Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/97 p. 1
  • Gịnị Banyere Ndị Ikwu Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Banyere Ndị Ikwu Gị?
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgbara Ndị Ikwu Àmà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Jiri Mmiri nke Eziokwu Nye Ndị Ikwu Gị Ume Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Otú Ị Ga-esi Nweta Obi Ndị Ikwu Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Eziokwu Na-eweta “Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 2/97 p. 1

Gịnị Banyere Ndị Ikwu Gị?

1 Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị nwere ọtụtụ ndị ikwu na-anọghị n’eziokwu. Lee ka anyị si achọsi ike ka ndị dị otú ahụ a hụrụ n’anya sonyere anyị n’ụzọ na-eduga ná ndụ! Nchegbu anyị maka ọdịnihu ebighị ebi ha pụrụ ịdị ukwuu karị mgbe ha bụ ndị òtù ezinụlọ anyị. Ọ bụ ezie na anyị agbalịwo ruo ọtụtụ afọ ime ka ha nwee mmasị n’eziokwu ahụ, anyị ekwesịghị ikwubi na olileanya adịghị n’ọnọdụ ahụ.

2 Mgbe Jisọs mere nkwusa ya, “ọbụna ụmụnne Ya ekweghị na Ya.” (Jọn 7:5) N’otu oge, ndị ikwu ya chere na anya adịghị ya mma. (Mak 3:21) Ma, Jisọs adaghị mbà n’ebe ha nọ. Ka oge na-aga, ụmụnne ya nakweere eziokwu ahụ. (Ọrụ 1:14) Onye otu nne ji ya na ya bụ́ Jemes ghọrọ ide n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Gal. 1:18, 19; 2:9) Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inwe ọṅụ nke ịhụ ndị ikwu gị ka ha nabatara eziokwu ahụ, akwụsịla ịgbalị iji ozi ọma Alaeze ahụ rute ha.

3 Na-enye Ume Ọhụrụ, Ọ Bụghị Mbogbu: Mgbe Jisọs kwusaara ndị ọzọ ozi ọma, ndị na-ege ya ntị nwetara ume ọhụrụ, ọ bụghị ndị a kakwasịrị anya. (Mat. 11:28, 29) O jighị nkụzi nke ha na-apụghị ịghọta bogbuo ha. Iji mee ka ndị ikwu gị nwee ume ọhụrụ site ná mmiri nke eziokwu, nye ha otu iko n’otu oge, ọ bụghị otu bọket! Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ndị na-akpalite ọchịchọ ịmata ihe nke ndị ikwu ha site n’ịgbara ha àmà nwayọọ nwayọọ na-arụpụta ihe ndị kasị mma.” N’ụzọ dị otú a, ọbụna ndị mmegide pụrụ ịmalite ịjụ ajụjụ ma mesịa zụlite akpịrị ịkpọ nkụ maka eziokwu ahụ.—1 Pita 2:2; tụlee 1 Ndị Kọrint 3:1, 2.

4 Ọtụtụ ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye agbaworo ndị òtù ọlụlụ ha na-ekweghị ekwe àmà n’ụzọ dị irè site n’ighebe otu akwụkwọ oghe n’isiokwu nke pụrụ ịmasị ha. Otu nwanna nwanyị mere nke a duzikwaara ụmụaka ya ọmụmụ ihe ebe di ya ga na-anụchata ya, na-enye nkọwa ndị ga-abara ya uru. Mgbe ụfọdụ ọ ga-ajụ ya, sị: “Amụtara m ihe dị otú a ma ọ bụ otú a n’ọmụmụ ihe m taa. Gịnị ka i chere banyere ya?” N’ikpeazụ di ya nakweere eziokwu ahụ.

5 Na-akwanye Ùgwù, Ọ Bụghị Enweghị Ndidi: Otu onye nkwusa kwuru na “ọbụna ndị ikwu nwere ikike inwe nkweta na echiche ndị nke ha.” Ya mere anyị kwesịrị igosi nkwanye ùgwù mgbe ha kwupụtara echiche ha ma ọ bụ gwa anyị kpọmkwem ka anyị ghara ịgwa ha okwu banyere eziokwu ahụ. (Ekli. 3:7; 1 Pita 3:15) Site n’inwe ndidi ma na-ahụ n’anya na site n’ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma, anyị pụrụ ịchọta ohere ndị kwesịrị ekwesị iji gbaa àmà n’ụzọ akọ. Ndidi dị otú ahụ pụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ, dị ka a hụrụ n’ọnọdụ nke otu di bụ́ onye Kraịst nke jiri ndidi nagide mmeso ọjọọ nke nwunye ya na-ekweghị ekwe ruo afọ 20. Ozugbo ọ malitere ime mgbanwe, o kwuru, sị: “Lee ka m si wee na-ekele Jehova na o nyeere m aka ịzụlite ogologo ntachi obi, n’ihi na apụrụ m ịhụ ihe ọ rụpụtara ugbu a: Nwunye m amalitewo ije ije n’okporo ụzọ nke ndụ!”

6 Gịnị banyere ndị ikwu gị? Ọ pụrụ ịbụ na site n’ezi àgwà ndị Kraịst gị na ekpere gị n’ihi ha, “ị pụrụ iritere ha Jehova n’uru.”—1 Pita 3:1, 2, nkọwa ala ala peji nke NW.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya