Kere Òkè n’Ọrụ A Na-agaghị Arụghachi Ọzọ
1 N’oge dị iche iche n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ dịwo mkpa ka Jehova mezuo ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ndị iro ya. Otú ọ dị, n’ihi ebere ya, o nyere ndị obi ha ziri ezi ohere maka nzọpụta. (Abụ Ọma 103:13) Nzaghachi ha kpebiri ọdịnihu ha.
2 Dị ka ihe atụ, tupu Iju Mmiri ahụ, na 2370 T.O.A., Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume.” Ndị lara n’iyi bụ ndị leghaara ịdọ aka ná ntị Chineke anya. (2 Pita 2:5; Hib. 11:7) Tupu mbibi nke Jerusalem na 70 O.A., Jisọs kwupụtara n’ụzọ doro anya ihe ga-adị mkpa ka mmadụ mee iji lanarị mkpochapụ nke gaje ịbịakwasị obodo ahụ. Ndị nile jụrụ ozi ịdọ aka ná ntị ya nwetara ihe ndị dị njọ si na ya pụta. (Luk 21:20-24) E kwughachiri ịdọ aka ná ntị na ikpe ndị dị otú ahụ sitere n’aka Chineke ọtụtụ ugboro n’akụkọ ihe mere eme nile.
3 Ọrụ Ịdọ Aka ná Ntị nke Oge A: Ogologo oge gara aga, Jehova kwupụtara na a ga-awụpụ iwe ya megide ajọ usoro ihe nke taa nakwa na ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi ga-alanarị. (Zef. 2:2, 3; 3:8) Oge maka ikwusa ozi ịdọ aka ná ntị a ji ọsọ na-agwụ! “Mkpagbu ukwu” ahụ dị nnọọ n’ihu, a na-achịkọtakwa ndị dị umeala n’obi ugbu a. N’ezie, “ubi” ahụ “chara acha ugbu a ka e were ihe dị n’ime ha.” N’ihi ya, ọ dịghị ọrụ ọzọ a pụrụ iji tụnyere nke a ma a bịa n’ịdị mkpa na ịdị ngwa.—Mat. 24:14, 21, 22; Jọn 4:35.
4 Anyị aghaghị ikere òkè n’ịkpọsa ịdọ aka ná ntị nke oge a gwa ndị ọzọ, “ma hà ga-anụ, ma hà ga-aghara.” Nke a bụ ọrụ Chineke nyere, nke anyị na-agaghị anwa ileghara anya. (Ezik. 2:4, 5; 3:17, 18) Anyị ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a na-enye ihe àmà doro anya nke ịhụnanya anyị miri emi maka Chineke, ezi nchegbu anyị maka ndị agbata obi anyị, na okwukwe anyị siri ike n’ebe Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jisọs Kraịst nọ.
5 Ugbu A Bụ Oge Ime Ihe: Mgbe ikpe ndị gara aga nke Jehova gasịrị, ajọ omume na-ebilite ọhụrụ mgbe nile n’ihi na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ka na-akpa ike. Otú ọ dị, ugbu a ọ ga-adị iche. A ga-ewepụ mmetụta Setan. Ịdọ aka ná ntị zuru ụwa ọnụ banyere “oké mkpagbu” na-abịanụ agakwaghị adị mkpa ọzọ. (Mkpu. 7:14; Rom 16:20) Anyị nwere ihe ùgwù pụrụ iche nke iso n’ọrụ a na-agaghị arụghachi ọzọ. Ugbu a bụ oge maka anyị iji ohere a mee nnọọ ihe nke ọma.
6 Banyere ọrụ nkwusa ya, Pọl onyeozi, ná nkwenye dị ukwuu, kwuru, sị: “Adị m ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị.” (Ọrụ 20:26) Ọ dịghị ya ka o nwere ikpe ọmụma ọbara n’ihi akpọsaghị ịdọ aka ná ntị ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ pụrụ ikwu banyere ozi ya, sị: “Ana m adọgbukwa onwe m n’ọrụ ime ihe a, na-agbasi mgba ike.” (Kọl. 1:29) Ka anyị nweta otu afọ ojuju ahụ nke ikere òkè ruo n’ókè o kwere omume n’ọrụ ahụ a na-agaghị arụghachi ọzọ!—2 Tim. 2:15.