Nne na Nna Bụ́ Ndị Na-aṅụrị Ọṅụ!
1 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto nke bi n’ezinụlọ ndị Kraịst, e nwere ụzọ pụrụ iche ị pụrụ isi mee ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị na-agbaso ụzọ ezi omume, ‘nna gị na nne gị ga-aṅụrị ọṅụ.’ (Ilu 23:22-25) Dị ka o kwesịrị, nne na nna gị chọrọ ihe kasị mma maka gị. Ọ dịghị ihe ga-enye ha obi ụtọ karịa ịhụ na ị na-eme ka eziokwu ahụ bụrụ nke gị ma rara ndụ gị nye Jehova.
2 Ị pụrụ inwe ekele n’ihi inwe nne na nna ndị nọ n’eziokwu. Site n’oge a mụrụ gị, ha azụwo gị nri, yikwasị gị ákwà, ma nye gị ebe obibi, lekọtakwa gị n’oge nile ị na-arịa ọrịa. Ọbụna nke ka mkpa, ha agbalịwo ịkụziri gị banyere Jehova na ụzọ ezi omume ya nile; nke a bụ ọzụzụ nke pụrụ ime ka i nweta ndụ ebighị ebi. (Efe. 6:1-4) Olee otú ị pụrụ isi gosi ekele gị?
3 Mee Ka Eziokwu ahụ Bụrụ nke Gị: Nne na nna gị agbalịwo ịkụziri gị iwere eziokwu dị ka ihe dị oké mkpa, inwe ọganihu ime mmụọ, na ịnọ nzukọ Jehova nso. Ị pụrụ igosi ekele site n’inwe mmasị n’ọmụmụ ihe ezinụlọ n’abụghị onye a na-amanye amanye. Gosi ọchịchọ ije nzukọ dị iche iche, na-ebute ụzọ n’onwe gị ịkwadebe ka ezinụlọ unu wee nwee ike irute n’oge. Soro ndị mụrụ gị nọrọ mgbe a na-enwe nzukọ dị iche iche, na-aṅakwa ntị nke ọma site n’ịdị na-esonye n’akwụkwọ ndị a na-amụ. Na-ekere òkè ná nzukọ dị iche iche site n’ịza ajụjụ. Gosi onwe gị nwa akwụkwọ dị njikere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na-anara ihe omume ma na-eme ihe ị pụrụ ime iji mezuo ha. Wepụta onwe gị inye aka ịhụ maka ọrụ ndị dị na gburugburu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ebe enyemaka gị ga-aba uru. Itinye aka n’ihe omume ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ị tụkwasị obi gị n’ihe ga-abara gị uru n’ụzọ ime mmụọ.
4 Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-aga n’Ihu: Na-ekere òkè bara uru n’ozi ubi, na-egosi ọchịchọ iru eru dị ka onye nkwusa. Na-agụchi ọgụgụ Bible kwa izu anya ma ọ bụ, ọbụna nke ka mma, gụzuo Bible dum n’onwe gị. Kpebie na ị gaje iru ihe ndị a chọrọ maka nraranye na baptism. Nne na nna gị pụrụ inyere gị aka iji nlezianya mee atụmatụ ihe omume gị n’ụlọ akwụkwọ, na-eburu n’uche inweta ọzụzụ nke ga-eme ka ị dị njikere ikere òkè zuru ezu n’ozi Jehova. Lekwasị anya n’ịzụlite ụdị àgwà nke ga-eme ka ndị ọzọ họpụta gị maka ihe ùgwù ndị pụrụ iche dị ka ịsụ ụzọ ma ọ bụ ozi Betel. (Ọrụ 16:1, 2) Iru ihe mgbaru ọsọ dị iche iche pụrụ inyere gị aka ‘ịnwa ihe ha na ibe ha dị iche, ka i wee bụrụ onye jupụtara ná mkpụrụ nke ezi omume.’—Fil. 1:10, 11.
5 Ntorobịa bụ oge ịmụta ihe, inweta ahụmahụ, na inweta nkà dị iche iche n’iso ndị ọzọ emekọ ihe. Ọ bụ oge mgbe ị pụrụ ịma ụtọ ndụ n’enweghị nrụgide na ibu ọrụ nile nke na-abịa mgbe mmadụ toruworo ogo mmadụ. Solomọn sịrị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ.” (Ekli. 11:9) Ọ bụrụ na ị tụkwasị obi gị n’ijere Jehova ozi n’oge ntorobịa gị, ị ga-enweta ngọzi ndị ga-adịru ebighị ebi.—1 Ihe Eme. 28:9.
6 Ọ bụrụ na ị ‘gbasoo ezi omume’ kama “agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa,” ị ga-eme ka nne na nna gị ghara ibu ibu dị arọ nke nchegbu na obi mgbu. (2 Tim. 2:22) Ị ga-enye obi nke aka gị ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ. (Ilu 12:25) Nke kasịnụ, ị ga-eme ka Onye Okike gị, bụ́ Jehova Chineke, ṅụrịa.—Ilu 27:11.