Nzukọ Ije Ozi Maka September
Izu Na-amalite September 4
Abụ 224 (106)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Akụkọ Alaeze Bịara n’Oge Ya nke A Ga-ekesa Gburugburu Mba A.” Okwu onye okenye ga-ekwu. Mesie ike mkpa nke ihe omume nke a pụrụ iche na-abịanụ n’October. Gbaa mmadụ nile ume, tinyere ndị ọhụrụ, ka ha mee atụmatụ maka ikere òkè n’ụzọ zuru ezu.
20 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbara Onwe Ha Uru.” Tụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a tụrụ aro ha, meekwa ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi.
Abụ 204 (109) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 11
Abụ 216 (14)
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
25 min: “Ọtụtụ Ihe Ime n’Ọrụ Onyenwe Anyị.” Ntụle ajụjụ na azịza nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Tụleghachi ndokwa ndị gbasapụrụ agbasapụ e meworo iji kesaa Akụkọ Alaeze ahụ pụrụ iche n’ụlọ n’ụlọ. Tụlee atụmatụ ndị e meworo iji rụzuo ókèala nile e kenyere ọgbakọ. Kọwaa ihe e kwesịrị ime iji nyere ndị ọhụrụ aka ikere òkè n’ozi na nke mbụ ya. Gụọ paragraf nile.
12 min: “Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Dị Aṅaa Ka I Setịpụwooro Ụmụ Gị?” Ajụjụ na azịza. Mee ka otu onye na-eto eto ma ọ bụ abụọ ma ọ bụ ndị metụworo okenye ndị bụ ihe nlereanya, ndị jewooro Jehova ozi site na mgbe ha bụ ndị na-eto eto kọọ ná mkpirikpi otú ndị mụrụ ha si nyere ha aka ịhọrọ ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị bụ́ ndị dabeere n’ọdịmma dị iche iche nke Alaeze.
Abụ 187 (93) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 18
Abụ 168 (84)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Igbe Ajụjụ. Tinye ihe ọmụma banyere akpa ozi ọma dị n’usoro, nke a haziri nke ọma, na-akọwa ihe ndị dị mkpa e kwesịrị itinye.
15 min: “Jiri Obi Gị Nile Na-arụ Ọrụ n’Ozi Ubi.” Paragraf nke 1-6. Ntụle ajụjụ na azịza.
20 min: “Sochie Mmasị Nile Iji Bara Ndị Ọzọ Uru.” Tụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a tụrụ aro ha maka nletaghachi. Nwanna na-eme ihe omume a esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ kwurịta ihe ha ga-ekwu ma gwazie ha ka ha mee ihe ngosi ha nke iche ihe n’ihu mmadụ.
Abụ 162 (89) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 25
Abụ 177 (71)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto.” Okwu na iso ndị na-ege ntị kwurịta okwu nke onye okenye ga-eduzi. Dị ka oge nyere ohere ya, kwuo okwu ntụkwasị na-adabere n’Ụlọ Nche nke August 15, 1992, peji nke 15-20.
25 min: “Jiri Obi Gị Nile Na-arụ Ọrụ n’Ozi Ubi.” Paragraf nke 7-15. Ntụle ajụjụ na azịza.
Abụ 193 (103) na ekpere mmechi.