Igbe Ajụjụ
◼ Olee ụzọ kwesịrị ekwesị isi jiri okwu ndị ahụ bụ́ “nwanna nwoke” na “nwanna nwanyị” eme ihe?
Mgbe e jiri ha mee ihe n’echiche nkịtị, okwu ndị ahụ bụ́ “nwanna nwoke” na “nwanna nwanyị” na-ezo aka n’ebe ndị nwere otu nne na nna nọ. Mmekọrịta nke a sitere n’okike na-ewulitekarị nkekọ na-ekpo ọkụ, ịdị nso mmadụ ndị a na-enwe bụkwa nke ihe nkekọ ndị nke ọha mmadụ, gburugburu ebe obibi, na mmetụta uche na-emesiwanye ike.
Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ịkpọ Jehova n’ekpere “Nna Anyị.” Iji okwu ahụ eme ihe na-apụta na dị ka ndị Kraịst, anyị nile bụ akụkụ nke otu njikọ ezinụlọ chiri anya ebe anyị na-enwe ụba mmekọrịta ime mmụọ. Jisọs mesikwuru nke a ike mgbe ọ gwara ụmụazụ ya na “unu nile bụ ụmụnna.”—Mat. 6:9; 23:8.
N’ihi nkekọ ime mmụọ anyị chiri anya n’ime ezinụlọ Chineke, anyị na-akpọ ibe anyị “Nwanna Nwoke” na “Nwanna Nwanyị,” karịsịa ná nzukọ ọgbakọ. N’oge nnọkọ ime mmụọ ndị a, onye nke na-eduzi nzukọ na-akpọ ndị e meworo baptism aha site n’iji okwu bụ́ “nwanna nwoke” ma ọ bụ “nwanna nwanyị” nke aha nna onye ahụ a na-akpọ na-esochi eme ihe.
Gịnị ma ọ bụrụ na onye a na-emebeghị baptism achọọ ikere òkè ná nzukọ? Mgbe mmadụ nọworo na-esonyere ndị Jehova ruo oge ụfọdụ ma na-eru nso nraranye, na-ele onwe ya anya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, a gaghị enwe ihe ọ bụla na-emegide ibu ụzọ kpọọ “Nwanna Nwoke” ma ọ bụ “Nwanna Nwanyị” tupu aha nna ya. Nke a ga-abụ otú ahụ karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ abụrụwo onye nkwusa a na-emebeghị baptism.
N’aka nke ọzọ, ndị nwere mmasị bụ́ ndị ka malitere nnọọ ọhụrụ ịbịa nzukọ anyị ewerebeghị nzọụkwụ ndị ga-eme ka e were ha dị ka akụkụ nke ezinụlọ Chineke. A gaghị akpọ ndị a “Nwanna Nwoke” ma ọ bụ “Nwanna Nwanyị,” ebe ọ bụ na mmekọrịta ime mmụọ nke ezinụlọ Chineke adịghị ya n’ọnọdụ ha. Ya mere n’oge nzukọ, anyị ga-akpọ ha aha n’ụzọ dị ùgwù karị, na-eji ùtú aha kwesịrị ekwesị dị ka “Maazị” na aha nna ha eme ihe.
Iji okwu ndị bụ “nwanna nwoke” na “nwanna nwanyị” eme ihe ná nzukọ ọgbakọ anyị na-egosi nkekọ chiri anya nke ukwuu ma dị oké ọnụ ahịa karịa nke ọ bụla ọzọ iji aha onwe onye na-egosi. Ọ na-echetara anyị mmekọrịta a gọziri nnọọ agọzi anyị na-enwe dị ka ezinụlọ ime mmụọ n’okpuru otu Nna ahụ, Jehova Chineke. A na-echetakwara anyị ịhụnanya na mmetụta miri emi anyị nwere maka ibe anyị.—Efe. 2:19; 1 Pita 3:8.