Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Dị Aṅaa Ka I Setịpụwooro Ụmụ Gị?
1 Ihe ịga nke ọma ná ndụ na-adabere n’isetịpụ na iru ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru. Ndị na-agbaso ihe mgbaru ọsọ na-abaghị uru ma ọ bụ ndị a na-apụghị iru eru na-emesị nwee mmechuihu ma bụrụ ndị na-enweghị afọ ojuju. Amamihe dị mkpa iji mata nzube ndị a ga-achụso iji “jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.” (1 Tim. 6:19) Lee aha ekele anyị nwere na Jehova, site n’Okwu na nzukọ ya, na-egosi anyị kpọmkwem ụzọ anyị ga-eso eje ije!—Aịsa. 30:21.
2 N’inye nduzi ịhụnanya dị otú ahụ, Jehova na-esetịpụrụ ndị mụrụ ụmụ ihe nlereanya dị mma. Kama ịhapụ ụmụ ha na-enwebeghị ahụmahụ ịhọrọ ụzọ kasị mma, ndị nne na nna maara ihe na-azụ ha n’ụzọ ha kwesịrị ịgbaso, mgbe ha mekwara okenye, ha ‘agaghị esi n’ime ya wezụga onwe ha.’ (Ilu 22:6) Ndị Kraịst mụrụ ụmụ matara site n’ahụmahụ na ha apụghị ịtụkwasị nghọta nke onwe ha obi; ha aghaghị ịdabere na Jehova. (Ilu 3:5, 6) Ụmụaka, bụ́ ndị nwere ihe ọmụma na ahụmahụ a kpaara ókè, nwere mkpa nke a ọbụna karị.
3 Ndị mụrụ ụmụ pụrụ isetịpụ n’ihu ụmụ ha ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru bụ́ ndị ga-enyere ha aka ilekwasị anya “n’ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10, NW) Ha pụrụ iji ọmụmụ ihe ezinụlọ malite, na-agba ụmụaka ume ịghọta mkpa ọ dị na ịmụta ihe site na ya. Ọ dị mma ka ụmụaka nwee àgwà nke ibu ụzọ mụọ ihe tupu nzukọ ọgbakọ eruo, na ịkwadebe ịza ajụjụ n’okwu nke aka ha. Ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa dị mkpa. Ụmụaka pụrụ ikere òkè site n’inyefe traktị, ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ iche magazin n’ihu mmadụ. Mgbe ha nwere ike ịgụ ihe, idebanye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke pụrụ ime ka ọganihu ime mmụọ ha dị ngwa karị. Iru eru dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism ma ọ bụ ịbụ onye a nakweere maka baptism bụ nzọụkwụ ịga n’ihu nke gbara ọkpụrụkpụ.
4 Ka ụmụ ha na-eru n’agbata afọ ndụ nke iri na atọ na iri na itoolu, ma ọ bụ ọbụna tupu mgbe ahụ, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji ezi obi na-agwa ha okwu banyere ihe mgbaru ọsọ ndị e ji emere ọrụ. Onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ na ndị klas ibe ha pụrụ inwe mmetụta n’ụzọ dị mfe n’ahụ ha ịhọrọ nchụso nke ụwa, nke ịhụnanya ihe onwunwe. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịhọrọ ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ndị na-enye ọzụzụ n’ọrụ aka, na-akwadebe ha ịhụ maka mkpa anụ ahụ ha n’achụghị ọdịmma Alaeze n’àjà. (1 Tim. 6:6-10) A pụrụ ịgba ha ume ịgbaso “onyinye” nke alụghị di ma ọ bụ nwunye, e mesịziekwa, ọ bụrụ na ha ekpebie ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ha ga-enwe ike iburu ibu ọrụ ndị dị arọ nke alụmdi na nwunye. (Mat. 19:10, 11; 1 Kọr. 7:36-38) Site n’ikwu okwu n’ụzọ dị mma banyere ịsụ ụzọ, ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ozi Betel, ma ọ bụ Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịkụnye n’ime ụmụaka ọbụna mgbe ha ka dị nta ọchịchọ nke iji ndụ ha mee ihe n’ụzọ na-atọ Jehova ụtọ, na-abara ndị ọzọ uru, ma na-ewetara ha onwe ha ngọzi.
5 Ọ bụghị ihe dapụtara na mberede na anyị nwere ọtụtụ ndị na-eto eto ná nzukọ anyị taa, bụ́ ndị na-agbasosi ụkpụrụ dị elu nke ndị Kraịst ike ma na-achụso ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke. A pụrụ ikwu na ọ bụ ndị mụrụ ụmụ na-ahụ n’anya kpatara ọtụtụ n’ime ihe ịga nke ọma ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee ebe o yiri ka ụmụ gị na-eche ihu? Hà na-aga n’ihu n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu ịga ná ndụ nke lekwasịrị anya n’ọdịmma Alaeze? Cheta, otu n’ime ihe ndị kasị mkpa ị pụrụ ime bụ ịkụnye eziokwu ahụ n’ime ụmụ gị, na-ekwukwa banyere ya kwa ụbọchị. Ị pụrụ ịbụ onye e ji ezinụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi n’ijere Jehova ozi gọzie.—Deut. 6:6, 7; Josh. 24:15.