Akụkọ Ọchịchị Chineke
Albania: Narị ndị nkwusa isii nyere akụkọ ozi n’August bụ ọnụ ọgụgụ kasị elu n’akwụsịghị akwụsị nke 28.
Angola: E ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu a na-enwetụbeghị mbụ bụ́ 26,129 ndị nkwusa ná mmechi nke afọ ije ozi. E nwekwara ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ 1,309 ná ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ndị nkwusa nwere nkezi nke hour 15 na ọmụmụ Bible abụọ n’August.
Britain: Anyị nwere obi ụtọ inye akụkọ na e ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu a na-enwetụbeghị mbụ bụ́ 132,440 ndị nkwusa n’August. Nke a bụ ịrị elu nke pasent 2 karịa afọ ije ozi gara aga.
Chile: N’August, e ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu a na-enwetụbeghị mbụ nke ndị nkwusa, na-enwe ngụkọta nke 50,283! Na nke mbụ ya, a gafere akara nke 50,000. Ndị nkwusa tinyere nkezi nke hour 12 n’ozi ubi. E duziri ngụkọta nke 63,732 ọmụmụ Bible ebe obibi.