Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/97 p. 2
  • Ememe Ncheta—Ihe Omume Dị Oké Mkpa!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ememe Ncheta—Ihe Omume Dị Oké Mkpa!
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-agọzi Mbọ Anyị Na-agba Ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ihe Mere Anyị Ji Aga Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • “Na-emenụ Nke A”—A Ga-enwe Ncheta Ọnwụ Jizọs n’Eprel 5
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 2/97 p. 2

Ememe Ncheta—Ihe Omume Dị Oké Mkpa!

1 Na Sunday, March 23, mgbe anyanwụ dasịrị, anyị ga-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. (Luk 22:19) Nke a bụ n’ezie ihe omume dị oké mkpa! Site n’iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Jehova ruo ọnwụ, Jisọs gosipụtara na ọ pụrụ ikwe mmadụ omume ijigide nsọpụrụ Chineke zuru okè ọbụna n’okpuru oké nrụgide, wee si otú a na-akwado izi ezi nke ọbụbụeze Jehova. (Hib. 5:8) Tụkwasị na nke a, ọnwụ Kraịst nyere àjà mmadụ ahụ zuru okè nke dị mkpa iji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ, na-eme ka o kwe omume ndị nwere okwukwe ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Site n’ịbịa Ememe Ncheta, anyị pụrụ igosipụta ekele sitere anyị n’obi maka ịhụnanya Jehova na maka àjà Jisọs chụrụ n’ihi anyị.

2 A na-agba mmadụ nile ume ịgbaso usoro ọgụgụ Bible ahụ e dokwara maka March 18-23, dị ka e gosipụtara ya na 1997 Calendar of Jehovah’s Witnesses. Ọzọkwa, ntụle ezinụlọ nke isi nke 112-116 nke akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ga-enye aka ịtụkwasị uche anyị n’izu ahụ kasị dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme mmadụ.

3 Ị̀ pụrụ ịmụba oge ị na-etinye n’ozi ubi n’oge Ememe Ncheta? Ọtụtụ ndị nkwusa ga-eji ngwụsị izu ise e nwere na March mee ihe n’ụzọ zuru ezu ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Gịnị ma i sonyere ha? Anyị nile pụrụ ikere òkè zuru ezu n’imesi mkpa ọ dị ike ịbịa Ememe Ncheta ahụ. Ebe ọ dabanyere n’ụbọchị Sunday, ọ ga-adịrị ọtụtụ ndị mfe karị ịbịa. Hụ na ị kpọrọ ndị nile a na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị òkù isonyere anyị. Soro ha kerịta ihe e kwuru n’akwụkwọ Ihe Ọmụma na peji nke 127, paragraf nke 18, banyere otu ụbọchị ahụ n’afọ bụ́ nke a ga-edebe n’ụzọ pụrụ iche.

4 Jiri ekele miri emi maka ihe nile ọnwụ Jisọs pụtaara anyị mesoo ihe omume a kasịnụ nke 1997. Bịa n’uhuruchi nke March 23, mgbe ezi ndị Kraịst n’ebe nile ga-eji ikwesị ntụkwasị obi mee Ememe Ncheta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya