Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’August: Asụsụ nile—A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ nwere 32 peji ndị na-esonụ n’ụtụ ₦24: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. September: Asụsụ nile—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. E kwesịrị ime mgbalị ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. October: Asụsụ nile—Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche. Mee mgbalị pụrụ iche itinye ọtụtụ mkpụrụ nke magazin ndị a. A pụkwara inyefe ụtụ ná nletaghachi. November: Bekee—New World Translation of the Holy Scriptures ya na akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Asụsụ ndị ọzọ—Akwukwọm nke Akukọ Bible ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ọgbakọ ọ bụla ga-anata fọm Literature Inventory atọ. Odeakwụkwọ ọgbakọ na onye na-ahụ maka akwụkwọ kwesịrị izukọ ná mmalite August ma setịpụ ụbọchị maka ime ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere n’ọgbakọ ná ngwụsị ọnwa. A ghaghị ịgụ akwụkwọ nile e nwere ọnụ, a ga-debakwa ngụkọta ha na fọm Literature Inventory. A pụrụ ịmata ngụkọta magazin ndị e nwere site n’aka onye na-elekọta magazin. Biko zitere Society ibe nke mbụ tupu September 6 agafee. Debe ibe nke abụọ ya na faịlụ unu. A pụrụ iji nke atọ mee ihe dị ka ibe akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ, onye isi oche ndị nlekọta kwesịkwara inyocha fọm ahụ e dejupụtara edejupụta. Odeakwụkwọ na onye isi oche ndị nlekọta ga-abịanye aka na fọm ahụ.
◼ Ọzọ, a na-ezitere unu fọm S-10 Congregation Analysis Report abụọ. E kwesịrị iji nlezianya dị ukwuu dejupụta fọm nke a ma zitere Society ibe nke mbụ tinyere akụkọ ozi unu nke ọnwa August tupu ọ gafee September 6, 1995. Ibe ya nke abụọ bụ maka faịlụ unu.
◼ A na-ezitere ọgbakọ ọ bụla fọm Report on Literacy abụọ. E kwesịrị idejupụta fọm nke a n’August 1 ma zitere anyị ya n’August 6. Debe otu na faịlụ unu. E kwesịrị idejupụta fọm ahụ, ma ùnu nwere klas ebe a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede, ma ọ bụ na unu enweghị ya.
◼ Biko lee n’okpuru maka nhazigharị ndị e meworo n’Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti na 1995, nke pụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke May 1995. Maka ọgbakọ ndị a gbanwere ụbọchị ma ọ bụ ebe ha ga-enwe mgbakọ, onye isi oche ndị nlekọta kwesịrị ịma ọkwa ụbọchị na/ma ọ bụ ebe ọhụrụ a ga-enwe mgbakọ ahụ ná Nzukọ Ije Ozi nke na-esonụ ma mapawa ya na bọdụ ịma ọkwa, na-aka akara n’ụbọchị na ebe ọhụrụ a ga-enwe mgbakọ nke ọgbakọ ahụ.
November 10-12, 1995
JOS (Bekee, Hausa) NE-2B, 3, 4
December 1-3, 1995
AGBANI 3 (Igbo) Ọgbakọ nile dị na IB-2 dị ka aha ha si dị malite na N ruo Z; IB-8: Ọgbakọ nile E WEZỤGA Ugwuibe (Afikpo); IB-3
MGBOKO UMUORIA 5 (Igbo) IB-28, 31; tinyere Ugwuibe (Afikpo) dị na IB-8
ULI 2 (Bekee) Ọgbakọ nile dị na EE-10 dị ka aha ha si dị malite na A ruo N; EE-8
December 8-10, 1995
ULI 3 (Igbo) IB-24, 25, 29
December 15-17, 1995
AKURE 1 (Yoruba) Y-19, 22, 23; Y-18: Ọgbakọ nile E WEZỤGA Aiyeteju Amuro, Egbe, Isanlu, Magadisu (Kaduna), Panisau (Kano), na Mopa
ULI 4 (Igbo) IB-5, 7, 23; tinyere ọgbakọ Igbo ndị dị na B-3
December 22-24, 1995
AKURE 2 (Yoruba) Y-21, 24; Y-25: Ọgbakọ nile E WEZỤGA Temi Adara
MGBOKO UMUORIA 8 (Igbo) IB-15, 16
January 5-7, 1996
MGBOKO UMUORIA 10 (Igbo) IB-9, 19A
ULI 5 (Igbo) IB-21, 26
January 12-14, 1996
ULI 6 (Bekee) Ọgbakọ nile dị na EE-10 dị ka aha ha si dị malite na O ruo Z; EE-9