Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/95 p. 1
  • Too Jehova Kwa Ụbọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Too Jehova Kwa Ụbọchị
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Na-eto Jehova Kwa Ụbọchị
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Mgbakọ Distrikti Na-akpọ Òkù Na-akpali Akpali!—Jiri Ọṅụ Na-eto Jehova Site n’Ụbọchị Ruo n’Ụbọchị!
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 12/95 p. 1

Too Jehova Kwa Ụbọchị

1 Chineke anyị, bụ́ Jehova, bụ Onye Okike dị ebube, na-ahụ n’anya, Isi Iyi nke ndụ na obi ụtọ nile. N’ihi ịdị ukwuu ya, o kwesịrị n’ezie ịnara otuto site n’ọnụ ihe nile o kere. N’otu n’otu, anyị ga-achọ ikwu dị ka ọbụ abụ ahụ: “[M ga-atụkwasị] otuto n’otuto Gị nile. Ọnụ m ga-akọ akụkọ banyere ezi omume Gị.” (Abụ Ọma 71:14, 15) Iji mee nke a, anyị aghaghị ịchọ ụzọ isi too Jehova kwa ụbọchị ma bụrụ ndị a kpaliri ikwu ihe ọma banyere ya, ezi omume ya, na ndokwa ya nile maka nzọpụta.

2 Ndị Kraịst oge mbụ setịpụrụ ihe nlereanya ọma n’ito Jehova. N’izo aka n’ebe 3,000 mmadụ e mere baptism na Pentikọst nọ, anyị na-agụ n’Ọrụ 2:46, 47, sị: “Ha jikwa otu obi na-anọgidesi ike n’ụlọ ukwu Chineke kwa ụbọchị, . . . na-eto Chineke, ihe ha na-atọkwa ndị Juu dum ụtọ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.” Ha na-amụta eziokwu ndị magburu onwe ha banyere Jehova na Mesaịa ya. Ọṅụ ha na-efe efe, na-agba ndị ọzọ kwa ume ịṅa ntị na ịmụta ihe ma too Jehova.

3 Ohere Na-adị Kwa Ụbọchị: Taa ọtụtụ na-achọpụta na ha pụrụ ito Jehova kwa ụbọchị site n’ịgba àmà mberede. Ibu ụzọ mee atụmatụ na-enyere ha aka ịmịkwu mkpụrụ. Otu nwanna nwanyị kpebiworo ikere òkè n’ịgba àmà mberede chọpụtara na otu onye akụwawo window abụọ ma waba n’ime ụgbọ ala ya. Ọ kpọrọ otu onye ọrụ ndozi ma kwadebe ịgbara onye ọrụ ahụ àmà. Nkwadebe ya gụnyere ikpe ekpere maka nduzi Jehova. Dị ka o si dapụta, ọ gbaara onye ọrụ ahụ àmà ruo otu hour ma nyefee ya akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi.

4 Nwanna nwanyị ọzọ na-ezute otu onye agbata obi ya mgbe mgbe ka ha pụrụ jiri ụkwụ na-aga. N’otu oge ha zutere, ha nwere mkparịta ụka miri emi banyere nsogbu nke ndụ, nke ahụ dubakwara n’inwekwu nkwurịta okwu. Ka oge na-aga, a malitere ọmụmụ Bible. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, onye agbata obi ahụ mesịrị kwupụta na ya agaraghị aṅa Ndịàmà Jehova ntị a sị na ha bịara n’ụlọ ya, ebe ya na-ekweghị na Chineke ma ọ bụ na Bible.

5 Ọ na-ekwe ụfọdụ omume ịgba àmà mgbe ndị ahịa mbugharị ma ọ bụ ndị ọzọ bịara n’ụlọ ha. Otu nwanna nwanyị na Ireland ka otu nwoke na-ere inshọransị maka ndụ letara. Ọ kọwara na ya na-atụ anya ibi ndụ ebighị ebi. Nke a bụ echiche dịwagara ọhụrụ nye nwoke a, nke a zụliteworo dị ka onye Roman Katọlik. Ọ nakweere akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi, bịa nzukọ n’izu na-esonụ, ma kwere inwe ọmụmụ Bible. Ugbu a onye ahịa mbugharị a bụ nwanna nwoke e mere baptism.

6 Anyị nile kwesịrị ịmụrụ anya ịhụ ohere dị iche iche iji too Jehova kwa ụbọchị. Idebe magazin ma ọ bụ traktị ole na ole n’ebe a pụrụ ịhụ ha, e nweekwa ike inyefe ha ndị nleta ngwa ngwa na-enye aka. Ọ dịkwa mma ịchịrị magazin na traktị mgbe a na-eme njem n’usoro ime njem ọha na eze, dịrịkwa njikere isoro ndị nọ anyị gburugburu nwee mkparịta ụka nke pụrụ iduga n’ịgba àmà. Ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ na-edebe akwụkwọ Bible n’elu table ha dị ka ụzọ isi malite nkwurịta okwu ha na onye hụrụ akwukwọ ahụ ma jụọ ajụjụ. Buru n’uche otu ebe ma ọ bụ abụọ n’Akwụkwọ Nsọ nke ị pụrụ iji mee ihe. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. A ga-agọzi gị maka ime otú ahụ.—1 Jọn 5:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya