A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
Ị̀ Pụrụ Ịsụ Ụzọ Inyeaka na March? April? May?
1 “A Chọrọ 1,000 Ndị Nkwusa” bụ ihe a kpọrọ otu isiokwu e bipụtara ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1881. O nwere ịkpọ òkù nye ndị ikom na ndị inyom nile raara onwe ha nye, “bụ́ ndị Onyenwe anyị nyere ihe ọmụma nke eziokwu Ya,” iji oge ọ bụla ha pụrụ inwe kere òkè n’ịgbasa eziokwu Bible. A gbara ndị pụrụ itinye ọkara ma ọ bụ karịa nke oge ha kpam kpam n’ọrụ Onyenwe anyị ume inye onwe ha n’afọ ofufo dị ka ndị colporteur na-ezisa ozi ọma—ndị obu ụzọ nke ndị ọsụ ụzọ taa.
2 Ọ bụ ezie na oge agbanwewo eri afọ ndị 1800, otu eziokwu agbanwebeghị—ndị ohu Chineke raara onwe ha nye chọrọ ịnọgide na-eji oge dị ukwuu dị ka o kwere omume mee ihe n’ịgbasa ozi ọma ahụ. Ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka na-eme ka ndị nkwusa ọgbakọ nwee ike ịdịwanye irè ka ha na-etinyekwu oge n’ozi Alaeze.—Kọl. 4:17; 2 Tim. 4:5.
3 Eri mgbe ọ malitere, ọtụtụ narị puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị arụwo ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ịnụ ọkụ n’obi maka akụkụ a nke ozi ọsụ ụzọ mụbara ruo n’ókè nke na e ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị 22,000 ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ókèala alaka Nigeria n’April 1990! N’ezie e nwere ohere iru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 30,000 na 1997.
4 Anyị na-agba gị ume inwe ihe mgbaru ọsọ nke ịsụ ụzọ inyeaka n’ime otu ọnwa ma ọ bụ karịa n’ọnwa March, April, na May. N’ihi gịnị ka a ga-eji gụnye March? N’ihi na n’afọ a Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst dabara na Sunday, March 23. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọzọ ka mma anyị pụrụ isi jiri izu ndị bu Ememe Ncheta ụzọ mee ihe karịa iji ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ọrụ ime nkwusa Alaeze nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jisọs Kraịst guzobere. N’ịgba ikpo àmà dị ukwuu na March, anyị pụrụ ịkpọ ọtụtụ ndị nwere mmasị òkù isonyere anyị ná ncheta nke ọnwụ Kraịst. March ga-apụkwa iche n’ihi na, ná nke mbụ ya, anyị ga-enyefe akwụkwọ ọhụrụ ahụ, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ọzọkwa, ọnwa March nwere Saturday ise na Sunday ise, na-enye ohere maka ọrụ dị ukwuu ná ngwụsị izu n’ozi ubi. N’ezie, n’ọnwa April na May, mgbalị ịnụ ọkụ n’obi a nọgidere na-egosi n’ozi ahụ ga-enye anyị ohere isochi mmasị anyị chọtara na ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ọhụrụ, na-eji broshuọ ahụ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Anyị ga-arụzukwu ókèala anyị nke ọma, karịsịa ná ngwụsị izu, na-eji mbipụta Ụlọ Nche na Teta! ọhụrụ ndị bịara n’oge ha.
5 Ònye Ruru Eru Ịsụ Ụzọ Inyeaka?: Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 114, na-akọwa, sị: “N’agbanyeghị ọnọdụ gị ná ndụ, ọ bụrụ na i mewo baptism, nweekwa omume dị mma, nweekwa ike idokwa maka iru ihe a na-achọ n’aka mmadụ nke itinye 60 hour n’otu ọnwa n’ozi ubi, kwerekwa na ị pụrụ ije ozi otu ọnwa ma ọ bụ karịa dị ka ọsụ ụzọ inyeaka, ndị okenye ọgbakọ ga-enwe obi ụtọ ịtụle akwụkwọ i tinyere maka ihe ùgwù ije ozi nke a.” Ị̀ pụrụ ịhazi ihe omume gị maka ihe ùgwù a na March? April? May?
6 Àgwà dị mma n’akụkụ nke òtù ndị okenye tinyere nkwado sitere n’obi dum nke ndị nkwusa ndị ọzọ kwesịrị ime ka nzaghachi n’òkù a maka ndị ọsụ ụzọ inyeaka 30,000 bụrụ nnọọ ihe gara nke ọma. (Hib. 13:7) A na-agba ndị isi ezinụlọ nile ume ịchọpụta mmadụ ole n’ime ezinụlọ ha pụrụ isonye n’ìgwè ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ime otu ma ọ bụ karịa n’ọnwa ndị na-abịanụ.—Abụ Ọma 148:12, 13; tụlee Ọrụ 21:8, 9.
7 Adịla ngwa ikwubi na ị gaghị enwe ike ịsụ ụzọ inyeaka n’ihi ọrụ ego oge nile gị, usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ, ibu ọrụ ezinụlọ, ma ọ bụ ọrụ ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro. Nye ụfọdụ o nwere ike ọ gaghị adị mfe ikere òkè; ka o sina dị, site n’ezi nhazi na ngọzi Jehova, ha pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. (Abụ Ọma 37:5; Ilu 16:3) Kwee ka ọchịchọ ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ chịkwaa ọnọdụ gị; ekwela ka ọnọdụ gị chịkwaa ọchịchọ gị ịsụ ụzọ. (Ilu 13:19a) N’ihi ya, site n’ịhụnanya siri ike maka Jehova na maka ndị mmadụ ibe ha, ọtụtụ enwewo ike ịhazigharị ihe ha na-eme mgbe dum ná ndụ n’izu iji wee mụbaa ozi ha otu ọnwa n’otu oge. (Luk 10:27, 28) Ọtụtụ ngọzi na-echere ndị na-adọgbusi onwe ha n’ọrụ ike n’ozi Alaeze ahụ.—1 Tim. 4:10
8 Ihe Ịsụ Ụzọ Inyeaka Na-arụzu: Mgbalị sitere n’obi dum nke ọtụtụ puku ndị ohu Chineke na-etinye n’ịsụ ụzọ inyeaka na-arụpụta oké iti mkpu otuto nye Jehova. Ka ndị mkpọsa Alaeze a na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ịgbasa ozi ọma ahụ nye ọtụtụ ndị mmadụ karị, a na-adọta ha nso n’ebe Jehova nọ karị n’ihi na ha na-amụta ịdaberekwu n’ebe ọ nọ maka mmụọ na ngọzi ya.
9 Inwe ndị ọsụ ụzọ inyeaka, ndị oge nile, na ndị pụrụ iche na-arụsi ọrụ ike n’etiti anyị na-arụpụta mmụọ dị ọhụrụ nke inwe ume n’ime ọgbakọ. Ịnụ ọkụ n’obi ha na-efe efe ka ha na-ekwu banyere ahụmahụ ubi ha. Nke a na-akpali ndị ọzọ ilerughachi anya n’ihe ndị ha na-ebute ụzọ na ikike ha maka inwe òkè mụbara amụba n’ọrụ ahụ kasị mkpa nke ozi ahụ. Otu nwanna nwanyị e mere baptism mgbe ọ dị afọ 70 malitere ịsụ ụzọ inyeaka ozugbo n’akwụsịghị akwụsị. Afọ ụfọdụ n’ihu mgbe a jụrụ ya ihe kpatara na, n’afọ ndụ ya, ọ ka ji na-adọgbu onwe ya n’ọrụ nke ukwuu otú a n’ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka kwa ọnwa, o kwuru na ya chere na afọ 70 ndị mbụ nke ndụ ya lara n’iyi, ọ chọghịkwa ịla afọ ọ bụla fọdụrụ ná ndụ ya n’iyi!
10 Onye ọ bụla na-ekere òkè n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na-azụlite nkà ka irè n’ozi ahụ. Otu Onyeàmà na-eto eto kwetara, sị: ‘N’oge m bụ nwata ana m esonyere ndị mụrụ m n’ọrụ ime nkwusa ha. Ozi ubi bụ ihe na-atọ m ụtọ n’ezie. Otú ọ dị, ka oge na-aga, o doro m anya na n’ụlọ akwụkwọ adị m iche n’ìgwè ndị ọzọ. Mgbe ahụ ọ ghọọrọ m ihe ihere ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe m okwu banyere eziokwu ahụ. Mgbe m na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, amalitere m ịtụ ụjọ izute onye m maara n’ụlọ akwụkwọ. N’ọnọdụ nke m echere m na nsogbu ahụ bụ egwu mmadụ. [Ilu 29:25] Mgbe m pụtasịrị n’ụlọ akwụkwọ, ekpebiri m ịnwale ịsụ ụzọ ruo nwa oge. Dị ka ihe si na ya pụta, ime nkwusa ghọrọ ihe na-amasị m otú ọ na-adịbughị ná mbụ. Adịkwaghị m ele ya anya dị ka ihe e ji egwuri egwu, ma ọ bụ dị ka ibu dị arọ. Ka m na-ahụ ndị m na-amụrụ Bible ka ha na-aga n’ihu n’eziokwu ahụ, ana m enwe mmetụta nke afọ ojuju miri emi n’ihe àmà ahụ bụ na Jehova Chineke na-akwado mgbalị m.’ Onye ntorobịa a gara n’ihu ije ozi dị ka ọsụ oge nile.
11 N’ile ya anya dị ka o si dị, mgbe ọtụtụ ndị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ime ọgbakọ, ọ na-akpata nrụzu ókèala nke ọma. Nwanna nwoke nke na-ahụ maka ikenye ókèala pụrụ ịrịọ ndị ọsụ ụzọ inyeaka maka enyemaka ha n’ịrụzu akụkụ ebe ndị a na-adịghị arụkebe ọrụ. Iburu ihe oriri na itinye ụbọchị zuru ezu nke ije ozi ga-eme ka o kwe omume ịrụ ọbụna akụkụ ndị dị anya nke ókèala.
12 Ndị Okenye Ga-ebu Ụzọ Mee Nkwadebe: N’ime ọnwa atọ na-abịanụ, e kwesịrị ime ndokwa iji hazie ụdị dị iche iche nke ọrụ ịgba àmà n’oge dị iche iche n’izu, gụnyere etiti ehihie na mmalite uhuruchi, ka ọtụtụ ndị ruo n’ókè o kwere omume wee nwee ike ikere òkè. Tụkwasị n’ọrụ ụlọ n’ụlọ a na-arụ mgbe nile, gụnye oge maka ịgba àmà okporo ámá, ịrụ ọrụ n’ógbè azụmahịa, na ịkpọtụrụ ndị na-anọghị n’ụlọ. Site n’ime otú a, ndị okenye na-enyere ndị ahụ na-asụ ụzọ aka isoro ọgbakọ kere òkè n’ozi n’oge nke ga-akasị dị irè ma daba adaba maka ndị ọsụ ụzọ ahụ. E kwesịrị ịgwa ọgbakọ nke ọma banyere ndokwa ije ozi ubi nile. E kwesịrị ịhazi nduzi nke nzukọ ije ozi nke ọma. Ọzọkwa, e kwesịrị inwe ókèala zuru ezu, tụọkwa ọda magazin na akwụkwọ ndị ọzọ n’ókè zuru ezu n’egbughị oge.
13 Hazie Usoro Ihe Omume Ije Ozi Onwe Gị: Otu nwanna nwoke, bụ́ onye obi na-esichaghị ike ná mbụ banyere ịsụ ụzọ inyeaka kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ mfe karịa otú m cheburu na ọ ga-adị. Ihe ọ chọrọ bụ nanị ndokwa dị mma.” N’azụ peji ihe ntinye a, ị̀ na-ahụ ihe atụ usoro ihe omume ọsụ ụzọ inyeaka nke ga-adịrị gị irè? Hour 15 kwa izu maka ozi ahụ agwụla ihe a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka.
14 Iji wee jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka, ndị nwunye na-anọ n’ụlọ na ndị na-arụ ọrụ n’ehihie pụrụ mgbe mgbe ịhazi ụtụtụ ha maka ozi ubi. Ụmụaka na-aga akwụkwọ na ndị na-arụ ọrụ n’anyasị na-enwekarị ike iwepụta ehihie maka ọrụ nkwusa. Ndị na-arụ ọrụ ego oge nile achọpụtawo na o kwere omume iwepụta otu ụbọchị nke ọrụ n’ime izu ma ọ bụ iwepụta ngwụsị izu zuru ezu maka ozi ahụ tụkwasị n’ịgba àmà uhuruchi. Ọtụtụ ndị ije ozi ubi ha na-abụkarị ná ngwụsị izu na-ahọrọ ọnwa ndị nwere ngwụsị izu ise zuru ezu. N’afọ a, nke ahụ bụ eziokwu banyere March, nakwa August na November. N’iji usoro ihe omume a na-edeghị ihe na ya dị na peji nke 6 bụ́ nke e wepụtara dị ka ihe nduzi eme ihe, jiri nlezianya na ekpere chee echiche ihe ga-abụ usoro ihe omume ije ozi dị irè maka ọnọdụ gị.
15 Otu abamuru nke ndokwa ịsụ ụzọ inyeaka bụ ikike ime mgbanwe ya. Ị pụrụ ịhọrọ ọnwa ndị ị ga-asụ ụzọ na ha, ị pụkwara ịrụ ya ugboro ole ị chọrọ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịsụ ụzọ inyeaka n’akwụsịghị akwụsị ma ị pụghị ime otú ahụ, ì chewo echiche itinye akwụkwọ n’ọnwa n’ọnwa n’ime afọ? N’aka nke ọzọ, ụfọdụ nwere ike ije ozi n’akwụsịghị akwụsị dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka maka ogologo oge a gbatịrị agbatị.
16 Nkwadebe Maka Ịsụ Ụzọ Oge Nile: Ọtụtụ ndị nwere mmụọ ọsụ ụzọ ga-achọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, ma ha na-eche ma hà nwere oge, ọnọdụ, ma ọ bụ ikike maka ya. Obi abụọ adịghị ya na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-asụ ụzọ oge nile ugbu a buru ụzọ jiri ọsụ ụzọ inyeaka mee nkwadebe maka ọrụ oge nile. Site na mmadụ iji otu hour kwa ụbọchị mụbaa usoro ihe omume ọsụ ụzọ inyeaka ya, ma ọ bụ otu ụbọchị zuru ezu kwa izu, ọ ga-ekwe omume imezu usoro ihe omume onye ọsụ ụzọ oge nile. Iji lee ma nke ahụ ọ ga-ekwe gị omume, gịnị ma ị gbalịa itinye hour 90 n’ozi n’ime otu ọnwa ma ọ bụ karịa nke ịsụ ụzọ inyeaka? N’otu oge ahụ, ị ga na-enweta nletaghachi na ọmụmụ Bible, nke ga-enye gị ohere inwe ozi ọsụ ụzọ zuru ezu.
17 Otu nwanna nwanyị rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka ruo afọ isii akwụsịghị akwụsị. N’oge ahụ nile ọ bụ ihe mgbaru ọsọ ya ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile. Iji mezuo nke ahụ, ọ nwalere ọrụ ego anọ dị iche iche n’olileanya nke inweta ọnọdụ nke ga-eme ka o nwee ike itinye hour 90 a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Kwa ọnwa, o depụtara otu usoro ihe omume ma ọ bụ abụọ iji wee gbakọọ ma ọ̀ ga-ekwe omume. Ma mgbe o nyochara ha, o chere na o nweghị ike ije ozi oge nile. Ma, ọ nọgidere na-arịọ Jehova maka nduzi ya. Mgbe ahụ, otu ụbọchị mgbe ọ na-akwadebe maka Nzukọ Ije Ozi, ọ gụrụ otu isiokwu dị n’Ozi Alaeze Anyị nke December 1991 nke kwuru, sị: “Kama ịtụkwasị uche karị n’ụzọ na-ezighị ezi na hour ole a chọrọ, gịnị mere ị tụkwasịghị uche n’ohere e mere ka ọ bawanye ụba nke ikere òkè n’ọrụ nchịkọbata ahụ? (Jọn 4:35, 36)” Ọ na-akọ, sị: “Agụghachiri m ahịrịokwu a ugboro ise ma ọ bụ isii, ejikwa m n’aka na nke a bụ azịza sitere n’aka Jehova. Ozugbo ahụ emere m mkpebi ịbanye ozi ọsụ ụzọ oge nile.” Ọ bụ ezie na usoro ihe omume ọrụ ego ya nke nwa oge abụchaghị nke kasị mma, o tinyere akwụkwọ ya iji sụọ ụzọ oge nile. Otu izu ka e mesịrị usoro ihe omume ya gbanwere, e nyekwara ya hour ịrụ ọrụ ego nke kwesịrị ya nnọọ. O kwubiri, sị: “Nke a ọ̀ bụ aka Jehova, ka ọ́ bụghị?,” na-ekwukwa, sị: “Mgbe ị rịọrọ Jehova maka nduzi, nwetakwa ya, ajụla ya—nakwere ya.” Ọ bụrụ na ọ bụ ọchịchọ gị sitere n’obi ịsụ ụzọ oge nile, ikekwe ná ngwụsị nke ọnwa atọ nke ịsụ ụzọ inyeaka na March, April, na May nke a, ọ ga-edo gị anya na gị onwe gị kwa pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ozi oge nile ahụ.
18 Anyị ji n’aka na Jehova ga-agọzi ịnụ ọkụ n’obi ahụ, kwadokwa mgbalị nke ndị ya ka ha na-akpọsa ozi ọma nke nzọpụta n’ime oge a pụrụ iche nke ọrụ. (Aịsa. 52:7; Rom 10:15) Ị̀ ga-aza òkù ahụ maka ndị ọsụ ụzọ inyeaka 30,000 site n’ikere òkè na March? April? May?
Igbe dị na peeji nke 3]
Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma Dị Ka Ọsụ Ụzọ Inyeaka
■ Nwee echiche dị mma banyere atụmanya gị
■ Kpegara Jehova ekpere ịgọzi mgbalị gị
■ Kpọọ onye nkwusa ọzọ iso gị sụọ ụzọ
■ Hazie usoro ihe omume ije ozi dị irè
■ Tụọ ọda inweta magazin zuru ezu
■ Kwadoo ndokwa ọgbakọ maka ije ozi
■ Chọọ ohere maka ịgba àmà mberede