Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/99 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Nta
  • October 29-31, 1999
  • November 12-14, 1999
  • November 26-28, 1999
  • December 3-5, 1999
  • December 10-12, 1999
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 9/99 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na September: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi maka ₦55; nke azụ ya na-esighị ike, ₦50. October: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. December: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.

◼ Ị pụrụ izute onye ntị chiri mgbe ị nọ n’ozi. Ọ bụrụ na e nwere ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ nke ji asụsụ ndị ogbi na-eme ihe n’ógbè unu, i kwesịrị ịgbaso ntụzi ahụ e nyere n’Ozi Alaeze Anyị nke January 1998, peji nke 3. Ọ na-akọwa ụzọ isi jiri mpempe akwụkwọ Sign-Language Follow-up Slip na-edetu aha ndị mmadụ, bụ́ ndị ji asụsụ ogbi na-eme ihe ma hà nọ n’ókèala ọgbakọ unu ma ọ bụ na ha anọghị. N’ozuzu ya, e kwesịrị iji ya eme ihe maka nzube a ọ bụrụgodị na onye ahụ egosighị mmasị n’ozi Alaeze. Mgbe e dejupụtasịrị mpempe akwụkwọ Sign-Language Follow-up Slip ahụ, e kwesịrị inye ya odeakwụkwọ ọgbakọ kpọmkwem ma ọ bụ tinye ya n’igbe akụkọ ozi ubi dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na onye nkwusa ọ bụla amụrụ anya n’inye nkwado n’ụzọ dị otú a, ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè ndị ji asụsụ ndị ogbi na-eme ihe ga-enwe ike idekọta aha ndị ogbi nọ n’ógbè ha.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peji nke 21-23 nke Ụlọ Nche April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.

◼ Ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị izite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi nile maka Ụlọ Nche na Teta!, tinyere ụtụ nke ha site n’ọgbakọ.

◼ Society adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa ka a na-ama ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara Society ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.

◼ Mgbakọ Distrikti na nke Mba Nile nke “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998 bụụrụ ndị nile gara ha ngọzi n’ezie. Ndị ozi ala ọzọ na ndị ozi nke mba nile dị 2,764 so ná ndị gara ha, bụ́ ndị nwere ike gaa ala nna ha site n’enyemaka nke onyinye ọgbakọ dị iche iche ji mmesapụ aka nye. Anyị nwere ekele dị ukwuu maka nkwado e nyere ndokwa a. Ebe mgbakọ ndị a gasịworo, a ga-ejizi ego fọdụrụ n’ime onyinye e nyere maka nzube a kwadoo ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ.

◼ E mewo mgbanwe ndị na-esonụ ‘n’Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti na 1999’ nke pụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 1999. Biko onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ ọ bụla a gbanwere ebe ma ọ bụ ụbọchị ha ga-enwe mgbakọ kwesịrị ime ndokwa ka a maa ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ mgbe e nwetasịrị mbipụta Ozi Alaeze Anyị a.

October 29-31, 1999

UBOGO 1 (Bekee) ME-8; ME-18: A ruo O E WEZỤGA Emu Uno; ME-19: N ruo Z

November 12-14, 1999

ENUGU 1 (Bekee) EE-12: Ayangba, Ogugu, Otukpa, na Ubiadu; EE-17: Amanato, City Layout, Federal Housing, Hilltop, Ihe, Lakecity, Lakeside, Liberty, Odenigbo, na Trans Ekulu; EE-19: Mainland, Ndiagu, Onuasata, Real Estate, Station (Agbani), Uhueze, Umunevo, Urban, na Uwani

UBOGO 3 (Bekee) ME-6: A ruo B; ME-7: A ruo O; ME-9: Adjomo, Airport, Alegbo, Asheshe Layout, Bazunu Layout, na Enerhen; ME-10 E WEZỤGA Enede, Farm Settlement, Igwete, Ishimili, Ndemili, Ogbe Onishe, Olieogo, na Umuekum; ME-18: P ruo Z; ME-19: A ruo M

November 26-28, 1999

KATSINA ALA 2 (Bekee) EE-11A; EE-11C: A ruo G; EE-12: Adoka Iso., Aliade, Etutekpe, Eupi, Igedde Central, Igumale, Ito Igedde, North Bank, South Bank, Ugbokolo, na Ochi-Lagos; NE-6B: Jalingo

December 3-5, 1999

KATSINA ALA 3 (Bekee) EE-11B; EE-11C: H ruo Z; EE-12: Ọgbakọ ndị a na-ekenyeghị ịga Katsina Ala 2 E WEZỤGA Ayangba, Otukpa, na Ogugu

UYO 6 (Efịk) EF-10: Afaha Ikot Ede, Afaha Offiong, Edeobom, Efa Iman, Ekpene Ituen, Etinan, Ikot Abasi Iman, Ikot Ante, Ikot Atang Esen, Ikot Eba, na Ikot Edibon; EF-15: Esuk Oron, Eteku, Ewet, na Okpob

December 10-12, 1999

AGBOR 6 (Bekee) ME-10: Enede; ME-11A; ME-15: A ruo N; ME-17: U ruo Z; ME-18: Emu Uno

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! —Yoruba

The Guidance of God—Our Way to Paradise —Bekee

◼ Kaseti Ndị Ọhụrụ A Na-ege Ege E Nwere:

Families—Make Daily Bible Reading Your Way of Life! (Ihe nkiri, otu kaseti) —Bekee

Marked for Survival —Bekee

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya