Ò Nwere Nzube I Ji Na-arụ Ọrụ?
1 Jehova bụ Chineke nke nzube. (Aịsa. 55:10, 11) A na-agba anyị ume iṅomi ya. (Efe. 5:1) E kwesịrị igosipụta nke a n’ezie n’ụzọ anyị si na-eje ozi anyị. Ya mere ajụjụ ahụ kwesịrị ekwesị: “Ò nwere nzube i ji na-arụ ọrụ?”
2 Gị ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ịgba àmà mberede, na ikesa akwụkwọ socha n’ozi nwere nzube. Ma cheta na ọrụ e nyere anyị gụnyere ọ bụghị nanị ime nkwusa kamakwa ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Mgbe anyị kụsịrị mkpụrụ nke eziokwu Alaeze, ọ dị anyị mkpa ịgaghachi iji kwọsa ha mmiri ma na-elekọta ha mgbe nile ka anyị na-elegara Jehova anya iweta mmụba. (1 Kọr. 3:6) Ọ dị mkpa ka anyị dị uchu n’ịga nletaghachi na ịmalite ọmụmụ Bible.
3 Mụbaa Ozi Gị: Ọ na-enye obi ụtọ mgbe nile mgbe i leghachiri anya azụ n’ihe ndị ị rụzuru n’ozi wee sị onwe gị: “Emezuru m ihe m zubere imezu.” Dị ka e dekọrọ na 2 Timoti 4:5, Pọl gbara ume, sị: “Jezuo ozi gị.” Nke ahụ na-agụnye itinyekwu mgbalị n’isochi mmasị nile a chọtara. N’usoro ije ozi gị kwa izu, kewapụta oge kpọmkwem maka ịga nletaghachi. Rụọ ọrụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ nke ịmalitere ndị nwere ọchịchọ ime ezi omume ọmụmụ Bible. Nke a kwesịrị ịbụ nzube gị mgbe ị na-ekere òkè n’ozi.
4 Jụọ ndị nkwusa otú ọ dị ha mgbe ha hụrụ ndị ha na-amụrụ Bible ka e mere ha baptism ná mgbakọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, ikekwe dị ka ndị ahụ e mere baptism. Ha emezuwo nzube dị ukwuu! Otu onye na-eme ndị na-eso ụzọ si otú a kwupụta ya: “Ime ndị na-eso ụzọ pụtara inwekwu ndị na-eto Jehova. Ọ pụtara ndụ nye ndị ahụ na-anabata eziokwu ahụ. Ahụrụ m nnọọ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ n’anya—ọ mara mma nke ukwuu! . . . Ọtụtụ ndị bịara hụ Jehova n’anya abụrụwo ndị enyi m hụrụ n’anya.”
5 Cheedị echiche inwe ike inyere mmadụ aka ịghọ ohu Jehova raara onwe ya nye! Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ! A na-arụpụta ihe dị otú ahụ site n’iji nzube rụọ ọrụ n’ozi.—Kọl. 4:17.