Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1999
Ntụziaka
N’ime afọ 1999, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Teta! [g-IB], Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ [uw-IB], Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ [fy-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu [td-IB (mbipụta nke 1998)] ga-abụ ebe ndị a ga-esi na-enye ihe omume.
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata wee malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, e wee gaa n’ihu n’usoro a:
IHE OMUME NKE 1: minit 15. Onye kwesịrị ime nke a bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche, Teta!, ma ọ bụ n’Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ. Mgbe ọ dabeere n’Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!, e kwesịrị ime ihe omume a dị ka okwu izi ihe ga-ewe minit 15 n’enweghị ajụjụ ọnụ; mgbe ọ dabeere n’akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe, e kwesịrị ikwu ya dị ka okwu izi ihe ga-ewe minit 10 ruo 12 nke ajụjụ ọnụ ga-ewe minit 3 ruo 5 ga-esochi, na-eji ajụjụ ndị e biri ebi dị n’akwụkwọ ahụ eme ihe. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe mmụta ahụ kama ilekwasị anya n’abamuru nke ihe ọmụma ahụ a na-atụle, na-eme ka ihe ga-akasị nyere ọgbakọ aka pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe.
Ụmụnna e kenyere okwu a kwesịrị ilezi anya ka ha ghara ịgabiga oge e nyere. Ọ bụrụ na e nyere ha ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha, e kwesịrị idenye ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ ndụmọdụ okwu ha.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: minit 6. Onye ga-eme nke a kwesịrị ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, bụ́ onye ga-atụle isiokwu ahụ n’ụzọ dị irè n’ikwekọ ná mkpa ọgbakọ. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ọgụgụ ahụ e kenyere ka a gụọ. A pụrụ ịgụnye ntụleghachi nke isiakwụkwọ Bible nile e kenyere bụ́ nke ga-ewe sekọnd 30 ruo 60. Otú ọ dị, nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere na ụzọ ihe ọmụma ahụ si baara anyị uru. Mgbe ahụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwa ndị mmụta ka ha gaa na klas ha dị iche iche.
IHE OMUME NKE 2: minit 5. Nke a bụ ọgụgụ Bible nke ebe e kenyere ka a gụọ, nke nwanna nwoke ga-agụ. Otú a ka ọ ga-adị n’ụlọ akwụkwọ nke mbụ na n’ìgwè ndị ọzọkwa. Ọgụgụ ihe ahụ na-adịkarị nkenke iji nye ndị mmụta ahụ ohere ikwu okwu nkọwa dị mkpirikpi ná mmalite na ná mmechi okwu ha. A pụrụ ịgụnye ihe ọmụma akụkọ ihe mere eme, nghọta nke okwu amụma ma ọ bụ ozizi, na ụzọ a pụrụ isi jiri ụkpụrụ mee ihe. E kwesịrị ịgụ amaokwu nile ahụ e kenyere n’enweghị nkwụsịtụ. Otú ọ dị, mgbe amaokwu ndị a gaje ịgụ na-adịghị n’usoro, onye mmụta ahụ pụrụ ịkpọ amaokwu ebe ọgụgụ ihe ahụ gafere.
IHE OMUME NKE 3: minit 5. A ga-ekenye nwanna nwanyị nke a. Isiokwu nke okwu a ga-adabere n’Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu. Ọnọdụ okwu ahụ pụrụ ịbụ ịgba àmà mberede, nletaghachi, ọmụmụ Bible ebe obibi, ma ọ bụ akụkụ ọzọ nke ozi ubi. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịgụnye onye mụrụ nwa iso nwa na-etorubeghị ogo mmadụ na-ekerịta ihe ọmụma. Ndị na-eme ya nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ iguzo ọtọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta ahụ si enyere onye nwe ụlọ ma ọ bụ nwatakịrị aka ịtụgharị uche n’isiokwu ahụ na ịghọta ụzọ e si jiri akụkụ akwukwọ nsọ ndị ahụ mee ihe. Onye mmụta e kenyere ihe omume a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye otu onye inyeaka, ma a pụrụ iji onye inyeaka ọzọ mee ihe. Onye mmụta ahụ pụrụ ikpebi ma onye nwe ụlọ ọ̀ ga-agụ paragraf ụfọdụ mgbe a na-atụle akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ọ bụghị ọnọdụ okwu ahụ kama iji ihe mmụta ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè bụ ihe e kwesịrị iwere n’ihe kasị mkpa.
IHE OMUME NKE 4: minit 5. Mgbe ihe omume a dabeere n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu, a ga-ekenye ya nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị. Mgbe ọ dabeere n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, a ga-ekenye ya nwanna nwoke. E depụtara isiokwu maka ihe omume nke ọ bụla n’usoro ihe omume a. Mgbe e kenyere ya nwanna nwoke, a ga-ekwu okwu a na-eburu n’uche ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe e kenyere nwanna nwanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3.
*USORO ỌGỤGỤ BIBLE NTỤKWASỊ: E tinyere nke a n’ime akara ngebichi na-eso abụ a ga-eji mee ihe maka izu ọ bụla. Site n’ịgbaso usoro a, na-agụ ihe dị ka peji iri n’otu izu, a pụrụ ịgụcha Bible dum n’afọ atọ. Ọ dịghị akụkụ dị n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ntụleghachi odide nke dabeere n’usoro ihe ọgụgụ ntụkwasị ahụ.
RỊBA AMA: Iji nwetakwuo ihe ọmụma na ntụziaka banyere ndụmọdụ, idebe oge, ntụleghachi odide, na nkwadebe nke ihe omume, biko lee peji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996.
USORO IHE OMUME
Jan. 4 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 16-18
Abụ nke 23 [*2 Ndị Eze 16-19]
Nke 1: Otú Chineke Si Duzie Odide Bible (w97-IB 6/15 p. 4-8)
Nke 2: Mkpughe 16:1-16
Nke 3: Chebe Nwa Gị Pụọ ná Mmerụ Ahụ (fy-IB p. 61-63 para. 24-28)
Nke 4: td-IB 27B A Na-akpọ Ike Ndụ Mmadụ na nke Anụmanụ Mmụọ
Jan. 11 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 19-22
Abụ nke 126 [*2 Ndị Eze 20-25]
Nke 1: w91-IB 5/1 p. 22 para. 5–p. 23
Nke 2: Mkpughe 22:1-15
Nke 3: Ndị Mụrụ Ụmụ—Meenụ Ka Ụzọ Nkwurịta Okwu Ghere Oghe (fy-IB p. 64-66 para. 1-7)
No. 4: td-IB 27Ch Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Ji Na-ajụ Ụdị Nile nke Mgbaasị
Jan. 18 Ọgụgụ Bible: Jenesis 1-3
Abụ nke 84 [*1 Ihe E Mere 1-6]
No. 1: w83-IB 7/15 p. 24–p. 25 para. 3
No. 2: Jenesis 1:1-13
Nke 3: Kụziere Ụmụaka Ụkpụrụ Omume Ọma na Iji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe (fy-IB p. 67-70 para. 8-14)
Nke 4: td-IB 5A Jehova Bụ Chineke Anyị, Jehova Bụ Otu
Jan. 25 Ọgụgụ Bible: Jenesis 4-6
Abụ nke 66 [*1 Ihe E Mere 7-13]
Nke 1: Kpachara Anya Banyere Ịkọwahie Ebumnobi (w97-IB 5/15 p. 26-29)
Nke 2: Jenesis 4:1-16
Nke 3: Ihe Mere Ịdọ Aka ná Ntị na Nkwanye Ùgwù Ji Dị Oké Mkpa (fy-IB p. 71-72 para. 15-18)
Nke 4: td-IB 5B Nna Dị Ukwuu Karịa Ọkpara Ya
Feb. 1 Ọgụgụ Bible: Jenesis 7-9
Abụ nke 108 [*1 Ihe E Mere 14-21]
Nke 1: Akụkọ Bible Banyere Iju Mmiri ahụ Bụ Eziokwu (g97-IB 2/8 p. 24-25)
Nke 2: Jenesis 7:1-16
Nke 3: Kụziere Ụmụaka Inwe Echiche Chineke Banyere Ọrụ na Egwuregwu (fy-IB p. 72-75 para. 19-25)
Nke 4: td-IB 5Ch Otú Chineke na Kraịst Si Bụrụ Otu
Feb. 8 Ọgụgụ Bible: Jenesis 10-12
Abụ nke 132 [*1 Ihe E Mere 22-29]
Nke 1: Eziokwu Banyere Ịgha Ụgha (g97-IB 3/8 p. 11-13)
Nke 2: Jenesis 12:1-20
Nke 3: Nnupụisi Ụmụaka na Ihe Ndị Na-akpata Ya (fy-IB p. 76-79 para. 1-8)
Nke 4: td-IB 5D Mmụọ Nsọ Bụ Ike Ọrụ Chineke
Feb. 15 Ọgụgụ Bible: Jenesis 13-15
Abụ nke 49 [*2 Ihe E Mere 1-8]
Nke 1: Adịghị Ike Mmadụ Na-ebuli Ike Jehova Elu (w97-IB 6/1 p. 24-27)
Nke 2: Jenesis 14:8-20
Nke 3: td-IB 1A Ọ Bụghị Jehova Kpatara Nsogbu Ụwa
Nke 4: Anabatala Ihe Ọ Bụla Ma Ọ Bụ Gbochibiga Ókè (fy-IB p. 80-81 para. 9-13)
Feb. 22 Ọgụgụ Bible: Jenesis 16-19
Abụ nke 188 [*2 Ihe E Mere 9-17]
Nke 1: Ihe Ekpere Gị Na-ekpughe (w97-IB 7/1 p. 27-30)
Nke 2: Jenesis 18:1-15
Nke 3: Igbo Mkpa Ndị Bụ́ Isi nke Nwatakịrị Pụrụ Igbochi Nnupụisi (fy-IB p. 82-84 para. 14-18)
Nke 4: td-IB 1B Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Ajọ Omume Dịrị
Mar. 1 Ọgụgụ Bible: Jenesis 20-23
Abụ nke 54 [*2 Ihe E Mere 18-24]
Nke 1: Ụzọ Isi Zụọ Akọ na Uche Gị (w97-IB 8/1 p. 4-6)
Nke 2: Jenesis 23:1-13
Nke 3: td-IB 1Ch Rite Uru Site n’Ebere Chineke
Nke 4: Ụzọ Isi Nyere Nwatakịrị Mere Ihe Ọjọọ Aka (fy-IB p. 85-87 para. 19-23)
Mar. 8 Ọgụgụ Bible: Jenesis 24-25
Abụ nke 121 [*2 Ihe E Mere 25-31]
Nke 1: Pụọ na Gịnị Ka Eziokwu ahụ Na-eme Ka Anyị Nwere Onwe Anyị? (w97-IB 2/1 p. 4-7)
Nke 2: Jenesis 24:1-4, 10-21
Nke 3: td-IB 1D Alaeze Chineke Agwụla Olileanya Mmadụ Nwere
Nke 4: Ịhụ Maka Onye Nnupụisi Kpọrọ Ekwo Nkụ (fy-IB p. 87-89 para. 24-27)
Mar. 15 Ọgụgụ Bible: Jenesis 26-28
Abụ nke 197 [*2 Ihe E Mere 32-36]
Nke 1: Ọnọdụ Egwú n’Ofufe nke Oge A (w97-IB 2/1 p. 24-28)
Nke 2: Jenesis 26:1-14
Nke 3: Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi (fy-IB p. 90-92 para. 1-7)
Nke 4: td-IB 18A Ezi Onye Kraịst Ọ Bụla Aghaghị Ịbụ Onyeàmà
Mar. 22 Ọgụgụ Bible: Jenesis 29-31
Abụ nke 4 [*Ezra 1-7]
Nke 1: Ụwa Agaghị Agwụsị n’Ọkụ (g97-IB 1/8 p. 28-29)
Nke 2: Jenesis 31:1-18
Nke 3: td-IB 18B Nọgide Na-agbasi Àmà Ike
Nke 4: Echiche Chineke Banyere Mmekọahụ (fy-IB p. 92-95 para. 8-13)
Mar. 29 Ọgụgụ Bible: Jenesis 32-35
Abụ nke 143 [*Ezra 8–Nehemaịa 4]
Nke 1: Ọgwụgwọ Ọrụ Ebube Site n’Aka Chineke—Olee Mgbe? (w97-IB 7/1 p. 4-7)
Nke 2: Jenesis 35:1-15
Nke 3: Nyere Ụmụ Gị Aka Ịhọrọ Ezi Ndị Enyi (fy-IB p. 95-97 para. 14-18)
Nke 4: td-IB 18Ch Dị Ọcha Pụọ n’Ọbara Mmadụ Nile
Apr. 5 Ọgụgụ Bible: Jenesis 36-38
Abụ nke 106 [*Nehemaịa 5-11]
Nke 1: Nzọpụta—Ihe Ọ Pụtara n’Ezie (w97-IB 8/15 p. 4-7)
Nke 2: Jenesis 38:6-19, 24-26
Nke 3: td-IB 15A Ihe Mere Chineke Ji Kagbuo Ife Ndị Nna Ochie Ofufe
Nke 4: Ịhọrọ Ntụrụndụ Ezinụlọ Dị Mma (fy-IB p. 98-102 para. 19-27)
Apr. 12 Ọgụgụ Bible: Jenesis 39-41
Abụ nke 34 [*Nehemaịa 12–Esta 5]
Nke 1: Gịnị Mere A Ga-eji Gbaa Àmà Ihe Ọjọọ? (w97-IB 8/15 p. 26-29)
Nke 2: Jenesis 40:1-15
Nke 3: Nghọta Akwụkwọ Nsọ Maka Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna (fy-IB p. 103-105 para. 1-8)
Nke 4: td-IB 15B Nanị Jehova Ka A Ga-efe Ofufe
Apr. 19 Ọgụgụ Bible: Jenesis 42-44
Nke 1: Ihe Mere A Na-aghaghị Iji Chịkwaa Iwe (g97-IB 6/8 p. 22-23)
Nke 2: Jenesis 42:1-17
Nke 3: Ihe Ịma Aka nke Ịkpata Ihe E Ji Ebi Ndụ Dị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ (fy-IB p. 105-107 para. 9-12)
Nke 4: td-IB 4A Amagedọn Bụ Agha Chineke Iji Kwụsị Ajọ Omume
Apr. 26 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Mkpughe 16–Jenesis 44
Abụ nke 18 [*Job 6-14]
May 3 Ọgụgụ Bible: Jenesis 45-47
Abụ nke 90 [*Job 15-23]
Nke 1: Ememe Owuwe Ihe Ubi Hà Na-amasị Chineke? (w97-IB 9/15 p. 8-9)
Nke 2: Jenesis 45:16–46:4
Nke 3: Ịnọgide Na-adọ Aka ná Ntị n’Ezinụlọ E Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna (fy-IB p. 108-110 para. 13-17)
Nke 4: td-IB 4B Amagedọn Agaghị Abụ Mmebi nke Ịhụnanya Chineke
May 10 Ọgụgụ Bible: Jenesis 48-50
Abụ nke 76 [*Job 24-33]
Nke 1: w83-IB 7/15 p. 26 para. 1–p. 27
Nke 2: Jenesis 49:13-28
Nke 3: Imeri n’Ọgụ Megide Owu Ọmụma (fy-IB p. 110-113 para. 18-22)
Nke 4: td-IB 6A Baptism Bụ Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Kraịst
May 17 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 1-4
Abụ nke 2 [*Job 34-42]
Nke 1: w83-IB 11/15 p. 24–p. 25 para. 6
Nke 2: Ọpụpụ 4:1-17
Nke 3: td-IB 6B Baptism Adịghị Asachapụ Mmehie
Nke 4: Ụzọ Isi Nye Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nkwado (fy-IB p. 113-115 para. 23-27)
May 24 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 5-8
Abụ nke 42 [*Abụ Ọma 1-17]
Nke 1: Ịda Ogbenye ma Baa Ọgaranya—Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Mee? (w97-IB 9/15 p. 3-7)
Nke 2: Ọpụpụ 7:1-13
Nke 3: td-IB 7A Bible Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke
Nke 4: Uru nke Iji Àgwà Nsọpụrụ Chineke Chee Ọrịa Ihu (fy-IB p. 116-119 para. 1-9)
May 31 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 9-12
Abụ nke 24 [*Abụ Ọma 18-28]
Nke 1: Ihe Esiteghị n’Ụwa Pụtara (g97-IB 9/8 p. 22-23)
Nke 2: Ọpụpụ 12:21-36
Nke 3: Abamuru nke Mmụọ nke Ọgwụgwọ (fy-IB p. 120-121 para. 10-13)
Nke 4: td-IB 7B Bible Bara Uru Maka Ụbọchị Anyị
June 7 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 13-16
Abụ nke 58 [*Abụ Ọma 29-38]
Nke 1: Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ (w97-IB 5/15 p. 22-25)
Nke 2: Ọpụpụ 15:1-13
Nke 3: Hazie Ihe n’Usoro Ịdị Mkpa ma Nyere Ụmụaka Aka Ịnagide Ọrịa n’Ime Ezinụlọ (fy-IB p. 122-123 para. 14-18)
Nke 4: td-IB 7Ch Bible Bụ Akwụkwọ Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ
June 14 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 17-20
Abụ nke 115 [*Abụ Ọma 39-50]
Nke 1: Otú Ndị Kraịst Si Asọpụrụ Ndị Nne na Nna Meworo Agadi (w97-IB 9/1 p. 4-7)
Nke 2: Ọpụpụ 17:1-13
Nke 3: td-IB 38A Ihe Mere Ndị Kraịst Na-aghaghị Iji Zere Ọbara
Nke 4: Ụzọ Isi Lee Iji Ọgwụ Agwọ Ọrịa Anya (fy-IB p. 124-127 para. 19-23)
June 21 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 21-24
Abụ nke 5 [*Abụ Ọma 51-65]
Nke 1: Ezi Sayensị na Bible Na-ekwekọ (g97-IB 7/8 p. 22-23)
Nke 2: Ọpụpụ 21:1-15
Nke 3: Olee Otú Nwunye Kwere Ekwe Pụrụ Isi Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Kewara Ekewa? (fy-IB p. 128-132 para. 1-9)
Nke 4: td-IB 38B Nrubeisi Nye Chineke Na-ebute Ụzọ Nye Ndị Kraịst
June 28 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 25-28
Abụ nke 47 [*Abụ Ọma 66-74]
Nke 1: Mara Jehova, Chineke Bụ́ Onye (w97-IB 10/1 p. 4-8)
Nke 2: Ọpụpụ 25:17-30
Nke 3: td-IB 40A Oge Ndị Jentaịl Gwụsịrị na 1914
Nke 4: Olee Otú Di Kwere Ekwe Pụrụ Isi Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Kewara Ekewa? (fy-IB p. 132-133 para. 10-11)
July 5 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 29-32
Abụ nke 174 [*Abụ Ọma 75-85]
Nke 1: Ekwela Ka Mmụọ nke Ụwa Mee Gị Nsí (w97-IB 10/1 p. 25-29)
Nke 2: Ọpụpụ 29:1-14
Nke 3: Inye Ụmụaka Ọzụzụ Akwụkwọ Nsọ n’Ezinụlọ Kewara Ekewa (fy-IB p. 133-134 para. 12-15)
Nke 4: td-IB 8A Ezi Chọọchị Kraịst
July 12 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 33-36
Abụ nke 214 [*Abụ Ọma 86-97]
Nke 1: Kwesị Ntụkwasị Obi ma Jigide Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Gị (w97-IB 5/1 p. 4-7)
Nke 2: Ọpụpụ 34:17-28
Nke 3: Ịnọgide Soro Ndị Nne na Nna Nwere Okpukpe Dị Iche Na-emekọrịta Ihe n’Udo (fy-IB p. 134-136 para. 16-19)
Nke 4: td-IB 8B E Wukwasịrị Chọọchị Ndị Kraịst n’Elu Kraịst
July 19 Ọgụgụ Bible: Ọpụpụ 37-40
Abụ nke 38 [*Abụ Ọma 98-106]
Nke 1: w83-IB 11/15 p. 25 para. 7–p. 27
Nke 2: Ọpụpụ 40:1-16
Nke 3: Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne Ma Ọ Bụ Nna Nkuchi (fy-IB p. 136-139 para. 20-25)
Nke 4: td-IB 35A Ezi Sayensị na Okike Na-ekwekọ
July 26 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 1-4
Abụ nke 26 [*Abụ Ọma 107-118]
Nke 1: w84-IB 2/15 p. 27-28
Nke 2: Levitikọs 2:1-13
Nke 3: Ekwela Ka Nchụso Ihe Onwunwe Kewaa Ezinụlọ Gị (fy-IB p. 140-141 para. 26-28)
Nke 4: td-IB 35B Ụbọchị Okike Ndị ahụ Hà Dị Hour 24 n’Ogologo?
Aug. 2 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 5-7
Abụ nke 9 [*Abụ Ọma 119-125]
Nke 1: Isi Ihe Na-eweta Ezi Obi Ụtọ (w97-IB 10/15 p. 5-7)
Nke 2: Levitikọs 6:1-13
Nke 3: Mmetụta Ndị Na-eweta Mbibi Aṅụrụma Na-akpata (fy-IB p. 142-143 para. 1-4)
Nke 4: td-IB 34A Jisọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?
Aug. 9 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 8-10
Abụ nke 210 [*Abụ Ọma 126-143]
Nke 1: Ịghọta Ụkpụrụ Ya Na-egosi Ntozu Okè (w97-IB 10/15 p. 28-30)
Nke 2: Levitikọs 10:12-20
Nke 3: Inyere Onye Òtù Ezinụlọ Bụ́ Onye Aṅụrụma Aka (fy-IB p. 143-146 para. 5-13)
Nke 4: td-IB 34B Ihe Mere na Chineke Anabataghị Iji Obe Na-efe Ofufe
Aug. 16 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 11-13
Abụ nke 80 [*Abụ Ọma 144–Ilu 5]
Nke 1: Kpachara Anya Maka “Ndị Epikurean” (w97-IB 11/1 p. 23-25)
Nke 2: Levitikọs 13:1-17
Nke 3: Ime Ihe Ike n’Ebe Obibi na Ụzọ Dị Iche Iche Isi Zere Ya (fy-IB p. 147-149 para. 14-22)
Nke 4: td-IB 41A N’ihi Gịnị Ka Ndị Mmadụ Ji Anwụ Anwụ?
Aug. 23 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 14-15
Abụ nke 137 [*Ilu 6-14]
Nke 1: Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ n’Ezie (w97-IB 4/1 p. 4-8)
Nke 2: Levitikọs 14:33-47
Nke 3: td-IB 41B Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ?
Nke 4: Nkewa Ọ̀ Bụ Ngwọta Ya? (fy-IB p. 150-152 para. 23-26)
Aug. 30 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Jenesis 45–Levitikọs 15
Abụ nke 145 [*Ilu 15-22]
Sept. 6 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 16-18
Abụ nke 222 [*Ilu 23-31]
Nke 1: Mgbe Ahụhụ Na-agaghị Adịkwa (w97-IB 2/15 p. 4-7)
Nke 2: Levitikọs 16:20-31
Nke 3: td-IB 41Ch Ihe Mere Iso Ndị Nwụrụ Anwụ Kwurịta Okwu Na-agaghị Eji Kwe Omume
Nke 4: Ụzọ Akwụkwọ Nsọ nke Isi Dozie Nsogbu Alụmdi na Nwunye (fy-IB p. 153-156 para. 1-9)
Sept. 13 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 19-21
Abụ nke 122 [*Eklisiastis 1-12]
Nke 1: Otú E Si Enweta Ezi Ịdị n’Otu Ndị Kraịst (uw-IB p. 5-7 para. 1-7)
Nke 2: Levitikọs 19:16-18, 26-37
Nke 3: td-IB 10A Ònye Bụ Ekwensu, Ebeekwa Ka O Si Bịa?
Nke 4: Ịkwụ Ụgwọ Alụmdi na Nwunye (fy-IB p. 156-158 para. 10-13)
Sept. 20 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 22-24
Abụ nke 8 [*Abụ nke Abụ 1–Aịsaịa 5]
Nke 1: Ime Mkpesa Nile Hà Dị Njọ? (w97-IB 12/1 p. 29-31)
Nke 2: Levitikọs 23:15-25
Nke 3: td-IB 10B Ekwensu Bụ Onye A Na-adịghị Ahụ Anya Na-achị Ụwa
Nke 4: Ihe Ndabere Bible Maka Ịgba Alụkwaghịm (fy-IB p. 158-159 para. 14-16)
Sept. 27 Ọgụgụ Bible: Levitikọs 25-27
Abụ nke 120 [*Aịsaịa 6-14]
Nke 1: w84-IB 2/15 p. 29-30
Nke 2: Levitikọs 25:13-28
Nke 3: td-IB 10Ch Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
Nke 4: Ihe Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere Nkewa (fy-IB p. 160-162 para. 17-22)
Oct. 4 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 1-3
Abụ nke 30 [*Aịsaịa 15-25]
Nke 1: w84-IB 4/15 p. 28–p. 30 para. 3
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 1:44-54
Nke 3: Imekọ Agadi Ọnụ (fy-IB p. 163-165 para. 1-9)
Nke 4: td-IB 44A Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
Oct. 11 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 4-6
Abụ nke 97 [*Aịsaịa 26-33]
Nke 1: Jehova Ji Ọmịiko Na-achị (w97-IB 12/15 p. 28-29)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 4:17-33
Nke 3: Imesiwanye Ihe Nkekọ Alụmdi na Nwunye Ike (fy-IB p. 166-167 para. 10-13)
Nke 4: td-IB 44B A Gaghị Ebibi Ụwa Ma Ọlị
Oct. 18 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 7-9
Abụ nke 96 [*Aịsaịa 34-41]
Nke 1: Ebe A Pụrụ Inweta Ezi Obi Ụtọ (w97-IB 3/15 p. 23)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 9:1-14
Nke 3: Nwee Ọṅụ n’Ụmụ Ụmụ Gị ma Mee Nhazigharị Ka Ị Na-aka Nká (fy-IB p. 168-170 para. 14-19)
Nke 4: td-IB 29A Ndị Amụma Ụgha Abụghị Ihe Ọhụrụ
Oct. 25 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 10-12
Abụ nke 125 [*Aịsaịa 42-49]
Nke 1: Jehova Na-eche Banyere Ndị Nọ ná Mkpagbu (w97-IB 4/15 p. 4-7)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 10:11-13, 29-36
Nke 3: Ịnagide Ọnwụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị (fy-IB p. 170-172 para. 20-25)
Nke 4: td-IB 19A Ihe Mere Ọgwụgwọ Ime Mmụọ Ji Dị Oké Mkpa
Nov. 1 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 13-15
Abụ nke 64 [*Aịsaịa 50-58]
Nke 1: Ihe Mere Ọrụ Ebube Nanị Adịghị Ewulite Okwukwe (w97-IB 3/15 p. 4-7)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 14:13-25
Nke 3: td-IB 19B Alaeze Chineke Ga-eweta Ọgwụgwọ Anụ Ahụ Na-adịgide Adịgide
Nke 4: Ụzọ Ndị Kraịst Si Asọpụrụ Ndị Nne na Nna Meworo Agadi (fy-IB p. 173-175 para. 1-5)
Nov. 8 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 16-19
Abụ nke 78 [*Aịsaịa 59-66]
Nke 1: Ihe Mere na Ịda Ogbenye Adịghị Eme Ka Izu Ohi Zie Ezie (g97-IB 11/8 p. 26-27)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 18:1-14
Nke 3: Gosi Ịhụnanya na Ọmịiko (fy-IB p. 175-178 para. 6-14)
Nke 4: td-IB 19Ch Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa n’Oge A Esiteghị n’Aka Jehova
Nov. 15 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 20-22
Abụ nke 46 [*Jeremaịa 1-6]
Nke 1: Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Mbụ (w97-IB 8/15 p. 8-11)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 20:14-26
Nke 3: Na-elegara Jehova Anya Mgbe Nile Maka Ume (fy-IB p. 179-182 para. 15-21)
Nke 4: td-IB 19D Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Bụ Ndokwa Nwa Oge
Nov. 22 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 23-26
Abụ nke 59 [*Jeremaịa 7-13]
Nke 1: Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Abụọ (w97-IB 9/15 p. 25-29)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 23:1-12
Nke 3: Zụlite Nsọpụrụ Chineke na Njide Onwe Onye (fy-IB p. 183-184 para. 1-5)
Nke 4: td-IB 11A Nanị 144,000 Ga-aga Eluigwe
Nov. 29 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 27-30
Abụ nke 180 [*Jeremaịa 14-21]
Nke 1: Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Atọ (w97-IB 10/15 p. 8-12)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 27:1-11
Nke 3: Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Isi Lee Ịbụisi Anya (fy-IB p. 185-186 para. 6-9)
Nke 4: td-IB 13A Hel Abụghị Ebe Iji Ọkụ Ata Ahụhụ
Dec. 6 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 31-32
Abụ nke 170 [*Jeremaịa 22-28]
Nke 1: Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A (w97-IB 12/15 p. 4-7)
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 31:13-24
Nke 3: Òkè Dị Mkpa Ịhụnanya Na-ekere n’Ezinụlọ (fy-IB p. 186-187 para. 10-12)
Nke 4: td-IB 13B Ọkụ Bụ Ihe Atụ nke Mbibi
Dec. 13 Ọgụgụ Bible: Ọnụ Ọgụgụ 33-36
Abụ nke 51 [*Jeremaịa 29-34]
Nke 1: w84-IB 4/15 p. 30 para. 4–p. 31
Nke 2: Ọnụ Ọgụgụ 36:1-13
Nke 3: td-IB 13Ch Akụkọ Ọgaranya na Lazarọs—Abụghị Ihe Àmà nke Ịta Ahụhụ Ebighị Ebi
Nke 4: Ime Uche Chineke Dị Ka Ezinụlọ (fy-IB p. 188-189 para. 13-15)
Dec. 20 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 1-3
Abụ nke 159 [*Jeremaịa 35-41]
Nke 1: w84-IB 8/15 p. 27–p. 28 para. 6
Nke 2: Deuterọnọmi 2:1-15
Nke 3: td-IB 42A Ndị Kraịst Oge Mbụ Edebeghị Ncheta Ọmụmụ Ma Ọ Bụ Krismas
Nke 4: Ezinụlọ na Ọdịnihu Gị (fy-IB p. 190-191 para. 16-18)
Dec. 27 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Levitikọs 16–Deuterọnọmi 3
Abụ nke 192 [*Jeremaịa 42-48]