Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/15 p. 25-27
  • Jiri Mmiri nke Eziokwu Nye Ndị Ikwu Gị Ume Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Mmiri nke Eziokwu Nye Ndị Ikwu Gị Ume Ọhụrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Ka Ndị Ikwu “Ṅụjuo Afọ”
  • Bụrụ “Isi Iyi Amamihe”
  • Kwee Ka Àgwà Ọma Kwuo Okwu
  • Ahapụla Inwe Olileanya!
  • Gịnị Banyere Ndị Ikwu Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Otú Ị Ga-esi Nweta Obi Ndị Ikwu Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ịgbara Ndị Ikwu Àmà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Eziokwu Na-eweta “Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/15 p. 25-27

Jiri Mmiri nke Eziokwu Nye Ndị Ikwu Gị Ume Ọhụrụ

“DỊ KA mmiri oyi si adịrị mkpụrụ obi na-ada mbà, otú a ka okwu ọma a nụrụ site n’ala dị anya dị,” ka Solomọn sịrị. (Ilu 25:25) Lee nnọọ ahụmahụ na-akpali akpali ọ bụ nye obi nke na-ada mbà ige ntị n’okwu ọma gị banyere ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs nke na-abịanụ! N’ụzọ dị otú a, ọnụ gị na-aghọ “isi iyi nke ndụ.”—Ilu 10:11; Aịsaịa 52:7.

Mmiri na-ede ala nke ọma wee mee ka ihe too eto, ebe idei mmiri pụrụ ibibi ihe. Ozọkwa, mmiri a ṅụrụ n’ụdị ihe ọṅụṅụ jụrụ ezigbo oyi pụrụ ịbụ ihe na-enye ume ọhụrụ, ma ònye ka ọ ga-amasị ịnọ n’èzí mgbe oké ifufe oyi na-efe ma ọ bụ mgbe akụ mmiri igwe na-ada? Ebe ọ bụ na e jiriwo ihe na-esi anyị n’ọnụ na-apụta tụnyere mmiri, ọ dị mkpa iji ezi nlezianya mee ihe n’ihe banyere izi ihe anyị. (1 Timoti 4:16) Anyị aghaghị ilezi anya karịsịa n’ihe banyere mmetụta dị iche iche “mmiri” nke a na-enwe mgbe anyị kwusaara ndị ikwu anyị ozi ọma.

Ime Ka Ndị Ikwu “Ṅụjuo Afọ”

N’oge ochie, Rehab megheere ndị ezinụlọ ya ụzọ nlanarị, Kọniliọs gbakwara àmà n’ihu ndị ikwu ya. (Joshua 2:13; 6:23; Ọrụ 10:24, 30-33) Nwanne Pita bụ Andru nyeere ya aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jisọs. (Jọn 1:40-42) N’oge a kwa, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na-ekwere ka eziokwu Bible sọgara ndị ikwu ha dị ka mmiri. Ilu 11:25 na-ekwe nkwa, sị: “Onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”

Otu nwanyị bi na Europe nwere ọchịchọ iso ndị mụrụ ya, ụmụnne ya ndị nwoke, na ụmụnne ya ndị nwanyị ndị bi na Philippines kerịta okwukwe ọhụrụ o nwetara. Ọ kọrọ, sị: “Emere m nke ahụ n’ime akwụkwọ ozi ọ bụla m degaara ha. Tupu m mee baptism, ezijeere m ha akwụkwọ dị iche iche, jụọkwa ha ma ọ̀ ga-amasị ha ka Ndịàmà Jehova bịa leta ha.” N’ụzọ wetaara ya oké ọṅụ, ha kwenyere ka a bịa leta ha, ugbu a kwa, asatọ n’ime ha na-efe Jehova. Ụfọdụ Ndịàmà arụpụtawo ihe ndị dị mma site n’izijere ndị ikwu ha ụtụ Ụlọ Nche na Teta! dị ka onyinye.

Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ gị enweghị mmasị ọ bụla? Jisọs chere ọnọdụ dị otú a ihu, n’ihi na n’otu oge “ọbụna ụmụnne ya ekweghị na ya.” Otú ọ dị, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ha nile “ji otu obi” nọgidesie ike n’ekpere, ha na ndị ozi ahụ. (Jọn 7:5; Ọrụ 1:14) Gịnị kpatara mgbanwe obi ahụ? Ihe àmà gosiri na Jisọs nyeere ndị ikwu ya aka tupu ọ lọghachi n’eluigwe. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? O nyeere ha aka inweta okwukwe site n’ime ka onye ahụ otu nne ji ya na ya, bụ́ Jemes, hụ ya anya. (1 Ndị Kọrint 15:7) Otú a, akwụsịla ịnwa inyere ndị ikwu gị aka. Ọtụtụ Ndịàmà enwewo ike isoro ndị ikwu ha na-ekweghị ekwe kwurịta okwu banyere eziokwu Bible mgbe ha jiworo ndidi chere maka oge kwesịrị ekwesị.

Otú ọ dị, ime ka ndị ikwu “ṅụjuo afọ” apụtaghị ịgwabiga ha okwu ókè. Otu di na nwunye bụ́ ndị Yugoslavia kọrọ, sị: “A na-enwekarị ihe ize ndụ nke ịgwa ha ozi ọma gabiga ókè.” Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ụmụnna na-emebigakarị ya ókè, na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi na-ekwesịghị ekwesị.” Ludwig na-echetaghachi oge ọ malitere ịmụ Bible, sị: “Mgbe ahụ amalitere m ịgwabiga nne m okwu ókè ruo ọtụtụ awa n’akwụsịtụghị akwụsịtụ banyere nkọwa nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile m na-amụta site na Bible, nke a na-akpatakarịkwa nrụrịta ụka, karịsịa n’etiti mụ na nna m.”

Bụrụ “Isi Iyi Amamihe”

Anyị na-agụ na “ire ndị maara ihe na-eme ka ihe ọmụma dị mma: ma ọnụ ndị nzuzu na-ekwuwa okwu uche gbagọrọ agbagọ,” na “obi onye ezi omume [na-atụgharịkwa] uche n’ịza okwu.” (Ilu 15:2, 28) Inwe ezi echiche, amamihe, na nghọta si otú a bụrụ ihe a chọrọ iji wee mee ka okwu anyị bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ, na-ewulikwa elu. Mgbe anyị ga-ekwu okwu, ihe anyị ga-ekwu, na ókè anyị ga-ekwudebe ya dị mkpa.

Dị ka ihe atụ, n’ụbọchị okpomọkụ, lee ka iko mmiri oyi na-esi abụ ihe na-enye ume ọhụrụ nye onye akpịrị na-akpọ nkụ! (Matiu 10:42) Ma ọ dịghị onye ga-eche echiche ịwụ onwe ya bọketi mmiri n’ahụ! Onye nlekọta sekit ahụ e hotara okwu ya n’elu kwuru, sị: “Ndị na-arụpụta ihe kachasị mma bụ ndị ahụ na-akpali ọchịchọ ịmata ihe n’ime ndị ikwu ha site n’ịgbara ha àmà n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị nta.” Mgbe onye ikwu nke na-emegide emegide malitere inwe akpịrị ịkpọ nkụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, wee malite ịjụ ajụjụ dị iche iche, mkparịta ụka ndị dabeere na Bible, bụ́ ndị na-arụpụta ihe dị mma na-esochikarị.

Huriye, otu Onyeàmà bụ́ onye Turkey, mezuru nke a n’ụlọ ya site n’idobe akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Bible ma saghee ha gaa n’ebe nwere isiokwu ndị pụrụ ịkpali mmasị nke di ya bụ́ onye na-ekweghị ekwe. Ọ na-agụrụ ụmụ ya akụkọ Bible dị iche iche—ọ bụrụkwa na di ya na-ege ntị—ọ na-enye nkọwa ndị ga-abara ya uru. Mgbe ụfọdụ ihe ọ na-eme bụ nanị ịjụ, sị: “Amụtara m ihe dị otú a ma ọ bụ otú a n’ọmụmụ ihe m taa. Gịnị ka i chere banyere ya?” O kwukwara okwu banyere ụkpụrụ akparamagwa ndị a na-eburu n’uche: “Nọọ nwayọọ, abụkwala onye a kpasuru iwe. Abụla onye mazuru ihe nile. Nanị nwee obi umeala ma nọrọ ka a na-eduzi gị eduzi.” Di ya mesịrị nakwere eziokwu Alaeze ahụ, ugbu a ọ na-ejekwa ozi dị ka onyeozi oge nile.

Marijan nyeere ọtụtụ n’ime ndị ikwu ya aka ịnakwere okwukwe ya. “Amanyela ha amanye kama chere maka oge kwesịrị ekwesị,” ka ọ tụrụ aro ya. “Anyị kwesịrị ịsọpụrụ ọchịchọ ha mgbe ha gwara anyị ka anyị ghara ịgwa ha okwu banyere eziokwu ahụ. Anyị aghaghị inwe ndidi na ịhụnanya.” Eklisiastis 3:7 dị nnọọ irè karịsịa mgbe ndị ikwu na-emegide emegide. Ọ sịrị na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” Nke ahụ na-egosi na mmadụ kwesịrị ịdị njikere iji ndidi gee ntị, ọ bụghị ịnara ndị ọzọ okwu n’ọnụ, na-asọpụrụkwa echiche ndị ọzọ. “Ọ dịghị ezi uche dị n’ịmalite oké nrụrịta ụka mgbe gị na ndị ikwu gị na-enwe mkparịta ụka,” ka Petar kwuru, bụ́ onye mmegide na mbụ ma mesịa gbanwee ọnọdụ ya.

Kwee Ka Àgwà Ọma Kwuo Okwu

Ruo ọtụtụ afọ, otu onye bụ di nke na-ekweghị ekwe nyere nwunye ya bụ́ onye Kraịst nsogbu nke ukwuu, mgbe ụfọdụ na-akpọchi ụzọ ka ọ ghara ịbata n’ụlọ. N’otu mgbe, o were oké iwe nke na ọ dọkasịrị akwụkwọ nwanyị ahụ chefuru idebe ebe o kwesịrị ịdị. Gịnị gbanwere àgwà ya? Ọ kọwara, sị: “Anọgidere m na-ajụ onwe m ihe mere nwunye m ji nọgidesie ike, nọgidekwa na-adabere n’ebe Jehova nọ. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla m hụrụ ọ na-eme, ebe ọ bụ na ọ na-edozi ụlọ nke ọma, ọ bụkwa ezi nwunye na nne nye ụmụntakịrị anyị.” Otu ụbọchị, di ya nọ na-achọ isi ihe ndị dị mma ọ ga-ekwu n’oge o nwere ohere ikwu okwu minit ise ná nnọkọ ọmụmụ ihe, nwunye ya wee nye ya mbipụta abụọ nke Teta! Ọ bụchaghị nnọọ obi di ya ileba anya n’akwụkwọ ndị ahụ, ma n’ụzọ bụụrụ ya ihe ijuanya, ọ chọtara isiokwu bara uru banyere ụzọ e si emepụta pencil. N’ụzọ dị otú a, a kpaliri mmasị ya n’ebe magazin ndị ahụ dị. Taa, ezinụlọ nke a dị n’otu n’ofufe Jehova.

Ndụmọdụ Pita onyeozi nke bụ na onye bụ nwunye pụrụ irite di ya n’uru ‘n’ekwughị okwu ọ bụla site n’ibi obi dị ọcha ya na nsọpụrụ dị omimi’ metụtakwara ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ. (1 Pita 3:1, 2) Mgbe otu di na nwunye hapụrụ omenala na okpukpe ochie na-adabereghị na Bible nke ndị mụrụ ha, bụ́ ndị Romania, ezinụlọ ha abụọ malitere imegide ha nke ukwuu. Ọbụna na nne nke nwoke wakwasịrị nke nwanyị ahụ ọgụ, wee nwaa igbu ya. “Anyị ekweghị ka nke a kụda anyị aka ma ọ bụ kpasuo anyị iwe. Anyị tụkwasịrị nchegbu anyị nile n’ebe Jehova nọ,” ka Nikolic kọrọ. Mgbe afọ iri na otu gasịrị, ndị mụrụ nke nwoke ahụ, ụmụnne ya ndị nwanyị abụọ, na ndị lụrụ ụmụnne ya ndị nwanyị ahụ abụwo Ndịàmà mere baptism. Ọ̀ bụ gịnị kwụsịrị nsogbu ahụ? “Ezi ihe nlereanya na àgwà ndị Kraịst. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị etinyeghị oge dị ukwuu n’ịgwa ha okwu banyere eziokwu ahụ. Kama nke ahụ, anyị gbalịrị itinye ya n’omume.”

Ahapụla Inwe Olileanya!

Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe na-akpata oké ọṅụ ịhụ ka ndị ikwu gị na-amalite ife ezi Chineke ahụ, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ụfọdụ anọgide na-emegide emegide? Olee ụzọ i kwesịrị isi meghachi omume? Jisọs amaworị na ezi ofufe ga-akpata nkewa dị omimi mgbe ụfọdụ n’etiti ndị ikwu. (Matiu 10:34-37) Mgbe Marica ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ndị ezinụlọ ya nile gbakụtara ya azụ. Ọ bụ ezie na o kwenyereghị ha n’ihe ọ bụla metụtara ofufe ya, ma ọ matara na “ọbụna ndị ikwu nwekwara ohere ikwupụta echiche nke ha.” Àgwà ya kpaliri ha inye ya nsọpụrụ dị ka ha na-emebu na mbụ.

Ludwig matara na ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ya ịhụ ndị mụrụ ya n’anya ọbụna ma a sị na ha họọrọ ịgbaso ụzọ ndụ dị iche. Ọ nọgidere na-echetaghachi akụkụ Bible ndị metụtara ya dị ka: “Sọpụrụ nna gị na nne gị”; “ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ”; ‘dịrị njikere ịgọpụrụ onye ọ bụla site n’obi dị nwayọọ na nsọpụrụ dị omimi’; na, “ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ.” (Ndị Efesọs 6:2; Ndị Kọlọsị 4:6; 1 Pita 3:15; 2 Timoti 2:24) “Mgbe ọ bụla m kpọrọ ndị mụrụ m na telifonu ma ọ bụ jee ileta ha, ana m ekpeku Jehova ekpere maka amamihe, nke nta nke nta, mmekọrịta anyị dịwanyere mma, na-abụ nke ndị bụ enyi karị,” ka ọ kọrọ.

Akwụsịla inwe olileanya na mkpụrụ eziokwu ndị ahụ ga-emesịa pulite n’ime obi nke ndị ikwu gị. Otu onye bụ di nke mere baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova 31 afọ mgbe nwunye ya mesịrị, kwuru, sị: “N’icheghachi echiche azụ, aghaghị m ikwupụta na nwunye m nwere ndidi dị ukwuu n’ebe m nọ. Amaara m nke ọma na o kpekuru Jehova ekpere ọtụtụ ugbo n’isi m.”

Ka okwu nile si n’ọnụ gị na-apụta na-abụ ihe na-akpali akpali, bụrụkwa ihe na-emeju akpịrị ịkpọ nkụ dị ka ezi mmiri ọṅụṅụ! Ee, soro mmadụ nile, gụnyere ndị ikwu gị, kerịta “ozi ọma dị ebube nke Chineke obi ụtọ ahụ.” (1 Timoti 1:11, NW; Mkpughe 22:17) Mgbe ahụ, okwu Jisọs ahụ ga-enwe mmezu, nke bụ: “Onye na-ekwere na mụ, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ kwuru, n’afọ ya ka osimiri nke mmiri dị ndụ ga-esi na-erupụta.”—Jọn 7:38.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya