Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/99 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka September

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka September
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 6
  • Izu Na-amalite September 13
  • Izu Na-amalite September 20
  • Izu Na-amalite September 27
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 9/99 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka September

Izu Na-amalite September 6

Abụ nke 190

7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

18 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Ezi Ihe Ọmụma.” Ajụjụ na azịza. Mesie ike abamuru nke inwe otu ihe gị na mmadụ ga-ekwekọrịta na ya. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ a kwadebere nke ọma nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Okwu Amụma nke Chineke’ nke 1999.” (Paragraf 1-9) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 6 na nke 8. Mesie ike ihe ndị mere anyị kwesịrị iji jezuo mgbakọ ahụ, gụnyere nnọkọ ndị nke Friday. Mesie ike mkpa ọ dị ịgbaso ntụziaka Society n’ibu nri ehihie nke gị na-abịa mgbakọ kwa ụbọchị.

Abụ nke 19 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 13

Abụ nke 171

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na ahụmahụ ndị e nwere n’ozi ubi.

15 min: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Gara Aga? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Tụleghachi ihe ndị pụtara ìhè sitere n’akụkọ ozi ọgbakọ maka afọ ije ozi 1999. Kwuo okwu ịja mma maka ihe ndị dị mma a rụzuru. Kọwapụta ebe ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka e meziwanye ihe. Lekwasị anya n’otú ọgbakọ si mee n’ịga nzukọ nakwa n’iduzi ọmụmụ Bible. Kpọsịsịa ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru maka afọ na-abịanụ.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Okwu Amụma nke Chineke’ nke 1999.” (Paragraf nke 10-21) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 15 na nke 16. Jiri akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara na ndị e zoro aka na ha mee ihe iji mesie ike ihe mere uwe, ejiji, na àgwà anyị ji bụrụ okwu ndị chọrọ ka anyị lebara ha anya nke ọma.

Abụ nke 29 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 20

Abụ nke 193

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: “Ndị Mụrụ Ụmụ—Setịpụrụnụ Ụmụ Unu Ezi Ihe Nlereanya.” Okwu mmalite dị nkenke nke onye okenye ga-ekwu, nke ihe ga-esochi ya bụ ntụle nke ụmụnna abụọ bụ́ ndị mụrụ ụmụ ga-atụle isiokwu ahụ. Ha ekwupụta nchegbu ha nwere banyere ichebe ụmụ ha pụọ n’àgwà ọjọọ ndị ha na-ahụ n’ụlọ akwụkwọ, na telivishọn, na n’ebe ndị ikwu na ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà nọ. Ụmụnna ahụ atụlee àgwà ndị na-adịghị egosi nkwanye ùgwù, okwu na ejiji ndị ụwa, na ntụrụndụ ndị na-adịghị mma. Mgbe ha tụgharịsịrị uche ná mkpa ọ dị isetịpụ ezi ihe nlereanya, ha ekwurịta ụzọ isi nwekwuo ịnụ ọkụ n’obi maka ọmụmụ ihe ezinụlọ, nzukọ ọgbakọ, na ozi ubi.—Lee Ụlọ Nche nke July 1, 1999, peji nke 8-22, na Teta! (Bekee) nke September 22, 1991, peji nke 8-9.

18 min: Ichebe Ezi Aha. Okwu onye okenye ga-ekwu. A na-enweta ezi aha site n’ime ọtụtụ obere ihe ruo ogologo oge. Anyị na-enwe aha ọma site n’ihe ndị anyị na-eme. N’aka nke ọzọ, otu ihie ụzọ pụrụ imebi aha anyị n’ụzọ dị ukwuu. Nanị ihe ọ na-ewe bụ ntakịrị ihe a sị na ọ bụ nzuzu—ikekwe otu iwe ọkụ, ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ otu omume mmekọahụ na-adịghị ọcha—iji mebie ezigbo aha. (Ekli. 10:1; Ilu 6:32; 14:17; 20:21) Ya mere, lee ka o si dị mkpa ka anyị na-agbalị inwe ezi aha na ịrụsi ọrụ ike ichebe ya.—Tụlee Mkpughe 3:5.

Abụ nke 175 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 27

Abụ nke 141

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa inye akụkọ ozi ubi ha maka September. Gbaa mmadụ nile ume ime atụmatụ iji kere òkè zuru ezu ná nkesa magazin n’October. Tụleghachi ụfọdụ n’ime aro ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke October 1996, peji nke 8, banyere ụzọ isi kwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. N’iji magazin ndị ọhụrụ eme ihe, kwuo isi ihe ụfọdụ dị mma a pụrụ iji kwuo okwu, meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ dị nkenke nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ.

15 min: Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu.

15 min: “Ò Nwere Nzube I Ji Na-arụ Ọrụ?” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Gụnye ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 88-89. Gbaa mmadụ nile ume ịgachi ozi anya na iwetu anya ala n’ozi ha.

Abụ nke 106 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya