Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/95 p. 3-4
  • “Ọtụtụ Ihe Ime n’Ọrụ Onyenwe Anyị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọtụtụ Ihe Ime n’Ọrụ Onyenwe Anyị”
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kesaa Akụkọ Alaeze nke 35 n’Ụzọ Sara Mbara
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • “Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?”
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme na February 19–March 18!
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • “Na-anụrụ Ọrụ Ọma Ọkụ” n’April!
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 9/95 p. 3-4

“Ọtụtụ Ihe Ime n’Ọrụ Onyenwe Anyị”

1 Anyị nwere n’ezie usoro ihe omume juru eju nke ọrụ ọchịchị Chineke ndị anyị na-elepụ anya maka ha n’October! Akụkụ bụ isi nke nzukọ n’October 1, mgbe okwu ihu ọha gasịrị, ga-abụ mwepụta nke onye isi oche ga-ewepụta Akụkọ Alaeze nke 34 nke nwere peji anọ bụ́ nke bịara n’oge ya, nke a ga-ekesa n’ụzọ sara mbara malite n’October 1 ruo 22. Í kweghị na a ga-enwe “ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị” n’ime ọnwa a?—1 Kọr. 15:58, NW.

2 A Ga-ewepụta Akụkọ Alaeze Pụrụ Iche: A ga-ebugara ọgbakọ nke ọ bụla Akụkọ Alaeze. E kwesịrị idebe katọn ndị Akụkọ Alaeze ahụ dị n’ime ha n’ebe ha na-agaghị emebi, e kwesịghịkwa imepe ha ruo ná mmechi nke ihe omume n’October 1. N’oge ahụ, a ga-enwe Akụkọ Alaeze ahụ maka ikesara ha ụmụnna anyị na ndị nọ n’èzí. Ná mmechi nke nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’October 1, ndị bịaranụ ga-anata otu mkpụrụ n’otu n’otu ka ha wee nwee ike ịmata ihe ndị dị n’ime ya nke ọma, ma bụrụ ndị a kwadebere maka nkesa ya.

3 Ndị Okenye Ga-enwe Ọtụtụ Ihe Ime: Ná mmalite ọnwa a, òtù ndị okenye kwesịrị izukọ iji tụlee ihe nile metụtara mkpọsa ahụ pụrụ iche. Ọgbakọ nile kwesịrị ịgbalị ịrụzu ókèala nile e kenyere ha. Tupu mkpọsa ahụ ejedebe, mee mgbalị pụrụ iche iji rụọ ọrụ n’ókèala ndị ahụ a na-arụzughị n’ọnwa isii gara aga. N’ihi ịdị mkpa nke ọrụ ahụ, anyị ga-achọ iwepụta oge ruo ókè o kwere mee maka ozi ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa karịa ka a na-enwebu ga-etinye akwụkwọ maka ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. O yiri nnọọ ka ọtụtụ ndị a na-amụrụ Bible ga-esonyere anyị dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism a nwapụtara anwapụta. Lee aha oge obi ụtọ anyị ga-enwe ka anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ọrụ Onyenwe anyị!

4 Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ime ndokwa ndị doro anya maka ozi ìgwè na Saturday na Sunday nile. E kwesịrị ịgba onye ọ bụla ume ikeresi òkè ike. Tinyere ọrụ ngwụsị izu, e kwesịrị idokwa ịgba àmà uhuruchi ma ọ dịkarịa ala otu ugboro n’izu n’oge mkpọsa ahụ. Ụfọdụ pụrụ ịchọ izukọ maka ije ozi mgbe a gbasasịrị akwụkwọ iji mee ka ụmụ akwụkwọ ndị ga-achọ ikerekwu òkè sonye.

5 E kwesịrị idokwa nzukọ maka ije ozi ubi n’ụzọ ga-eme ka ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ malite ozi n’oge kwa ụbọchị. Nzukọ ndị a kwesịrị ịdị nkenke. Nke ọ bụla kwesịrị inwe ihe ngosi dị mfe nke iche Akụkọ Alaeze ahụ n’ihu mmadụ. Nzukọ maka ije ozi n’ehihie pụrụ ịgụnye otu aro ma ọ bụ abụọ maka ime nletaghachi na nke ndị narawooro Akụkọ Alaeze ahụ. Otú ọ dị, ndị nkwusa ụfọdụ pụrụ ịhọrọ ime nkesa ahụ ma n’ụtụtụ ma n’ehihie. N’ihi nke ahụ, onye nlekọta ije ozi kwesịrị ijide n’aka na e nwere ókèala zuru ezu. E kwesịrị idetu aha na adres nke mmadụ nile gosiri mmasị n’ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ. A pụrụ idetukwu ihe ndị bụ isi ná mkparịta ụka ahụ n’ohere e nyere maka ihe ịrịba ama. Nke a ga-akwadebe ụzọ maka nletaghachi mgbe e mesịrị n’ime izu ma ọ bụ ọnwa ahụ.

6 Ọ bụrụ na otu ọgbakọ na-enyere nke ọzọ aka ịrụzu ókèala ya, e kwesịrị inye ọgbakọ nke ọ dị n’aka ịhụ maka ókèala ahụ aha na adres nke ndị nwere mmasị.

7 Ndị mụrụ ụmụ, ụmụ unu hà na-eme mgbalị na-aga n’ihu iji bụrụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism? A chọpụtawo na n’ọgbakọ ụfọdụ, ụmụaka ndị na-akpa ezi àgwà esonyerewo ndị mụrụ ha bụ́ ndị raara onwe ha nye n’ije ozi ruo ọtụtụ afọ, ụmụaka ndị ahụ na-emekwa nke ọma, ma ha abụbeghị ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịtụle ma ụmụ ha hà ruru eru n’ezie maka ihe ùgwù a. Abụọ n’ime ndị okenye pụrụ isoro onye isi ezinụlọ tụlee ihe dum ọ na-agụnye, ma kpebie ma à pụrụ ịgụ nwatakịrị ahụ dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism.—om-IB p. 99-100.

8 È nwere ndị nkwusa ọ bụla nọ n’ókèala ọgbakọ unu ndị na-adịkwaghị eje ozi n’ịchụ àjà otuto nye Jehova? (Hib. 13:15) Ọ pụrụ ịbụ nkụda aka ma ọ bụ nchegbu nke ndụ rikpuru ụfọdụ ndị na-adịkwaghị eje ozi, ọ bụ ezie na ha ka nọgidere na-erube isi n’ụkpụrụ omume nke Bible. Nleta enyi na enyi site n’aka otu onye okenye pụrụ ịkwali ha ịlọghachi n’isoro ọgbakọ na-enwe mkpakọrịta chiri anya, n’oge kwesịkwara ekwesị, n’ịmaliteghachi ọrụ n’ozi ahụ.

9 Ndị Nile Ruru Eru Pụrụ Ikere Òkè n’Ọrụ Obi Ụtọ A: È nwere ụfọdụ n’ime unu bụ́ ụmụaka ma ọ bụ ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu ndị ọ na-esiri ike ikere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ? Gịnị banyere unu ndị ọhụrụ, ndị nwere ahụmahụ dị nnọọ nta n’ọrụ nkwusa? Unu pụrụ ịhụ iji Akụkọ Alaeze nke a pụrụ iche arụ ọrụ ịbụ ihe kasị na-enye obi ụtọ! Nanị ihe dị mkpa bụ okwu dị mfe.

Ị pụrụ ikwu ihe dị ka nke a:

◼ “N’ọnwa a, ihe dị ka 190,000 ndị ọrụ afọ ofufo na-ekesa ozi dị mkpa n’ọtụtụ asụsụ n’ebe a na Nigeria. Nkesa nke ozi a dị mkpa na-aga n’ihu gburugburu ụwa. A kwadebewo ya maka mmadụ ndị ọ ga-amasị ịhụ njebebe nye nsogbu ndị anyị nile na-eche ihu taa. Nke a bụ nke gị.”

Ma ọ bụ ị pụrụ ịnwale nke a:

◼ “Anyị na-agba mmadụ nile ume ịgụ ozi nke a dị mkpa nke isiokwu ya bụ [gụpụta isiokwu nke Akụkọ Alaeze]. Rịba ama ihe ọ na-ekwu n’ebe a na peji nke 2 banyere ịba ụba nsogbu nke . . . [gụpụta ahịrị okwu a họtara site n’Akụkọ Alaeze]. Anyị ji n’aka na ị ga-erite uru ịgụ ebe ndị fọdụrụnụ n’ozi nke a bịara n’oge ya. Nke a bụ nke gị.”

10 Nwee mmasị onwe onye n’ebe onye ọ bụla nke naara Akụkọ Alaeze ahụ nọ. Jiri nwayọọ kwuo okwu, na n’ụzọ doro anya; ọ dịghị mkpa iji oké ọsọ na-ekwu ihe ị chọrọ ikwu. Anyị kwesịrị iji nlezianya mee ihe n’ịrụzu ókèala anyị ma hụ na e nyere ndị nile gosiri mmasị n’ịgụ Akụkọ Alaeze ahụ otu mkpụrụ nke ha. Mgbe ọ na-adịghị onye nọ n’ụlọ, jiri nlezianya kanye akara n’ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ gị ka i wee nwee ike ịlaghachi n’oge kwesịrị ekwesị iji nyefee onye nwe ụlọ ahụ Akụkọ Alaeze ahụ. A pụrụ iji Akụkọ Alaeze nke a mee ihe n’ịgba àmà okporo ámá mgbe mmadụ gosiri mmasị n’ịgụ ihe ọgụgụ ahụ. E kwesịghị inyefe traktị ndị a aghara aghara dị ka a ga-asị na ha bụ mpempe akwụkwọ ime mkpọsa. Kama nke ahụ, gakwuru ndị na-agafe n’ụzọ, kọwaakwa ịdị mkpa nke ozi ahụ a na-eche n’ihu mmadụ. Jiri Akụkọ Alaeze ahụ mee ihe n’ịgba àmà mberede, dị ka mgbe a na-eme njem ma ọ bụ mgbe a na-agba àmà nye ndị ọrụ ibe mmadụ n’oge nkwụsịtụ maka nri ehihie. Ndị na-enweghị ike ịgagharị agagharị ma ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike n’ụzọ ụfọdụ pụrụ inye ha ndị ọbịa, ndị dọkịta na ndị nọọsụ, ndị na-ere ahịa, na ndị ọzọ bịara n’ebe obibi ha.

11 Nletaghachi ole ka ị ga-eme n’oge mkpọsa ahụ? Obi abụọ adịghị ya na ha ga-adị nnọọ ọtụtụ, ebe ọ bụ na e kwesịrị iletaghachi ndị nile gosiworo mmasị n’Akụkọ Alaeze ahụ. N’ọbịbịa nke mbụ, ọ kasị mma iche nanị Akụkọ Alaeze ahụ n’ihu. Mgbe ahụ, mgbe ị laghachiri, kwuo ihe ole na ole banyere otú ozi dị n’Akụkọ Alaeze ahụ si kwesị oge a. Ṅaa ntị nke ọma ka onye nwe ụlọ na-ekwupụta echiche ya banyere ihe ọ gụworo. Okwu ya ga-enyere gị aka ịmata ihe ị ga-eche n’ihu na magazin ndị kasị ọhụrụ, ma eleghịkwa anya otú ị ga-esi kwadebe maka mkparịta ụka ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i nwetara nzaghachi dị mma ná nletaghachi ahụ, gbalịa ịmalite ọmụmụ Bible.—1 Kọr. 3:6, 7.

12 ‘Ọrụ Unu Na-arụ Abụghị n’Efu’: Ọrụ a nile hà ga-ekwesị ekwesị? Pọl mesiri ndị Kọrint obi ike, sị: “Ọrụ unu na-arụ n’ihi Onyenwe anyị abụghị n’efu.” (1 Kọr. 15:58, NW) N’ime ọtụtụ afọ, a gọziwo n’ụzọ dị ukwuu mgbalị anyị ikesa Akụkọ Alaeze. Otu di na nwunye na-akwaga n’otu ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ na-enweghị ndị bi na ha hụrụ otu mkpụrụ meworo ochie nke Akụkọ Alaeze n’ime otu kọbọd. Ọ bụ nanị ihe a hapụrụ n’ụlọ ahụ dum. Mgbe ha gụsịrị ya, ha kpọtụụrụ ọgbakọ dị n’ebe ahụ ma rịọ maka ọmụmụ Bible. Ha malitere ije nzukọ nile, ma mesịa kwupụta ọchịchọ ha ịbụ ndị e mere baptism. Ma eleghị anya otu mkpụrụ ị hapụrụ ga-arụpụta ihe ndị yiri nke ahụ!—Lee Teta! (Bekee), November 8, 1976, peji nke 15.

13 Anyị nwere ọrụ buru oké ibu na-eche anyị ihu. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ka ọgbakọ nke ọ bụla rụzuo ókèala e kenyere ya ka ọ na-erule October 22 ma ọ bụ n’ọgwụgwụ ọnwa ahụ, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ịgbatị oge maka nkesa nke Akụkọ Alaeze ahụ. E bubatawo ọtụtụ nke na onye ọsụ ụzọ oge nile na nke inyeaka ga-anata 250 Akụkọ Alaeze ahụ. Onye nkwusa ọ bụla nke ọgbakọ ga-enweta ihe ruru 50. Ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ kwesịrị ịnara nanị ọnụ ọgụgụ mkpụrụ ha ga-enwe ike ikesa, ha kwesịkwara iweghachi ndị nile fọdụrụnụ ka ndị ọzọ jiri ha mee ihe. Ezi imekọ ihe ọnụ n’ọnọdụ a ga-eme ka e nwee nkesa kasị saa mbara a pụrụ inwe banyere ozi nke a dị mkpa. Ọ bụrụ na ọgbakọ ụfọdụ arụzubeghị ókèala ha ka ọ na-erule October 22 ma ka nwee mkpụrụ ndị fọdụrụnụ n’ihi ịbụ ndị e kenyere ókèala buru ibu, ọ pụrụ ikwesị ekwesị ịkpọ ọgbakọ ndị dị nso ka ha nye aka. N’ọgbakọ ndị ọzọ, a pụrụ igbo mkpa ahụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ndị nkwusa amụbaa ọrụ ha site n’idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ site n’ikere òkè n’ozi ahụ mgbe mgbe karị.

14 A ga-achọ iji obi dum sọpụrụ Jehova ma ọ bụrụ na anyị ga-arụzu ọrụ anyị. (Kọl. 3:23) Ọ na-emetụta ọtụtụ ndụ. Ndị mmadụ ekwesịghị ileghara ihe ọnọdụ ụwa taa pụtara anya. Oge na-agwụsị. Ha aghaghị ịnakwere eziokwu ahụ bụ na ụmụ mmadụ enweghị ngwọta nye nsogbu dị iche iche nke ụwa nke a. Chineke nwere ya. Ndị chọrọ inweta ngọzi Chineke aghaghị ime ihe doro anya, n’egbughị oge, n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị ọ na-achọ.

15 Ná ngwụsị nke mkpọsa ahụ pụrụ iche n’October 22, ànyị ga-ebelata aka anyị n’ọrụ? Ee e! Anyị ga-anọgide na-arụ ọrụ n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya