Gịnị Banyere Ndị Ikwu Gị?
1 Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị nwere ọtụtụ ndị ikwu na-anọghị n’eziokwu. Lee ka anyị si achọsi ike ka ndị dị otú ahụ a hụrụ n’anya sonyere anyị n’ụzọ na-eduga ná ndụ! Nchegbu anyị maka ọdịnihu ebighị ebi ha pụrụ ịdị ukwuu karị mgbe ha bụ ndị òtù ezinụlọ anyị. Ọ bụ ezie na anyị agbalịwo ruo ọtụtụ afọ ime ka ha nwee mmasị n’eziokwu ahụ, anyị ekwesịghị ikwubi na olileanya adịghị n’ọnọdụ ahụ.
2 Mgbe Jisọs mere nkwusa ya, “ọbụna ụmụnne Ya ekweghị na Ya.” (Jọn 7:5) N’otu oge, ndị ikwu ya chere na anya adịghị ya mma. (Mak 3:21) Ma, Jisọs adaghị mbà n’ebe ha nọ. Ka oge na-aga, ụmụnne ya nakweere eziokwu ahụ. (Ọrụ 1:14) Onye otu nne ji ya na ya bụ́ Jemes ghọrọ ide n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Gal. 1:18, 19; 2:9) Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inwe ọṅụ nke ịhụ ndị ikwu gị ka ha nabatara eziokwu ahụ, akwụsịla ịgbalị iji ozi ọma Alaeze ahụ rute ha.
3 Na-enye Ume Ọhụrụ, Ọ Bụghị Mbogbu: Mgbe Jisọs kwusaara ndị ọzọ ozi ọma, ndị na-ege ya ntị nwetara ume ọhụrụ, ọ bụghị ndị a kakwasịrị anya. (Mat. 11:28, 29) O jighị nkụzi nke ha na-apụghị ịghọta bogbuo ha. Iji mee ka ndị ikwu gị nwee ume ọhụrụ site ná mmiri nke eziokwu, nye ha otu iko n’otu oge, ọ bụghị otu bọket! Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ndị na-akpalite ọchịchọ ịmata ihe nke ndị ikwu ha site n’ịgbara ha àmà nwayọọ nwayọọ na-arụpụta ihe ndị kasị mma.” N’ụzọ dị otú a, ọbụna ndị mmegide pụrụ ịmalite ịjụ ajụjụ ma mesịa zụlite akpịrị ịkpọ nkụ maka eziokwu ahụ.—1 Pita 2:2; tụlee 1 Ndị Kọrint 3:1, 2.
4 Ọtụtụ ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye agbaworo ndị òtù ọlụlụ ha na-ekweghị ekwe àmà n’ụzọ dị irè site n’ighebe otu akwụkwọ oghe n’isiokwu nke pụrụ ịmasị ha. Otu nwanna nwanyị mere nke a duzikwaara ụmụaka ya ọmụmụ ihe ebe di ya ga na-anụchata ya, na-enye nkọwa ndị ga-abara ya uru. Mgbe ụfọdụ ọ ga-ajụ ya, sị: “Amụtara m ihe dị otú a ma ọ bụ otú a n’ọmụmụ ihe m taa. Gịnị ka i chere banyere ya?” N’ikpeazụ di ya nakweere eziokwu ahụ.
5 Na-akwanye Ùgwù, Ọ Bụghị Enweghị Ndidi: Otu onye nkwusa kwuru na “ọbụna ndị ikwu nwere ikike inwe nkweta na echiche ndị nke ha.” Ya mere anyị kwesịrị igosi nkwanye ùgwù mgbe ha kwupụtara echiche ha ma ọ bụ gwa anyị kpọmkwem ka anyị ghara ịgwa ha okwu banyere eziokwu ahụ. (Ekli. 3:7; 1 Pita 3:15) Site n’inwe ndidi ma na-ahụ n’anya na site n’ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma, anyị pụrụ ịchọta ohere ndị kwesịrị ekwesị iji gbaa àmà n’ụzọ akọ. Ndidi dị otú ahụ pụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ, dị ka a hụrụ n’ọnọdụ nke otu di bụ́ onye Kraịst nke jiri ndidi nagide mmeso ọjọọ nke nwunye ya na-ekweghị ekwe ruo afọ 20. Ozugbo ọ malitere ime mgbanwe, o kwuru, sị: “Lee ka m si wee na-ekele Jehova na o nyeere m aka ịzụlite ogologo ntachi obi, n’ihi na apụrụ m ịhụ ihe ọ rụpụtara ugbu a: Nwunye m amalitewo ije ije n’okporo ụzọ nke ndụ!”
6 Gịnị banyere ndị ikwu gị? Ọ pụrụ ịbụ na site n’ezi àgwà ndị Kraịst gị na ekpere gị n’ihi ha, “ị pụrụ iritere ha Jehova n’uru.”—1 Pita 3:1, 2, nkọwa ala ala peji nke NW.