Nzukọ Ije Ozi Maka February
Izu Na-amalite February 3
Abụ 27 (7)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.”
15 min: “Kere Òkè n’Ọrụ A Na-agaghị Arụghachi Ọzọ.” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, gụnye isi ihe ndị sitere na “Keeping on the Watch—How?” (Ịnọgide na Nche—N’ụzọ Dị Aṅaa?) na peji nke 714-715 nke akwụkwọ Proclaimers.
20 min: “Iji Echiche nke Ịdị Ngwa Na-eche Ozi Ọma ahụ n’Ihu Mmadụ.” (Paragraf nke 1-5) Mgbe e kwusịrị okwu dị mkpirikpi na paragraf 1, nwanna e kenyere ihe omume esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ tụlee paragraf nke 2-5. Ha atụleghachi isi ihe ndị dị n’ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a tụrụ aro ha, kwuokwa okwu n’ihe mere ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a ma ọ bụ ndị yiri ha pụrụ iji dị irè n’ókèala ha. Ndị nkwusa amụgharịa ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ, onye mee ibe ya emee. Nwanna e kenyere ihe omume ajaa ha mma, tụọ aro ụzọ ndị a pụrụ isi mee ka ha dịwanye irè. Mgbe ahụ ya ajụọ ndị na-ege ntị banyere ụzọ dị iche iche a pụrụ isi ruo ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe. Na-enye echiche ndị doro anya nke otú a pụrụ isi mesịa malite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.
Abụ 34 (8) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 10
Abụ 29 (11)
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo isi ihe ndị na-akpali mmasị a pụrụ iji kwurịta okwu na magazin ndị ọhụrụ ndị a pụrụ iji mee ihe n’ozi n’izu a. Akụkọ Ọchịchị Chineke.
10 min: “Iji Echiche nke Ịdị Ngwa Na-eche Ozi Ọma ahụ n’Ihu Mmadụ.” (Paragraf nke 6-8) Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 6-7. Mesie ike mkpa ọ dị ime nletaghachi n’ebe e gosiri mmasị.
28 min: “A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000.” Ntụle ajụjụ na azịza nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Mee ka isi ihe ndị dị n’igbe dị na peji nke 3 pụta ìhè. Tụlee usoro ihe omume ihe atụ ndị dị na peji nke 6. Onye nkwusa ọ bụla e meworo baptism kwesịrị iji ekpere tụlee n’onwe ya ma ò nwere ike idenye aha maka otu ọnwa ma ọ bụ karị. Ndị nkwusa a na-emebeghị baptism pụrụ ịgbasawanye òkè ha na-ekere n’ozi site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ hour nke ha kwa ọnwa.
Abụ 43 (64) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 17
Abụ 30 (18)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
13 min: “Ememe Ncheta—Ihe Omume Dị Oké Mkpa!” Ajụjụ na azịza. Gbaa ume ime ka ọnwa March n’ozuzu ya bụrụ nke pụrụ iche site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Gosipụta otú e si eji akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta eme ihe.
22 min: Ịmalite Ọmụmụ Bible Ebe Obibi. N’ọnwa ndị na-adịbeghị anya, e tinyewo ọtụtụ puku akwụkwọ ukwu. Nke a na-enye ihe ndabere maka ịmalite ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ọzọ. Tụleghachi ihe a rụzuru n’ọgbakọ unu n’itinye akwụkwọ dị iche iche. Gbaa ndị nkwusa ume isochi mmasị nile e gosiri. Mee ka ọtụtụ ndị nkwusa kọọ kpọmkwem mgbalị ndị a chọrọ ha n’aka iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ọhụrụ. Mesie ike na akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ọrụ anyị bụ ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) A pụrụ ime nke a n’ụzọ dị irè ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike itinye aro ndị e depụtara n’ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke June 1996 n’ọrụ.
Abụ 47 (21) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 24
Abụ 32 (10)
18 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Maa ọkwa aha ndị nile na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na March. Kọwaa na oge agabigabeghị nke ukwuu itinye akwụkwọ. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu n’ozi ubi na Saturday, March 1. Kọwapụta ndokwa ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ maka nzukọ ije ozi n’ọnwa ahụ. Jiri nlezianya tụlee Igbe Ajụjụ.
12 min: “Gịnị Banyere Ndị Ikwu Gị?” Di na nwunye atụlekọọ isiokwu ahụ wee kpebie otú a ga-esi jiri ozi ọma ahụ gakwuru ndị ikwu na-ekweghị ekwe.—Lee Ụlọ Nche February 15, 1990, peji nke 25-27.
15 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe na March—Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Tụlee ná mkpirikpi ihe na-akpata ndakpọ ezinụlọ n’ọha mmadụ nke oge a. (Lee Ụlọ Nche October 15, 1992, peji nke 4-7.) Tụleghachi ihe dị n’ime akwụkwọ ahụ, na peji nke 3. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha họrọ isiakwụkwọ ndị pụrụ ịbụ ebe ndabere maka iche ihe n’ihu mmadụ. Kọwapụta igbe izi ihe na-enye aka nke dị ná ngwụsị nke isiakwụkwọ nke ọ bụla. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi chee akwụkwọ ahụ n’ihu mmadụ. Chetara mmadụ nile ka ha were ndị ha ga-eji eme ihe ná ngwụsị izu a.
Abụ 48 (28) na ekpere mmechi.