Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/95 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka August

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka August
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite August 7
  • Izu Na-amalite August 14
  • Izu Na-amalite August 21
  • Izu Na-amalite August 28
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 8/95 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka August

Izu Na-amalite August 7

Abụ 118 (48)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Rụtụ aka n’isiokwu ndị dị na magazin ndị ọhụrụ bụ́ ndị a pụrụ iji kwuo okwu mgbe a na-eche ha n’ihu mmadụ.

15 min: “Ọ̀ bụ Aha Mmadụ Gịnị Ka Unu Na-aghaghị Ịbụ?” Ajụjụ na azịza.

20 min: “Bụrụnụ Ndị Nkụzi nke Okwu Chineke—Na-eji Broshuọ Eme Ihe.” Nwanna e kenyere ihe omume a ga-esoro ndị nkwusa abụọ ọzọ ma ọ bụ atọ tụlee akụkụ dị iche iche nke broshuọ ndị ahụ. Ha ga-esorozi otu onye na ibe ya mụgharịa ihe ngosi ha.

Abụ 137 (66) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 14

Abụ 124 (75)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

10 min: Jiri Ụlọ Akwụkwọ Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma. Okenye emee ihe ngosi nke otú onye mụrụ ụmụ pụrụ isi gwa nwa ya nwoke ma ọ bụ nwanyị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu okwu banyere ịhọrọ ihe ọmụmụ dị iche iche n’ụlọ akwụkwọ. Kwurịta mkpa ọ dị ịhọrọ ihe ọmụmụ ndị ga-enye aka iji ije ozi ahụ mere ọrụ.—Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1992, peji nke 16-18, paragraf nke 3-11.

15 min: “Nne na Nna Bụ́ Ndị Na-aṅụrị Ọṅụ!” Okwu onye okenye ga-ekwu. Tinye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche nke August 15, 1987, peji nke 13-15, paragraf nke 14-23.

15 min: “Àgwà Ndị Kraịst n’Ụlọ Akwụkwọ.” Ajụjụ na azịza. Gbaa ndị nne na nna ume isoro ụmụ ha tụleghachi Ụlọ Nche nke July 15, 1991, peji nke 23-26, karịsịa akụkụ ndị metụtara nsogbu ndị o yikarịrị na ụmụaka ga-ezute.

Abụ 157 (73) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 21

Abụ 148 (74)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Dọrọ uche gaa n’isiokwu ndị na-akpali mmasị pụrụ iche na magazin ndị kasị ọhụrụ. Tụlee okwu ndị dị n’okpuru Akụkọ Ozi April.

10 min: “Nzukọ Maka Ozi Ubi.” Ajụjụ na azịza. Gụọ paragraf nile.

20 min: “Na-agbaso Ụzọ Kachasị Mma nke Ịhụnanya.” Ntụle onye okenye ga-eme n’isiokwu dị n’Ụlọ Nche nke July 15, 1992, peji nke 27-31.

Abụ 156 (68) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 28

Abụ 173 (15)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwupụta ndokwa ije ozi ubi maka ngwụsị izu ma gbaa ume maka nkwado na-ekpo ọkụ.

15 min: “Nletaghachi Ndị Na-aga nke Ọma Chọrọ Nkụzi Dị Irè.” Tụleghachi ihe ndị bụ isi ma mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ dị mkpirikpi.

20 min: Nyefee Akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ọnwa September. Kọwaa otú akwụkwọ a si na-ekere òkè dị mkpa n’ịkpọsa ozi ikpe Jehova. (Lee Ụlọ Nche nke April 1, 1988, peji nke 25-26, paragraf nke 17-18.) Kọọ ahụmahụ ndị dị na paragraf nke 3-4 na peji nke 15 nke Ụlọ Nche nke April 1, 1992. Dọrọ uche gaa n’ihe osise ndị na-akpali akpali dị na peji nke 3, 11-13, na 156-158 nke akwụkwọ ahụ. Tụlee ụzọ dị iche iche a pụrụ isi jiri ihe osise ndị a mee ihe iji welite mkparịta ụka. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi dị mkpirikpi na-eji otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e gosipụtara na peji nke 156-158 eme ihe. Mesie ike ihe mgbaru ọsọ nke ịnwa ịmalite ọmụmụ Bible. Chetara mmadụ nile iwere ndị ha ga-eji mee ihe ná ngwụsị izu a.

Abụ 178 (67) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya