Nzukọ Maka Ozi Ubi
Mgbe ọ bụla e nwere nzukọ maka ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọtụtụ ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nọ ya, dị ka ozugbo a gbasasịrị nzukọ Sunday, mgbe ahụ otu onye okenye kwesịrị iduzi nzukọ ahụ maka mmadụ nile. E kwesịghị inwe nzukọ dịgasị iche iche maka ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nke ọ bụla n’otu ụlọ nzukọ ahụ n’otu oge. Ma tupu nzukọ ahụ amalite, ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nke ọ bụla kwesịrị ịnọ n’otu ebe e buru ụzọ họpụta n’ụlọ nzukọ ahụ iji mee ka ọ dị mfe idokwa maka ndị ha na ibe ha ga-arụkọ ọrụ. Ná mmechi nke ntụziaka ahụ na tupu e kpee ekpere, ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ dị iche iche kwesịrị ikenyesịwo ókèala na ndị nkwusa ndị ga-esoro ibe ha rụọ ọrụ. Mgbe ha nile mesịworo nke a, mgbe ahụ otu nwanna nwoke ga-ekpe ekpere mmechi tupu mmadụ nile apụọ ije ozi.
Biko rịba ama na ndokwa ọ bụla a na-eme banyere ozi ubi, tinyere ókèala a ga-eje ozi na ndị ha na ibe ha ga-arụkọ ọrụ, kwesịrị ka e mezusịa ndị a n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ime ebe obibi ma ọ bụ n’ebe ọzọ e nwere nzukọ ahụ. Ebe ọ bụ na nke a bụ nanị otu ìgwè, otu nwanna nwoke ga-edu ha n’ekpere tupu ha apụọ maka ozi ubi. E kwesịghị ikenye ndị ha na ibe ha ga-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ókèala ná mpụga ala Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’èzí nke ebe ọ bụla a na-enwe nzukọ ozi ubi.