kwuru na ha bịara n’ụwa, ha bịara n’ụdị ụmụ nwoke. Ọ bụ eziokwu na a na-akọwa ndị mmụọ ozi otú a, ha abụghị ụmụ nwoke, ha abụghịkwa ụmụ nwaanyị. Ha anaghị alụ ibe ha. Ha anaghịkwa amụta ndị mmụọ ozi ọzọ. Ihe ọzọ bụ na e bughị ụzọ kee ndị mmụọ ozi n’ụwa a ha abụrụ ụmụaka ma ọ bụ ndị agadi, ha emechazie ghọọ ndị mmụọ ozi. Ọ bụ Jehova kere ndị mmụọ ozi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji akpọ ha “ụmụ ezi Chineke.”​—⁠Job 1:6; Abụ Ọma 148:​2, 5.

  • Baịbụl kwuru gbasara ‘asụsụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ na nke ndị mmụọ ozi.’ Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na ndị mmụọ ozi nwere asụsụ ha na-asụ. Ọ bụ eziokwu na o nweela mgbe Chineke si n’aka ndị mmụọ ozi gwa ụmụ mmadụ okwu, ọ chọghị ka anyị na-efe ha ma ọ bụ na-arịọ ha arịrịọ n’ekpere.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 13:1; Mkpughe 22:​8, 9.

  • Baịbụl kwuru na e nwere iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi. Ọ ga-abụ na ha dị ọtụtụ ijeri ndị mmụọ ozi.​—⁠Daniel 7:10; Mkpughe 5:⁠11.

  • Ndị mmụọ ozi “dị ike nke ukwuu.” Ike ha kagburu nke ụmụ mmadụ akagbu. Ha kakwa ụmụ mmadụ mara ihe. Ha na-agbakwa oké ọsọ. Otú ha si agba ọsọ karịrị otú ụmụ mmadụ nwere ike ichetụ n’echiche.​—⁠Abụ Ọma 103:20; Daniel 9:​20-23.

  • N’agbanyeghị na ndị mmụọ ozi siri ike dị egwu, marakwa ihe karịa ụmụ mmadụ, ọ bụghị ihe niile ka ha ga-emeli. E nwekwara ihe ndị ha na-amaghị.​—⁠Matiu 24:36; 1 Pita 1:⁠12.

  • Chineke kere ndị mmụọ ozi ka ha nwee àgwà ya dị iche iche, nyekwa ha ikike iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme. Ọ pụtara na ndị mmụọ ozi nwere ike ikpebi ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ otú ahụ ọ dịkwa ndị mmadụ. Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị mmụọ ozi kpebiri inupụrụ Chineke isi.​—⁠Jud 6.

Olee Otú E si Hazie Ndị Mmụọ Ozi?

Maịkel bụ onyeisi ndị mmụọ ozi. Ọ bụ onyeisi ha n’ihi na ikike ya na ọkwá ya karịrị nke ndị mmụọ ozi niile. Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na Maịkel bụ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs Kraịst.​—⁠1 Ndị Tesalonaịka 4:16; Jud 9.

Ndị Seraf nọ n’ọkwá dị elu karịa ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ma a bịa n’ùgwù na nsọpụrụ a na-enye ha. Ha na-eje ozi gburugburu ocheeze Chineke.​—⁠Aịzaya 6:​1-3.

Ndị Cherọb nwekwara ọkwá dị elu. Ha na-ejere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ozi pụrụ iche. E nwere ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru na ha nọ na-ejere Chineke ozi.​—⁠Jenesis 3:24; Ezikiel 9:3; 11:⁠22.

Iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi ndị ọzọ na-ejere Onye Kacha Elu ozi ka ndị nnọchite anya ya, ma ọ bụ ndị na-enye aka n’imezu uche ya.a​—⁠Ndị Hibru 1:​7, 14.

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere ndị mmụọ ozi, gụọ isi nke 10 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Gụọkwa isiokwu bụ́ “Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi” nke dị n’ihe e dere ná ngwụcha akwụkwọ ahụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/⁠ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya