Nletaghachi Ndị Nwere Nzube
1 Mgbe ị na-eme nletaghachi, i kwesịrị ịgbalị iji akụkụ akwụkwọ nsọ ga-atụkwasị ihe ná nghọta onye ahụ nke isiokwu Bible unu kwurịtara n’oge gara aga mee ihe.
2 Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ n’ime nletaghachi na nke ndị e nyefere magazin bụ iji guzobe ụzọ magazin. Ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị mfe dị ka nke a pụrụ ịdị irè:
◼ “Eji m n’aka na isiokwu Ụlọ Nche ahụ m hapụụrụ gị nke kọwara ihe mere anyị ga-eji na-atụ egwu Chineke masịrị gị. Taa ewetara m otu isiokwu dị na magazin Teta! nke na-ajụ sị, ‘N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Dị Mkpirikpi Otú A?’ Nke ahụ bụ ajụjụ dị mma, ọ́ bụghị ya?” Ị pụrụ ịga n’ihu site n’ikwu, sị: “Okwu Jisọs a maara nke ọma na Jọn 3:16 na-ekwe nkwa ndụ ebighị ebi. Biko nara magazin a ma bụrụ onye olileanya siri ike e nyere n’Okwu Chineke gbara ume.” Mgbe ahụ kọwaa na ị ga-alọghachi iji weta mbipụta ndị na-esonụ na ma eleghị anya ikwurịtakwu ihe Chineke kweworo ná nkwa maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Cheta na ị pụrụ inye akụkọ otu nletaghachi, mgbe ọ bụla i wegara magazin.
3 Ọ bụrụ na i tinyere isiokwu bụ́ “Ụwa nke Agha Na-adịghị na Ya—Olee Mgbe?” ị pụrụ ịsị:
◼ “Gịnị ka ndụ n’elu ụwa a ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na agha adịkwaghị ọzọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ka m gosi gị ihe Chineke kweworo nkwa ime.” Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11, ma kọwaa otú ihe ga-adị mgbe e mere uche Chineke n’ebe a n’elu ụwa. Chetara onye ahụ banyere ihe Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ya dị ka e dekọrọ ya na Matiu 6:9, 10. Nyere ya aka iche echiche n’ihe okwu Jisọs pụtara. Ọ bụrụ na e nwere ezi mmasị, ị pụrụ inyefe ụtụ Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ma mee ndokwa ịlaghachi maka inwekwu nkwurịta okwu.
4 Ọ bụrụ na ị laghachiri maka inwekwu nkwurịta okwu n’usoro isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Dị Mkpirikpi Otú A?” nke dị na peji nke abụọ, ị pụrụ ịmalite n’ụzọ a:
◼ “N’oge ikpeazụ m bịara, anyị kwurịtara banyere ịdị ogologo ndụ nke ụmụ mmadụ. Dị ka ị na-aghaghị ịrịbaworị ama n’isiokwu ndị dị na Teta! ahụ, ndị ọkà mmụta sayensị na-esetịpụ olileanya dị nta nke inyere anyị aka ịdị ndụ gafee 70 ma ọ bụ 80 afọ. Ma gịnị ka i chere banyere ihe Bible na-ekwe nkwa ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-egosi na Chineke bu ihe ka nnọọ mma n’uche maka mmadụ.” Mgbe ahụ gụọ Jọn 17:3, ma kọwaa otú ịnara ihe ọmụma pụrụ isi duga ná ndụ ebighị ebi. Ugbu a ị pụrụ ikwu okwu maka ọmụmụ Bible ebe obibi ma ọ bụ dokwaa maka nkwurịta okwu Bible ọzọ.
5 Ịmalite ọmụmụ Bible bụ ihe mgbaru ọsọ dị mkpa n’ije ozi anyị. Ikekwe i mewo nleta ugboro ugboro na nke onye natara magazin. Gịnị ma ị nwalee ụzọ nke a mgbe ọzọ ị gaghachiri?:
◼ “Ndị mmadụ nwere ọtụtụ echiche dịgasị iche iche banyere okpukpe na uru ọ bara n’ịdị ndụ ọgbara ọhụrụ. E nwere nkwenkwe ndị na-emegiderịta onwe ha banyere ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị ma ọ bụ ihe mere anyị ji na-aka nká, na-anwụkwa anwụ. Ụfọdụ ndị ga-achọ ịmata otú e si ekpe ekpere ma bụrụ onye Chineke nụrụ.” Sapeta otu n’ime mbipụta anyị ndị e ji amụ Bible n’isiokwu i chere ga-amasị onye nwe ụlọ, ma gosi ná mkpirikpi otú e si eduzi ọmụmụ ihe.
6 Jehova bụ Chineke nke nzube. Ka anyị ṅomie ya n’October site n’ime nletaghachi ndị nwere nzube.