Nzukọ Ije Ozi Maka June
Izu Na-amalite June 7
Abụ nke 45
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee “Nyere Ndị Ọzọ Aka Irite Uru Site na Broshuọ Bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?”
15 min: “Jehova Na-ezi Anyị Ihe.” Mee ka okwu mmeghe ghara ịgafe otu minit, jirizie ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ uru ụfọdụ ha riteworo n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, na ndị ọzọ. Mesie ike otú ha siworo nyere ndị Jehova aka ịdịkwu irè n’ozi.
20 min: “Jiri Oge Gị Mee Ihe n’Ụzọ Bara Uru.” Nkwurịta okwu nke onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ nweworo ahụmahụ ga-enwe bụ́ ndị ga-ekwu otú ha si eji oge ha eme ihe iji kere òkè zuru ezu dị ka o kwere mee n’ozi ubi. Ha akọwaa ịdị mkpa nke usoro ihe omume dị irè ma mesie mkpa nke inwe ya ike. Ha ekwuo otú ha si ezere ihe ndị na-egbu oge dị ka a maliteghị n’oge, e meghị atụmatụ dị mma tupu oge eruo, ma ọ bụ iso ndị ọzọ na-enwe mkpakọrịta gabigara ókè n’oge a na-eje ozi. Dị ka ọnọdụ ọgbakọ si dị, tụọ aro ndị dị irè n’otú a pụrụ isi jiri oge mee ihe n’ụzọ bara uru.
Abụ nke 48 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 14
Abụ nke 63
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ Ọchịchị Chineke. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere akwụkwọ Young People Ask ma ọ bụ Ịbụ Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ, gosi otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ụzọ dị irè n’ozi n’oge ezumike ụmụ akwụkwọ, mgbe o yikarịrị ka ànyị ga-ahụ ndị nọ n’afọ iri na ụma n’ụlọ.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Ị̀ Pụrụ Inye Aka?” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee nke onye okenye ga-ekwu. Gụnye aro ndị dị na Teta! nke October 8, 1995, peji nke 8-9, maka inyere ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ aka. Kpọọ ụfọdụ ndị òkù ikwupụta ekele ha maka enyemaka ịhụnanya ha nwetaworo site n’aka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ.
Abụ nke 53 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 21
Abụ nke 72
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
17 min: Jiri Vidio na Ihe Nkiri Ndị A Na-egere Egere Mee Ihe nke Ọma. À pụrụ iji vidio 10 na kaseti ihe nkiri 11 a na-egere egere Society mepụtara eme ihe n’ụzọ ka mma? Gị na ezinụlọ gị ùnu ekiriwo ma ọ bụ gee ha nile? Tụleghachi isiokwu dị iche iche, na-akọwapụta otú ha si eme ka anyị na-agụkwu Bible, na-ewusi ọnọdụ ime mmụọ anyị ike, ma na-agba àmà dị mma banyere eziokwu ahụ. Jụọ ndị na-ege ntị vidio ma ọ bụ ihe nkiri a na-egere egere ndị ha chọpụtaworo kasị dị irè n’ịgba ezinụlọ ha ume ma ọ bụ n’iduzi ndị ọhụrụ gaa ná nzukọ. Kọọ ahụmahụ ụfọdụ na-egosi ihe ọma ndị siworo na ya pụta. (Lee 1999 Yearbook, peji nke 51-52.) Gbaa mmadụ nile ume ijiri vidio na ihe nkiri ndị ahụ a na-egere egere na-eme ihe nke ọma.
18 min: “Ị̀ Na-ahụ Nanị Ọdịdị Elu Ahụ?” Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Mesie ike ihe ndị mere na anyị ekwesịghị ikpebi ngwa ngwa ụdị mmadụ ndị anyị na-ezute bụ. Tụleghachi ná mkpirikpi ihe Jehova kụziiri Jona, bụ́ onye nwere echiche na-ezighị ezi banyere ndị o chere na ha ekwesịghị imere ebere. (Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1997, peji nke 21-22, paragraf nke 17-19.) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu banyere ụdị ndị dịgasị iche ha zuteworo n’ókèala, na-ekwu otú ha si nọgide na-akpaso ha àgwà n’ụzọ dị mma ma na-ahapụrụ Jehova ikpe ikpe.
Abụ nke 77 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 28
Abụ nke 85
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka June. Tụlee akwụkwọ a ga-enyefe na July. Gosi akwụkwọ a ga-enyefe n’ókèala unu n’oge nnyefe akwụkwọ ahụ pụrụ iche, tụọkwa aro otu ihe ma ọ bụ abụọ anyị pụrụ ime ka ha pụta ìhè mgbe anyị na-eche ha n’ihu mmadụ. Gụnye otu ihe ngosi a mụgharịrị nke ọma.
13 min: N’ihi Gịnị Ka Jehova Ji Ekwe Ka A Kpagbuo Ndị Ya? Okwu onye okenye ga-ekwu, nke dabeere n’akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peji nke 676-677. Dị ka Jisọs buru n’amụma, ‘mba nile kpọrọ anyị asị.’ (Mat. 24:9) Anyị pụrụ inweta mmegide mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi, mgbe anyị na ndị ikwu anyị bụ́ ndị ụwa na-emekọrịta ihe, ma ọ bụ mgbe anyị so ndị na-abụghị Ndịàmà na-emekọrịta ihe n’ebe ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ụzọ dị mma, ọkà okwu akọwaa ihe mere Jehova ji ekwe ka mkpagbu ma ọ bụ mmegide dị otú ahụ dịrị na otú anyị ịtachi obi na ya ga-esi mesịa weta ngọzi.
20 min: Gaa n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ! Okwu dabeere na 1997 Yearbook, peji nke 42-48. Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị ịnọgide na-ekere òkè chiri anya n’ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-enwe atụmanya siri ike maka ohere ndị na-adapụta iji gbaa àmà mberede—mgbe ọ bụla, n’ebe ọ bụla. Kọọ ahụmahụ ndị dị na Yearbook na-egosi otú ndị ọzọ siworo nwee ihe ịga nke ọma n’ime otú ahụ mgbe ha nọ na bọs, mgbe ha ji ụkwụ na-aga n’okporo ámá ma ọ bụ n’ụsọ mmiri, mgbe ha gara n’ụgbọala ndị a dọbara adọba, mgbe ha na-aga n’ọdụ ụgbọala, na mgbe ha na-ede akwụkwọ ozi. Dị ka oge nyere ohere ya, kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ ahụmahụ ndị nke ha. Gbaa mmadụ nile ume iji ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa àmà n’ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ.
Abụ nke 75 na ekpere mmechi.